Lee ihe i kwesiri ịmara maka ọnọdụ nchekwa na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa

Ebe foto si, Screenshot
Mmadụ niile ma maka ọnọdụ nchekwa na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa mana ọ bụghị onye ọ bụla ma n'ọtụtụ obodo akwapụla nke na-enweghị mmadụ dị ndụ nọ n'ime ya n'ala Igbo.
Ọnọdụ obodo ndị ahụ dị ka ọnọdụ mgbe a nụrụ agha Biafra.
Amnesty International kwuru na ọ bụ mkpa mkpa na ọgba aghara dị n'etiti ndị Ojiegbe a kpọrọ "Unknown Gunmen" na ndị ọrụ nchekwa Gọọmenti mere ndị obodo ndị ahụ ji gbaa ọsọ ndụ kwalaga.
Ma ndị ọrụ nchekwa nke gọọmentị, ma ndị ojiegbe a na-akpọ 'Unknown Gunmen", ma ndị ntọ so na ndị a na-ata ụta banyere ọnọdụ nchekwa na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Obodo dịka Isseke, Lilu na Orsumoghu dị n'Anambra steeti, nakwa Orsu-Ihiteukwa, Awo Idemmili dị n'okpuru ọchịchị Orsu nke Imo steeti so n'ebe igwe mmadụ gbara ọsọ kpamkpam.
N'aka nke ọzọ obodo dịka Orsumoghu, Umunze, Uli, Azia, Orsu-ihiteukwa, Awo-Idemmili, Njaba, Izombe, Eziorsu, Amaifeke, Ihioma, Umulọlọ, Arondizuogu, Ihube, Awo-ommamma, Umuaka dgz bụ ebe ndị ojiegbe na-akpa ike mana ụfọdụ ndị mmadụ ka bi na ya.
Ndekọ otu Amnesty International wepụtara n'abalị iri na atọ nke ọnwa Ọgọst 2025 kwuru na e gburu mmadụ 1844 bido na januwari 2021 ruo Juun 2023.
Na ndekọ ahụ Amnesty International kpọrọ "a decade of impunity" ka ha sị na e gburu ndị mmadụ ahara ahara ma kwuo na aka ndị ọrụ nchekwa gọọmenti ma ndị omekome dị n'ihe mere.
Ha sị na ndị ojiegbe gburu mmadụ 400 n'Imo steeti site na 2019 ruo 2021.
Ọtụtụ bụ ndị e mere ka ha fuo efu ma kwuo na ọ bụ mgbe Gọọmenti bidoro ijide ndị otu na-azọ nwere onwe Biafra ka ọnọdụ ọgbaaghara bidoro.
N'uche gị gwa anyị etu ọnọdụ enweghị ezi nchekwa ga-esi kwụsị na ndịndị ọwụwa anyanwụ Naịjirịa?

Ebe foto si, Screenshot
Lee obodo ndị mmadụ gbara ọsọ n'ala Igbo kamgbe afọ ise n'ihi ike ndị ojiegbe na-akpa
Akụkọ ihe na-eme n'ụfọdụ obodo dí na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ọkachasị n'Anambra nakwa Imo steeti ugbua na-agba nnukwu anya mmiri.
Obodo dị iche iche na steeti ndị a abụrụla ebe ndị bi na ya gbarala ọsọ kpam kpam n'ihi nsogbu ndị oji egbe a na-amaghị a na-akpọkaarị "unknown gunmen" na-enye. Nke a ebutala ọnwụ ụmụafọ obodo nakwa ịla ngwaụlọ n'iyi.
Ndị a a kpọrọ "unknown Gunmen" bụ ndị ahụ ji egbe na-egbugaasị mmadụ n'ọtụtụ obodo n'Ọwụwa Anyanwụ.
Ha malitere inye nsogbu n'ihe dịka afọ anọ maọbụ ise gara. Ha bidoro site n'ịwakpo ma gbuo ndị ọrụ nchekwa na-anọ n'okpuru ụzọ, na na-awakpokwa ụlọọrụ ndị uweojii ọkachasị ndị dị n'ime obodo. Ndị ọrụ nchekwa ọbụla ha gburu, ha ga-ewere egbe, mgbọ nakwa ngwa ọgụ ha.
