Ihe ndị dibia kwuru banyere ọgwụ okeite na-ewu
Nsonso a, nke ihe na-ewu na soshal midia bụ akụkọ ndị gburu mmadụ bere akụkụ ahụ ha maka ịgwọ ọgwụ dị iche iche.
E nweela ọtụtụ akụkọ pụtara ihe n'ime izu abụọ garagara maka ndị gburu maọbụ ndị chọrọ igbu mmadụ maka ọgwụ ego.
Nke so ya ugbua bụrụzịa akụkọ gbasara ọgwụ nke a kpọrọ Okeite nke otu nwoke sepụtara na soshal midia nsonso a.
Nke a mere BBC Igbo jiri sinye imi n'ala ịmata ihe bụ okeite.
Anyị kpọtụụrụ ndị omenala na ọdịnala doro anya ka ha kọọwara anyị ebe okeite a siri pụta.
Ọzọ Desmond Meniru bụ Dibia n'Eziagu, Enugu steeti kwuru na Okeite bụ oke ọgwụ nke e ji ọbara anụmamụ maọbụ nke mmadụ agwọ.
Ọ sị na e ji Okeite enweta ihe n'aka chi mana Okeite e ji mmadụ agwọ dị oke njọ nke bụ na ndị mmadụ ekwesighị ịna etinye aka n'ụdị ihe ahụ.
Oke dibia bụ Olueze Ukaeje, Duruagwu nke abụọ n'Umunakara, Imo steeti sị na usoro Okeite nwere ozi zoro ezo n'ime ya nke bụ na a si na "Ajọ ọgwụ a na-eji nkụ sirike esi".
Ọ kọwara na ọ bụrụ na Dibia sị na "a ga-eji osisi ọjị sie ọgwụ a, ihe ọ pụtara bụ na a ga-eji ọkpụkpụ mmadụ sie ya bụ ọgwụ".
O kwuru na ọ bụrụ na a sị na "ihe a bụ Awele Ike, ihe ọ pụtara bụ na ahụ mmadụ ga-abariri na ya bụ ọgwụ".
Duruagwụ kwuru na Okeite abụchaghị maka ịnwe ego ka, mana mgbe ụfọdụ ọ na-abụ ihe gbasakwara ịsata ike "maka na anaghị aza dike na nkiti".
Ọ sịkwa na ọnwere ihe mmadụ ga-achụwa, ọ bụrụ na ya bụ ihe chọrọ okeite.
"Okeite bụ oke ọgwụ, ọ bụghị ọgwụ mmụaka", dịka o kwuru.

Duruagwu gara n'ihu kwuo na "onweghị arụsị maọbụ agbara ndị Igbo obula e ji mmadụ emedo, ihe Igbo jị emedo arụsị bụ anụọhịa dịka ewu, ọkụkọ na anụ ndị ozọ".
Ọ sị na ọbara mmadụ ịtasa n'ala bụ ezigbo ajọ ihe bụrụ oke alụ n'ala Igbo.
Ọ mara atụ sị na mgbe gboo, ndị Dike ọgụ lọta ọgụ na ana edopu ha iche ịhe karịrị izuụka nwere mgborogwụ na mkpaakwụkwọ maka "ịkwọ ha aka ọbara" tupu ha abata ụlọ ọzo.
Ọ sị na ịme Okeite iji megide mmadụ maọbụ igbu mmadụ n'ime ya dị ezigbo njọ maka na ọ na-akpata ọtụtụ ajọ ihe na ndụ ndị mere ya.
Dịka ndị ihe omenala doro anya si kwuo, ihe ise imejọ Okeite nwereike ibutere ndị mere ya gụnyere:
- Nze Olueze Ukaeje sị na Okeite nwereike ibutere onye gworo ya ara ọghịghị.
- O nwekwereike ibutere ha ụdị ọrịa dị iche iche enweghị ọgwụgwọ.
- Ọzọ Desmond Meniru sị na Okeite abụghị naanị onye gwọrọ ya ka ọ na-ebuere ajọ ihe, ka ma na ọ na-emetuta ezinaụlọ ya mgbe ụfọfdụ.
- "Ọ nwereike ibuere ụmụ ya akwụkwụ, maọbụ ọnọdụ ịgụ asọmmiri nke bekee kpọrọ "Down Syndrome".
- O nwekwaraike ibutere ezinaụlọ ya ụdịrị ọrịa dị iche ego agaghị azọpụtalị ha na ya.
Ọzọ Meniru na Durugwụ dọrọ ụmụ Igbo aka na ntị ka ha sepụ aka na iji mmadụ gwọọ ọgwụ maka na ndị na-eme etu a na-emerụ ala.