"Okeite bụ ajọ ọgwụ, ọ bụghị omenala Igbo" – Law Mefor

Aha onyonyo, Okeite bụ ajọ ọgwụ, ọ bụghị omenala Igbo – Law Mefor
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Anambra steeti bụ Law Mefor ekwuola okwu gbasara ọnọdụ nchekwa steeti ahụ nakwa ihe mere e ji anwụchi ụfọdụ ndị dibịa a sị na-agwọ okeite.

Law Mefor kwupụtara nke a n'ajụjụ ọnụ pụrụiche BBC Igbo gbara ya.

Ọ sịrị na ndị dibịa ahụ emeela ka ọtụtụ ndị ntorobịa Anambra steeti chefuo na ịgba mbọ na ịrụsị ọrụ ike bara uru n'ihi na ha bụ ndị dibịa mere ka ha kwenye na onye gwọọ okeite, o nweta ego.

"Ọ bụrụ na ị na-agwọ okeite n'Anambra steeti ugbua, ị nọ na nsogbu maka na iwu a ji onye na-agwọ okeite, o jikwa onye na-agwọ nke ha na-akpọ ịbụbọ. O nwere nke ha na-akpọ udu akọ mmiri, ihe niile a ka ha ji aghọrị ndị ntorobịa anyị," ka Mefor kwuru.

Dịka o siri kwuo, ụfọdụ aja ndị ha na-achụ bụ ndị chọrọ isi mmadụ. "Ajọ ọgwụ bụ ajọ ọgwụ, ọ bụghị omenala Igbo. Okeite bụ ajọ ọgwụ," ka o kwuru

Okeite bụ ajọ ọgwụ, ọ bụghị omenala Igbo – Law Mefor

Ebe foto si, @DrLaw_Mefor/X

Nkọwa foto, Kọmịshọna mgbasaozi Anambra steeti bụ Dr Law Mefor

Gịnị mere e ji machie okeite n'Anambra Steeti?

Gọvanọ Chukwuma Soludo nọrọ ụbọchị Satọde 18 Jenụwarị 2025 kwupụta atụmatụ dị iche iche ọ mapụtara iji buo agha megide ọnọdụ ọjọọ nke nchekwa na-arị elu na steetị.

Ebe foto si, Getty Images/Chukwuma Soludo/Facebook

Nkọwa foto, Gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra steeti

Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Anambra steeti bụ Law Mefor akọwaala ihe mere gọọmanti steeti ahụ jiri machie ịgwọ ọgwụ 'okeite' na Eze nwaanyị na steeti ahụ.

Cheta na Gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra steeti nọrọ ụbọchị Satọde 18 Jenụwarị 2025 kwupụta atụmatụ dị iche iche ọ mapụtara iji buo agha megide ọnọdụ ọjọọ nke nchekwa na-arị elu na steetị.

Nke a na-abịa dịka ụlọomeiwu Anambra binyere aka ma hiwe iwu ọhụrụ a kpọrọ 'Homeland and Security law' nke afọ 2025, nke machiri ịgwọ ọgwụ 'okeite' na Eze nwaanyị na steeti.

Na mkparịtaụka Law Mefor na BBC Igbo nwere, ọ kọwara ihe mere gọọmenti ji machie ịgwọ ọgwụ 'okeite' na Eze nwaanyị na steeti ahụ.

Law Mefor kwuru na "Ọgwụ okeite bụ ajọ ihe na-akwado inwe ego na-arụghị ọrụ".

"Gọọmenti lere anya ma chọpụta na ọgwụ okeite emeela ka ụfọdụ ndị ntorobịa malite ịkwafu ọbara iji kpata ego n'ike, ọ bụ ya mere anyị ji machie ya", ka Mefor kwuru.

Mefor kwuru na ndị dịbia nwereike ịga n'ihu n'ọrụ ha mana onye dibia ọbụla a chọpụtara na ọ na-eme okeite, ga-enweta ntaramaahụhụ dịka iwu si kwuo.

"Anyị chọrọ ka ndị ntorobịa mara na ọ bụ aka aja aja n-ebute ọnụ mmanụ mmanụ", ka Mefor gbakwụnyere.

Nhiwe Agụnaechemba, mmachi ịgwọ ọgwu 'okeite' na ụzọ ndị gọọmentị Anambra ji ebuso ndị ekperima agha

Mgbe Gọvanọ Soludo binyere aka n'iwu ọhụrụ a

Ebe foto si, Charles Chukwuma Soludo/Facebook

Gọọmentị Anambra Steeti atọọla ọtụtụ ntọala nke ha kwuru na ọ bụ iji buo agha megide ọnọdụ ọjọọ nke nchekwa na-arị elu na steetị ahụ.

Gọvanọ Chukwuma Soludo kwupụtara atụmatụ ndị a n'ụbọchị Satọde 18 Jenụwarị 2025, dịka ọ na-ehiwe ngalaba ọrụ nchekwa pụrụiche a kpọrọ 'operation udo ga-achị' n'Awka bụ isiobodo Anambra Steetị.

Nke a na-abịa dịka ụlọomeiwu Anambra binyere aka ma hiwe iwu ọhụrụ a kpọrọ 'Homeland and Security law' nke afọ 2025.

Iwu ọhụrụ a nyere Gọvanọ Soludo ikike na nkwado ndị omeiwu ka o kewapụta ndị ọrụ nchekwa a kpọrọ 'agụnaechemba' iji busoo ndị ekperima na ndị ohi agha.

