Ọ bụ eziokwu na e wepụla Kayode Egbetokun dịka onyeisi ndị uweojii Naịjirịa?

Foto Egbetokun gbara arụkwaghịm dịka onyeisi ndị uweojii Naịjirịa

Ebe foto si, Nigeria Police/X

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ na-efegharị ekwuola na Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun agbaala arụkwaghịm.

E kwuru na ọ bụ Onyeisiala Bola Tinubu gwara ya ka ọ gbaa arụkwaghịm oge ha nwere nzukọ n'obi ọchịchị Aso Rock dị n'Abuja.

Akụkọ kwukwara na ọ bụ Tunji Disu bụ onye ji ọkwa osote onyeisi ndị uweojii, ga-anọchi ya dịka onyeisi ndị uweojii Naịjirịa.

Mana isiụlọọrụ ndị uweojii Naịjirịa ekwubeghị ihe ọbụla banyere akụkọ ahụ.

Mana otu onye ọnụ na-eru n'okwu banyere okwu a kpụ n'ọnụ na achọghị ka a kpọọ aha ya, gwara anyị na ọbụ eziokwu na e wepụla Egbetokun dịka onyeisi ndị uweojii mana e mebeghị ya ka ọ pụta ihe..

Cheta na Onyeisiala Tinubu họpụtara Egbeokun dịka onyeisi ndị uweojii Naịjirịa n'ụbọchị Mọnde Juun 19, 2023.

Egbetokun gbara afọ 58 oge a họpụtara ya dịka onyeisi ndị uweojii Naịjirịa. O kwesiri ịna ezumike nka na Septemba 2024 oge o ruru afọ 60.

Mana ụlọomeiwu Naịjirịa gbanwere iwu ndị uweojii nke nyere Egbetokun oghere ijide ọkwa ahụ ruo afọ anọ maọbụ mgbe Onyeisiala wepụrụ ya.