Ritual Killings in Nigeria: Etu nwaanyị si gbalahụ nwa ya 'chọrọ iji ya gwọọ ọgwụ ego'

Mma e ji magbuo mmadụ

Ebe foto si, HO Metro Police

Dịka akụkọ fesara na otu nwokorobịa nwara igbu nne ya ma jiri ya gwọrọ ọgwụ ego n'Owerri, Imo steeti, nne ya ahụ ekwuputetula ihe mere.

Nwaanyị ahụ na-achọghị ka a kpọpụta aha ya ugbua, kwuru na nwa ya nwoke ahụ sụrụ ya mma ọtụtụ oge ka ọ bịakwutere ya n'ụlọ.

O kwuru na ya na nwa ya zọrọ mma ahụ azọ tupu o nweta obere ohere wee gbapụ ọzọ.

Nwaanyị ahụ ka nọ n'ụlọọgwụ na-anata ọgwụgwọ ugbua.

Ọ gwara BBC Igbo na ya achọbeghi ịgwa ndị ntaakụkọ okwu n'uju ugbua, ruo mgbe ọ gbakere.

Gịnị mere?

Akụkọ fesara na soshal midia kwuru na otu nwokorobịa a ma dịka Ebube kpọrọ nne ya ka ọ bịa leta ya n'ụlọ ya n'Owerri.

Mana oge nne ya bịara, nwata nwoke ahụ ji mma chọọ ịsụgbu nne ya.

Akụkọ gwuru na nwa okorobịa ahụ chọrọ iji nne ya gwọọ ọgwụ ego', mana nne ọ gazighịrị ya.

Mana o dobeghị anya kpọmkwem ihe nwata nwoke ahụ bu n'uche mere o ji chọọ igbu nne ya.

Ebee ka ndị uweojii kwụ n'okwu a?

Mike Abattam bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti gwara BBC na Ebube anọghị n'aka ha ugbua, na ọ nọ n'ụlọọgwụ ebe a na-edewe ndị isi mgbaka.

O kwuru na ha ka na-eme nnyocha ịmata etu ya bụ ihe si mee.

Gịnị ka ịgwọ ọgwụ ego pụtara?

Ịgwọ ọgwụ ego bụ usoro ụfọdụ mmadụ chere na a ga-esi bute ego ọsịsọ site n'igbu mmadụ nakwa ịtụ aja ọjọọ dị iche iche.

Onye dibịa na onye na-achọ ego ga-eme ụfọdụ omerịa ha chere ga-ebute nnukwu ego.

Ọtụtụ mgbe onye ha na-egbu na-abụkarị onye ha ghọgburu maọbụ onye ha tọọrọ, mana onye ahụ anaghị ama na ha ga-eji ya agwọ ọgwụ ego ruo mgbe ọnwụ bịachara ya nso.

Aha onyonyo, Etu nwa m si gbanahụ ọnwụ n'aka 'onye chọrọ iji ya agwọ ọgwụ ego' - Ken Ekwus

Akụkọ maka ịgwọ ọgwụ ego dị ọtụtụ na Naịjirịa, mba nwere ọtụtụ ọnụọgụgụ ndị ụbịam.

Ọnụọgụgụ gosiri na ihe ruru pasenti iri atọ na atọ ndị ntorobịa Naịjirịa enweghị ọrụ.

Mana onweghị ihe akaebe doro anya gosiri na ịgwọ ọgwụ nwere ike ime mmadụ ọgaranya.