Ndị a gara n'ihu na-awakpo ma na-egbusi ọtụtu ndị nkịtị, ndị ndu na onye ọbụla selitere isi n'obodo na-akwadoghi ihe ha na-eme. Ha na-ahụta onye ahụ dịka onye na-agba ha mgba okpuru a kpọrọ 'saboteur' na Bekee.
Ndị a na-agbakwa ụlọ ndị mmadụ, ụlọọgwụ, ụlọụka nakwa ihe ọbụla gọọmentị hiwere n'obodo ndị a nke gụnyere isiụlọọrụ okpuruọchịchị obodo.
Mgbe ndị a bidoro, ha kwuru na ha so n'otu na-azọ maka mnwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (IPOB/ESN) nakwa Biafra Liberation Army (BLA), mana ugbua ndị a jizi ohere a na-eme mpụ dị iche iche gụnyere igbu mmadụ, izu ohi, ịtọrọ mmadụ, ịgwọ ọgwụ, ire akụkọ ahụ mmadụ dgz.
Nke a mere ka ọtụtụ ndị bi n'obodo ndị a ha ụlọ ha, ngwo ngwo ha, ọrụ ugbo ha nakwa akụnaụba ma gbaa ọsọ izendu.
Obodo ndị mmadụ gbara ọsọ kpam kpam
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Obodo ndị ihe a kachasị metụta ebe ndị mmadụ gbara ọsọ kpam kpam gụnyere Isseke, Lilu na Orsumoghu dị n'Anambra steeti, ebe ndị ọzọ bụ Orsu-Ihiteukwa, Awo Idemmili dị n'okpuru ọchịchị Orsu nke Imo steeti.
Isseke dị n'Anambra Steeti
Ọtụtụ ndị bi n'obodo a ahapụla ụlọ ha gbaa ọsọ ndụ kamgbe ihe karịrị afọ atọ gara aga.
Ụfọdụ ndị obodo na-achọghị ka a kpọọ aha ha gwara BBC na ndị oji egbe bicha n'ime ọhịa dị n'Isseke ebe ha ji mere ogige ma na-eme mwakpo dị iche iche.
Ha kwuru na ndị a na-esi n'ime ọhịa ahụ apụta kwa mgbe na-ezu ohi, anapụ ndị mmadụ ihe n'ike nakwa ịtọrọ mmadụ.
Ha kọwaara na ọtụtu mgbe ha na ndị ọrụ nchekwa akwataala mgbọ dịka e gburu ọtụtụ ebe ha gbukwara ụfọdụ ndịagha.
Ndị obodo gara n'ihu kwuo na ndị a bidoro ịgbagbusi ụfọdụ ndị obodo ma boo ebubo na ọ bụ ha na-akpara ndị ọrụ nchekwa ama.
Dịka ọ dị ugbua, ndị mmadụ ebighizi n'Isseke bụ obodo e ji ịkọ ọrụ ugbo maara. Ha na-akpa ike ọkpụkpa dịka nkata (Basket). Isseke zụpụtara ọtụtụ ndị a ma ama gụnyere odeakwụkwọ Olaudah Equiano.
Orsu-Ihiteukwa nke Imo Steeti
N'otu aka ahụ, ndị omekome a jikwa aha ịzọ mnwereonwe Biafra na-eme arụ n'Orsu-ihiteukwa dịka ndị obodo gbara ọsọ ndụ si kwuo.
N'oge gara aga, akụkọ kwuru na ogbunigwe gbara n'ahịa ukwu nnukwu ahịa a ma ama bụ Eke-Ụtụtụ ma gbuo ọtụtụ mmadụ.
Ihe onyonyo otu a kpọrọ "Orsu ga-adị mma" wepụtara n'akara soshal midia Facebook gosiri na ndị niile bi n'Orsu-Ihiteukwa agbaala ọsọ ndụ hapụrụ ndị oji egbe a obodo ha.