Iwu ọhụrụ a nwere ọtụtụ ngalaba rụtụrụ aka n'ihe dị iche iche iji hụụ na e nwere ezi nchekwa tara ọchịchị n'Anambra Steetị.

Ụfọdụ ngalaba dị n'iwu ahụ gụnyere;

Nhiwe Agụnaechemba

E bunyere otu ọtụtụ ụgbọala na ngwaọrụ ndị ọzo.

Ebe foto si, Charles Chukwuma Soludo/Facebook

Nkọwa foto, Agunaechemba bụ otu nchekwa ọdịnala pụrụiche, nke ọrụ ha gụnyere ibuagha megide ndị ohi na ndị ekperima.

Agunaechemba bụ otu nchekwa ọdịnala pụrụiche, nke ọrụ ha gụnyere ibuagha megide ndị ohi na ndị ekperima.

Ha ga-agba ama megide ndị ohi n'obodo, ha nwụchie ndị ohi ha ga-enyefe ndị a n'aka ndị uweojii.

Ha ga-echekwa ndụ na akụnaụba ụmụafọ Anambra Steeti, ha na ndị uweojii ga na-arụkọ ọrụ iji kpochapụ ndị ọjọọ na steeti. Dgz.

E bunyere ndị ọrụ nchekwa a ụgbọala ruru narị abụọ

Ebe foto si, Charles Chukwuma Soludo/Facebook

Mmachi ịgwọ ọgwụ 'okeite' na Eze nwaanyị

Iwu ọhụrụ gara n'ihu machie ndị dibia anya nzụ na ndị Eze nwaanyị ịgwọ ọgwụ ego n'ụzọ ọbụla nke a kpọrọ 'Okeite' iji nyere mmadụ aka nwete ego n'ụzọ na-abụghị nke iwu kwadoro.

Onye dibia maọbụ Eze nwaanyị mere nke a ga-aga nga afọ isii maọbụ kwụọ ego dị nde naịra iri abụọ (N20m).

Onye ọbụla chụrụ aja ma tụpụ ihe aja ya n'ime mmiri maọbụ n'okporoụzọ adaala iwu a, onye dị etu a ga-aga nga afọ isii maọbụ kwụọ ego dị nde naịra iri abụọ (N20m).

Onye ọbụla mere amansi ma duhie ọhanaeze n'aha na o nwere ikike pụrụiche iji napụ ndị mmadụ ego, onye ahụ ga-aga nga afọ isii maọbụ kwụọ ego dị nde naịra iri abụọ (N20m).

Mmachi okpukperechi

Iwu a kwuru na onye ọbụla ji ụlọ okpukperechi ọbụla na-eme mpụ dị iche iche, ma a chọpụta na nke a bụ eziokwu, na a ga-atụ onye ahụ nga afọ isii afọ isii maọbụ kwụọ ego dị nde naịra iri abụọ (N20m).

N'aka nke ọzọ, ụlọ okpukperechi ọbụla a cheere na e ji ya na-eme mpụ n'ụzọ ọbụla, gọọmentị ga-agbachi ụlọ okpukperechi ahụ ruo mgbe a ga-emecha nnyocha. E mechaa nnyocha ma chọpụta na ọ bụ eziokwu a ga-agbachi ụlọ okperechi ahụ ruo mgbe gọvanọ maọbụ ụlọikpe nyere n'iwu.

Mmachi ịtụ mgbere anụ ahụ mmadụ

Onye ọbụla gwọrọ ọgwụ maọbụ chụọ aja nke metụtara iji anụ ahụ mmadụ, onye dị etu adaala iwu nke a ga-eji atụ ya nga afọ iri abụọ na ise na-enweghi mgbapụta n'ụzọ ego.

Mmachi ndị nwere ụlọ obidi, ụlọ ndina na ala

Onye ọbụla nwere ụlọ obibi maọbụ ụlọ ndina ga-edekọrọ aha ndị bi n'ụlọ ahụ na akwụkwọ njirimaara ha na ihe ha na-arụ nye gọọmentị, ma onye ahụ emeghi nke a, a ga-atụ ya nga otu afọ maọbụ ọ kwụọ nde naịra ise (N5m).

Onye ọbụla nwere ụlọ, maọbụ ala dị n'ebe obibi maọbụ n'ime ọhịa, a chọpụta na ndị ntọrị ji ye na-ezo ndị ha tọọrọ maọbụ na-eme mpụ dị iche iche, gọọmentị ga-ewere ala maọbụ ụlọ ahụ kpam kpam, ebe a ga-atụ ya nga afọ iri abụọ na ise na-enweghi mgbapụta n'ụzọ ego.

Onye ọbụla a chọpụtara na o ji ụlọ ya na-arụpụta maọbụ na-ere ọgwụike n'Anambra Steeti, onye ahụ ga-ahapụrụ gọọmentị ụlọ ahụ kpam kpam.

Gọvanọ Soludo kwuru na nhiwe iwu a bịara mgbe ọ dị oke mkpa maka na ọtụtụ ndị ekperime na ndị ntọrị mmadụ na-akpa ike na mpaghara dị iche iche na steetị ahụ.

Cheta na nso nso a, a tọrọla ọtụtụ mmadụ gụnyere ndị ụkọchukwu, ndị azụmaahịa nakwa ndị nkịtị, ụfọdụ n'ime ha bụ ndị a tọhapụrụ ebe e gburu ụfọdụ n'ime ha.