'Achọrọ m ka INEC nyochaa asambodo ndị niile na-azọ ọkwa gọvanọ n'Anambra steeti'
- Onye dere ya, Adline Okere
- Ndị mere akụkọ a, Editor
- Onye dere ya, Ebere Ekeopara
- Ndị mere akụkọ a, Reporter
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra Steeti akọwapụtala ọtụtụ ihe dị iche iche ọchịchị ya rụpụtara, nke mere o jiri sị ndị Anambra tụnyere ya akwụkwọ vootu iji chịa nke ugboro abụọ.
Soludo kọwapụtara nke a na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC News Igbo nwere.
O kwuru na ọtụtụ ihe ọchịchị ya rụpụtara na steeti ahụ gụnyere okporoụzọ, akwammiri na ọgbaneelu, ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ, obi ọchịchị ọhụrụ, mmepụtaihe, azụmahịa na akụrụngwa ndị ọzọ.
Gọvanọ Soludo kwuru na ya arụchaala okporoụzọ ndị mebiri emebi dị n'Ekwulobia, Ukpo, Uga , Enugwu-Otu Aguleri na ọtụtụ ebe ndị ọzọ.
"Ndị Enugwu-Otu Aguleri na-enwe ọṅụ ugbua n'ihi na ọchịchị m ewetarala ha ezigbo ụzọ, tinyere ha ọkụ latrik ma rụzichaa ụlọakwụkwọ dị nọ ebe ahụ".
"Ọ bụghị naanị Aguleri, anyị arụchaala ụzọ niile dị n'Ụkpọ, ma rụkwaa ezigbo akwa ụgbọala na mmadụ si aga (Fly-over) mara ezigbo mma n'Ekwulobia," ka Soludo kwuru.
Ọkankụzi Soludo gara n'ihu kwuo na obi ọchịchị ọhụrụ ọ ruuru n'Ọka bụ nke mara mma nke ukwuu wee gosi na n'eziokwu na Anambra bụ ihe nke Naijiria, "Light of the Nation". A kpọrọ obi ọchịchị ọhụrụ ahụ "Light House" nke pụtara ụlọ nke ihe.

Mmepụtaihe na azụmahịa
Gọvanọ Soludo kwuru na ọchịchị ya ewepụtala ọtụtụ atụmatụ ga-ebuli ebe mmepụta ihe niile dị na Nnewi, Ọnịcha na ebe ndị ọzọ ka ha na-emepụta ihe nke ọma ma bụrụkwa ndị e ji ama atụ na Naịjirịa.
"N'oge adịghị anya, gọọmenti Anambra ga-amalite ịhụ na ọkụ latrik agaghị anyụ anyụ maka imepụta ihe," ka gọvanọ Anambra steeti kwuru.
Soludo kọwara na ya na gọọmenti etiti enweela nkwekọrịta ka ụgbọmmiri ga-esi malitekwa ịda n'Ọnịcha maka mbubata ngwaahịa, bụ nke ga-enyere Anambra nakwa mpaghara ọwụwa anyanwụ niile aka nke ukwuu.
N'ihe gbasara ụgbọọloko, "mụ na Onyeisiala Tinubu nwere nzụkọ ebe m nọrọ gwa ya na ọ bụ ihe mwute na okporo ụgbọoloko ọhụrụ ahụ gọọmenti etiti na-arụ eruteghị Ọnịcha maọbụ Anambra. Enwere m olileanya na site na mbọ ndị anyi gbarala, okporo ụgbọ oloko nke ọgbara ọhụrụ ga-abata Anambra steeti n'oge adịghị anya.
Nchekwa obodo dịka ihe na-echere Gọọmenti Anambra aka mgba
Soludo tiri aka n'obi kwuo na ọnọdụ nchekwa n'Anambra steeti ka mma ugbua karịa etu ọ dị n'afọ anọ gara aga ọ batara dịka gọvanọ.
"Cheta na oge m batara m'ọchịchị dịka gọvanọ, o nweghị onye na-aga Ihiala aga, n'ihi ndị omekome nọ n'ime ọhịa egbusi mmadụ".
"Oge anyị mere ịchụ nta vootu nakwa mgbe e mere ntụliaka, ndị omekome ekweghị ka anyị bata Ihiala, mana taa, site n'usoro ọchịchị m si eso ha, azụmahịa, ịgụ akwụkwọ na ibi ndụ alọghachitewala n'uju ugbua.
Agha gọọmenti busoro ndị Dibịa na Ezenwaanyị na-agwọ okeite na awele
Gọvanọ Soludo gbarụrụ ihu kọwaa na ihe ya jiri busoo ndị Dibịa na Ezenwaanyị adigboroja agha bụ maka na ha ji nkwa na-enweghị isi na-aghọgbu ndị ntoroọbịa itinye aka n'ihe ọjọọ.