Ahịhia etouola n'ụlọ ndị mmadụ, n'ụlọụka na ụlọakwụkwọ gbachiziri agbachi kamgbe mgbe ọtụtụ ọnwa.
Ndị ojiegbe a na-eligasị ognunigwe n'ala iji mgbochie ndị ọrụ nchekwa ịbata n'obodo ha, ha na-agbakwa ụlọ ndị mmadụ ọkụ, kwaa ngwo ngwo ha niile ma ree ya.
Lee obodo ndị ọzọ ndị ojiegbe a na-akpa ike;
E nwere ụfọdụ obodo ndị ọzọ ndị ojiegbe a na-akpa ike mana ụfọdụ ndị mmadụ ka bi na ya dịka;
Orsumoghu, Umunze, Uli, Azia, Orsu-ihiteukwa, Awo-Idemmili, Njaba, Izombe, Eziorsu, Amaifeke, Ihioma, Umulọlọ, Arondizuogu, Ihube, Awo-ommamma, Umuaka.
Ihe ndị ọrụ nchekwa merela banyere nke a

Ebe foto si, Screenshot
Kwa mgbe ka ndị ọrụ nchekwa a kpọrọ 'Joint Task Force' - gụnyere ndịagha, ndị uweojii, ndị DSS na ndị 'Civil Defence' na-awakpo ma gbagbuo ọtụtụ n'ime ndị omekome ahụ mana a chụpụ ha n'otu ebe ha agbaga n'ebe ọzọ.
N'afọ gara aga, ndịagha ngalaba 82 Division Enugwu wakporo ogige ndị ojiegbe a a na-akpọ "Mother Valley" dị n'Orsumoghu Anambra steeti.
Ha wepụtara ozi na ha gbagburu ihe karịrị mmadụ iri na otu bụ otu IPOB/ESN n'ebe ahụ.
Ha kwuru na ihe niile ha hụrụ gosiri na ndị a ji ebe ahụ mere ogige ebe ha na-azụpụta ndịagha ha, idobe ndị a tọọrọ na igbu ma ree akụkụ ahụ mmadụ.
Ndịagha awakpokwala ọtụtụ ebe ndị ahụ ji mere ogige dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
Ihe gọọmentị merela
Gọmenti Anambra na Imo Steeti jikọrọ aka ọnụ, tinyere ndị ọrụ nchekwa JTF ihụ na ndị ojiegbe a nọ n'ime ọhịa kwụsịrị ajọ ihe ha na-eme.
N'ọnwa Julaị 2025 Gọvanọ Hope Uzodimma gwara ndị ojiegbe a ka ha wụsa ngwa ọgụ ha, na gọọmenti ga-agbaghara ha ma nye ha ohere ịmụ ọrụaka dị iche iche.
Gọomenti Imo kwuru na ọnye ọbụla na-emeghi nke a ruo mgbe ohere mgbaghara gwụrụ na onye ahụ ga-ata ahụhụ.
N'otu aka ahụ Gọvanọ Soludo nke Anambra nọrọ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2025 nye ndị ojiegbe juru n'ime ọhịa ohere ịwụsa ngwa ọgụ ma nara mgbaghara.
O mere nke a dịka o tinyere aka n'iwu ọhụrụ banyere nchekwa na steetị a kpọrọ 'homeland security law'.
Ihe ndị obodo o metụtara na-eme iji laghachị
Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ụfọdụ obodo ahụ a gbara ọsọ na ha ewepụtala onwe ha ịhụ na a chụpụrụ ndị ojiegbe a n'obodo ha.
Otu a na-akpọ 'Orsu ga-adị mma' ehiwela atụmatụ ma wepụta onwe ha maka mkpochasị ahịhịa ndị tojuru n'obofo ha, ha na gọọmenti na ndị ọrụ nchekwa na-arụkọ iji chụpụ ndị ojiegbe n'ime ọhịa dị n'obodo ha.
Etu ahụ ka ọ dị n'obodo Orsumoghu na Isseke, dịka na-egosi ka ha na-ekpochi olulu ndị a gwuru n'obodo ha n'akara soshal midia Facebook.










