Inec enyela Gọvanọ Soludo asambodo mmeri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra Steeti

Oge ndị ọrụ Inec nyere Gọvanọ Charles Soludo asambodo mmeri

Ebe foto si, INEC/X

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) enyela Gọvanọ Chukwma Soludo na osote ya bụ Onyekachukwu Ibezim asambodo mmeri na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na Anambra Steeti n'ụbọchị Satọde 8 Nọvemba, 2025.

Otu onye ji ọkwa National Commissioner hụrụ maka ntuliaka ahụ bụ Kenneth Ukeagu bụ onye nyere Gọvanọ Soludo asambodo ahụ n'Awka, isiobodo steeti ahụ.

Ukeagu kwuru na mmeri Gọvanọ Soludo na osote ya bụ nke wetere ihe niile banyere ntuliaka ahụ na njedebe.

Ọ gara n'ihu gwa Gọvanọ Soludo ka ọ hụta mmeri ya dịka ohere iji rụọrọ ndị Anambra steeti ọrụ ma weta ezi ọchịchị nye ọhanaeze.

Oge ndị ọrụ Inec nyere osote Gọvanọ Charles Soludo bụ Onyekachukwu Ibezim asambodo mmeri

Ebe foto si, INEC/X

Soludo egosila obiụtọ maka mmeri nke ugboro abụọ ya

Aka na-achị Anambra Steeti bụ Charles Chukwuma Soludo na nwunye ya bụ Nonye Soludo dịka ọ na-agwa ndị Anambra okwu nke mbụ ya dịka ụlọọrụ Inec kpọpụtara ya dịka onye mere na ntuliaka Gọvanọ Anambra emere na 8 Nọvamba 2025.

Aka na-achị Anambra Steeti bụ Charles Chukwuma Soludo ekwupụtala obiụtọ ya n'ihi mmeri o meriri na ntuliaka nke ọkwa Gọvanọ steeti ahụ mere na Satọde abalị asatọ nke ọnwa Nọvamba 2025.

O kwuru na ya nabatara mpụtara ntuliaka ahụ dịka o kelere ndị Anambra maka ịtụnyere ya vootu na ntuliaka ahụ.

"Ndị Anambra ekwuola okwu, unu enyeela anyị ikike ụnụ. Dịka ụnụ ntụnyere anyị vootu n'afọ anọ gara n'agbanyeghị na ọtụtụ mmadụ apụtaghị tụọ vootu na ntuliaka ahụ nke anyị nwetere naanị 112,000 vootu mana nke a, ụnụ kwuru okwu dara ụda site na vootu ụnụ tụrụ anyị," ka ọ kọwara.

O kwuru na nke a bụ nke ugboro atọ a na-ahọpụta gọvanọ nọ n'ọkwa ọzọ n'akụkọ ntuliaka ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Anambra kemgbe ọchịchị onyekwuouche ya laghachitere n'afọ 1999.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Soludo kwuru na ndị Anambra họpụtara gọvanọ na-achị ọzọ n'afọ 2010 site na inwete pasentị 31nke vootu a tụrụ, 2017 site na inwete 56 pasentị nke vootu a tụrụ ebe kwado ya nwetere pasentị 73 pasentị nke vootu a tụrụ n'afọ a bụ nke dasiri ụda ike.

O kelekwara Onyeisiala Bola Tinubu maka igosi ezi ọchịchị onyekwuouche ya site n'ịhụ na e nwere ntuliaka ziri ezi na nke a pụrụ ịtụkwasị obi na steeti ahụ.

Ọ gara n'ihu kelekwa onyeisi ọhụrụ nke ụlọọrụ Inec maka ọrụ ndị ụlọọrụ ahụ dịka o kwuru na ntuliaka Anambra steeti bụ nnukwu ọrụ mbụ nke Joash Amupitan na-arụ dịka onyeisi ụlọọrụ ahụ.

"Obi dị m ezigbo ụtọ na ihe mbụ gị dịka onyeisi ụlọọrụ Inec bụ nke siri ike nke ukwuu bụrụkwa nke e meziri emezi."

"Aghaghị m ikwu na kemgbe afọ 2017 mgbe m malitere isonye na ntuliaka Anambra, ọkachasị kemgbe e webatara teknụzụ, ntuliaka ọ bụla na-akawanye mma ọbụla."

Agbakwunyere , "Ọ dị mma ikwu na nke a bụ nke kacha mma ị haziri ruo ugbua n'Anambra."

O kwuru na ụlọọrụ Inec gbakwara mbọ ịhụ na ha tinyere ihe ruru pasentị 99 mpụtara ntuliaka ahụ n'ịntanetị n'ime abalị ụbọchị e mechara ntuliaka bụ nke mere ka onye ọbụla na-esonye na-ịmata mpụtara ntuliaka ahụ ozugbo.

Soludo gara n'ihu gwakwa ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ọzọ sonyere na-ịzọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka ahụ "ka onye ọbụla dịka ụmụnna, nabata ibe ya maka ịga n'ihu" nke steeti ahuụ.