"Ndị Dibịa na Ezenwaanyị anyị jidere bụ ndị aka ha adịghị ọcha. Ha na-eji soshal midịa na-aghọrị ndị mmadụ, kwee ha nkwa na ha na-agwọ okeite, awele nakwa ibobo".
"Ihe ọzọ anyị chọpụtara bụ na ndị Dibịa ụfọdụ na-agwọrọ ndị ohi ọgwụ odeshi, ọgwụ ha ji efu, na ọgwụ mee ka m kwuru, nke ha ji atọrọ mmadụ, ere akụkụ ahụ mmadụ, agwọ ọgwụ ego ma na-ezu ohi nke butere ọtụtụ nsogbu n'Anambra steeti nakwa ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Gịnị bụ ọrụ ndị Agunechemba, Udogachi, SASA, Ocha Brigade na ndị Akaodo?
Dịka Gọvanọ Soludo siri kọwaa "Otu ọrụ niile anyị wepụtara bụ maka ọdịmma ndị Anambra".
"Gọọmenti m wepụtara Agunechemba iji chụọ ndị ntọrị mmadụ, ndị Dibịa na-agwọrọ ha ọgwụ nakwa ndị omekome nọ n'ime ọhịa sị na ha na-azọta nnwereonwe Bịafra."
N'ihe onyonyoo na-efegharị n'ịntaneetị gbasara otu SASA nke a kpọkwara ndị Akaodo, Gọvanọ Soludu ṅụrụ iyi na ya achụọla ndị otu ahụ niile gburu mmadụ, ndị kpatara ihe mberede nakwa ndị rufere ọrụ ha oke.
Gbasara ndị ojiegbe nọ n'ọhịa dị iche iche n'ala Igbo, Soludo sịrị na ụmụ okoroọbịa ahụ nọ n'ime ọhịa si na ha na-achọ Bịafra bụ ndị ohi na ndị ntọri.
"Mgbe m batara n'ọchịchị dịka gọvanọ, anaghị aga okpuru ọchichi asaa aga n'ihi ndị omekome, mana taa, naanị n'ime obodo mkpụrụ ole na ole ka ha ka nwereike na ya".
Na nwa mgbe nta, obodo ndị ahụ gụnyere Isseke, Lilu, Azia, na ebe ndị ọzọ ga-enwere onwe ha site na mbọ gọọmenti Anambra na ndị nchekwa Naịjirịa na-agba ikpochapụ ha n'ime ọhịa."
Soludo kọwara na gọọmenti ya wepụtakwara usoro mgbaghara nke a kpọrọ "Amnesty" nye onye omekome ọbụla jiri aka ya bịakwute gọọmenti, saa asịsa njọ ya ma dowe egbe ya. A ga-agbaghara onye dị etu a ma nye ya ọzụzụ ga-abara ya uru.
Kedụ ihe na-esere Gọvanọ Soludo na Peter Obi?
"Ọ bụghị naanị na mụ na Peter Obi bụ ụmụnne, anyị bụkwa enyi, ezinaụlọ anyị abụọ bụkwa enyi".
"Ọ bụ naanị na anyị nọ na pati dị iche iche nke kwenyere n'ihe dị iche iche mere ndị mmadụ jiri ahụta ya ka esemokwu".
"Anyị dị na mma," ka Soludo gwara BBC Igbo.
Gbasara ịgba egbe ọnụ n'etiti ya na ndị ji aha pati ọzọ azọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti, Ọkankụzi Chukwuma Soludo kwuru na ihe ya kwuru ebe ọ gara ịchụ nta vootu bụ ihe kwesịrị ka INEC lebara anya.
"INEC kwesịrị inyocha asambodo ndị niile ji pati APC azọ ọchịchị Anambra steeti wetara, n'ihi na ụfọdụ nwereike ịbụ adịgboroja".
"Mmadụ tinyere asambodo WAEC, ihe ọzọ o tinyere abụrụ PhD. Kedụ maka B.Sc na M.Sc?".
Achọpụtakwara m na ebe asambọdọ PhD ahụ siri bịa bụ ụlọakwụkwọ adịgboroja. Nani ndụmọdụ m na-enye INEC bụ ka ha rụọ ọrụ nnyocha ha nke ọma, mụ na mmadụ anaghị ese okwu".
Gọvanọ Soludo ji ohere mkparịtaụka ahụ rịọ ndị Anambra steeti ka ha pụta n'igwe n'ụbọchị Nọvemba 8 2025 tụọrọ pati ya bụ APGA vootu ka ya nweeike rụchaa ọrụ ndị o ji n'aka ma mezuo nkwa o kwere ime Anambra ka ọ dị ka Dubai-Taiwan.