"Ana m agba ndị ọzọ so zọọ ọkwa a ume, adị m njikere ịrụ ọrụ, ka anyị jikọọ aka ọnụ maka ọdịmma kacha mma nke ndi Anambra," ka o kwuru.

Dịka o kelekwara ndị ọrụ nchekwa maka ịhụ na ntuliaka ahụ gara nke ọma, Gọvanọ Soludo kwupụtakwara nwute banyere ọnwụ otu onye kansụl ndị omekome gburu n'Owerre Ezukala, okpuru ọchịchị Orumba South nke dị n'okeala Anambra na Imo Steeti.

"Anyị nụrụ na ndị omekome ahụ si n'okeala Imo na Anambra bata ma kpaa mkpa mkpa ahụ site na igbu onye kansụl tụchara vootu ya ma na-alakwa ụlọ ya," dịka gọvanọ siri kọwaa.

Charles Soludo enwetala mmeri nke ugboro abụọ dịka gọvanọ Anambra Steeti

Charles Soludo enwetala mmeri nke ugboro abụọ dịka gọvanọ Anambra Steeti

Ebe foto si, Charles Chukwuma Soludo/X

Aka na-achị Anambra Steeti bụ Charles Chukwuma Soludo enwetala mmeri nke ugboro abụọ ya dịka gọvanọ Anambra Steeti na ntuliaka nke ndị steeti ahụ mere n'abalị asatọ nke ọnwa Nọvamba 2025.

Mpụtara ntuliaka ahụ nke ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na steeti ahụ bụ Independent National Electoral Commission (Inec) kpọpụtara n'ụtụtụ Sọnde abalị itoolu nke ọnwa Nọvamba gosiri na Soludo jiri vootu ruru narị puku anọ na puku iri abụọ na abụọ na narị isii na iri isii na anọ (422,664) nwere merie ebe onye nke abụọ bụ Nicholas Ukachukwu ji ọkọlọtọ All Progressive Congress (APC) zọọ ọkwa gọvanọ nwetere vootu ruru puku iri itoolu na itoolu na narị anọ na iri anọ na ise (99,445).

Paul Chukwuma nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Young Progressives Party (YPP) sochiri dịka onye nke atọ na ntuliaka ahụ nwetere vootu ruru puku iri atọ na asaa na narị asaa na iri ise na atọ (37,753) ebe George Moghalu ji ọkọlọta Labour Party nwetere vootu ruru puku iri na narị ise na iri asaa na isii (10,576) bụ onye nke anọ.

John Nwosu nke African Democratic Congress (ADC) sochiri ya n'azụ dịka onye nke ise nwetara votu puku asatọ na narị abụọ na asatọ (8,208) dịka Jude Ezenwafor ji ọkọlọtọ Peoples Democratic Party zọọ ọkwa gọvanọ nwetere vootu ruru otu puku na narị anọ na otu (1,401).

Nke a pụtara na Gọvanọ Soludo ga-achịkwa Anambra Steeti dịka gọvanọ n'ime afọ anọ na-abịa abịa.

Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ogige ụlọ aka na-achị steeti ahụ dị n'obodo Isuofia nke okpuru ọchịchị Aguata ugbua na-enwe oke ọṅụ ma na-agụ egwu aṅụrị n'ihi mmeri nke ugboro abụọ Gọvanọ Charles Soludo meriri na ntuliaka ahụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ụlọ aka na-achị steeti na-enwe oke ọṅụ ma na-agụ egwu aṅụrị n'ihi mmeri nke ugboro abụọ Gọvanọ Charles Soludo meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ.

Anambra State Election Result: Lee etu mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra Steeti si kwụrụ

Foto mmadụ anọ a ma ama na-azọ ọkwa gọvanọ Anamba Steeti.
L-R Jude Ezenwafor nke pati PDP, Gọvanọ Charles Soludo nke pati APGA, Nicholas Ukachukwu nke pati APC na George Moghalu jị ọkọlọtọ pati LP azọ ọkwa ahụ.

Dịka e mechara ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti n'ụbọchị Satọde 8 Nọvemba, 2025, ọtụtụ mmadụ na-eto ebe ndị ọzọ na-akatọ etu ụlọọrụ Inec si hazie ntuliaka ahụ.

N'okpuru ọchịchị dị iche iche e mere ntuliaka ahụ, ụfọdụ ndị Anambra kwuru na ụfọdụ pati ji ego azụ vootu.

Na mkparịtaụka ha na ndị ntaakụkọ nwere dịka ha tụrụ vootu ha, Gọvanọ Charles Soludo nke pati APGA, Nicholas Ukachukwu nke pati APC, Geroge Moghalu ji ọkọlọtọ pati LP zọọ ntuliaka ahụ na Peter Obi bụbu gọvanọ Anambra Steeti, kwuru na ha chọpụtara na e ji ego azụ vootu na ntuliaka ahụ.

Dịka a pịachiri emume ịtụ vootu na ntuliaka a, onye ọbụla na-eche ka ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) chịkọta makwa kpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ nye ọhanaeze.