E nwere ụfọdụ njirimara osisi ga-egosi a mara na ọ chọwala ọdịda - Ọkammụta gbasara osisi

Ndị ọkachamara kwuru na ndị mmadụ nwereike igbutu ngalaba ya mgbe ọbụla

Ebe foto si, Screengrab

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Okammụta Adamu Aliyu Aliero bụ onyeisioche otu 'Botanical Society of Nigeria' ekwuola na e nwere ụfọdụ njirimara osisi ga-egosi a mara na osisi ahụ a chọwala ọdịda.

Aliero mere ka o doo anya na-akwụkwọ osisi dawa mgbe ọbụla maọbụ azụ osisi ahụ tụgharịwa nke bụ na ọdịghị etu o si adị mbụ, nke ahụ pụtara na osisi ahụ nwere nsogbu.

"Ya bụrụ na osisi ahụ nọ n'akụkụ ụlọ ndị mmadụ maọbụ ebe a na-azụ ahịa, ndị obodo nwereike igbutu ya kpam kpam maka ndụ ndị mmadụ nwereike ịnọ n'ihe ize ndụ"

O kwuru nke a mgbe ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche ebe ọ kọwara na e nwere osisi ndị nwere ike ịdị ndụ ogologo oge karịa mmadụ.

N'agbanyeghị na-enwere osisi ndị nwere obere ndụ nakwa ndị nwere ogologo ndụ, "e nwekwara osisi ndị nwereike ịnọ afọ iri ise maobu karịa."

Ọ dọọrọ aka na ntị sị na ebe ọ bụla e nwere osisi tọrọ oke ogologo, ndị obodo kwesịrị ị na-egbutu ngalaba ya karịa igbutu osisi ahụ niile kpam kpam.

Ọ gara n'ihu kwuo na nje nwereike inye osisi nsogbu nke nwereike ime ka ome ochie ọsịsọ.

N'agbanyeghi na e nwere ndị nwere okwukwe dị iche iche gbasara osisi nke mere ụfọdụ ndị anaghị ekwe ka egbuto osisi, Aliero nyere ndụmọdụ na ya bụrụ n'osisi ahụ nọrọ ebe ndị mmadụ bi, ndị isi obodo kwesịrị ịzukọ ọnụ maobụ kpọ ndị ọchịchị oku ka ha bịa gbutuo osisi ahụ.

"E nwere ndị n'efe osisi. E nwere ndị sị na ndụ ha nọ n'osisi. Nke ọbụla ọbụ, ya bụrụ na osisi ahụ tinye ndụ ndị mmadụ n'ihe ize ndụ, e kwesịrị ikpọ ndị isi obodo ka ha mara ihe ha ga-eme ya"

Ọ gara n'ihu kwuo na oge ọbụla a na-aba oge mmiri ozuzo, maobụ egbe eluigwe na-agba, osisi na adakarị ya mere ndị mmadụ ekwesighị ị na-anọ n'okpuruosisi maọbụ rụọ ụlọ n'akụkụ ebe osisi nọ nakwa ịdọba ụgbọala n'okpuru osisi.

Enugwu steeti: Oke osisi dara n'ebe Awhum monastery, gbuo ọtụtụ mmadụ
Ụgbọala Sienna so nwee ihe mgberede ahụ
Nkọwa foto, Ụgbọala Sienna sokwa na ya bụ ihe mberede

Ikwa akwa na iru uju na-ada ugbua n'Obodo Awhum dị n'okpuru ọchịchị Udi n'Enugwu steeti, Naịjirịa maka na otu osisi dara ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ ruru iri na otu.

Nnukwu ọdachi a mere n'ụbọchị Tuzd, Feb 17, 2026.

Ọ bụ nnukwu osisi a na-akpọ 'Ukwu akpụ" bụ ihe dara ma dagbuo ndị na-eme njem nọ n'ụgbọala.

Oge BBC rutere n'ahia Awhum, bụ ebe mkpamkpa kpara, ụzụ akwa ka na-ada ebe niile.

Mazi Okereke Ben kọwara na ọ bụ oge ọ kụrụ elekere asaa nke mgbede n'abalị garaaga ka ha nọkatara nụ nnukwu mkpọtụ dịka nnukwu ikuku mmiri na-eku.

Osisi ahụ dakporo ụgbọala bọsụ
Nkọwa foto, Osisi ahụ dadoro ụgbọala bọsụ
Gọmenti Enugwu ewerela igwe “Dolma” berie Osisi akpụ Awhum, wee nwee ike dọpụta ozu mmadụ iri na otu ọ dadoro
Nkọwa foto, Osisi Akpụ dị n’ahịa Awhum, Enugwu steei dagburu mmadụ 11 na Februwari 18, 2026.

Ọ kwuru na ngwa ngwa ha pụtara ka ha mara ihe na-eme ka onye ọbụla hụrụ na ya bụ ukwu akpụ adaala ma dado ụgbọala bọọsụ na sienna na-agafe agafe.

Ọ sị na "ndị obodo gbara mbọ ike ha, mana ndị niile nọ na ya bụ ụgbọala dị iri na otu nwụrụ anwụ pii".

Ọ gara n'ihu kwuo na "ndị nke ọzọ osisi ahụ dakwasịrị bụ ndị nke nọ na ụgbọala Sienna nọ n'ụlọọgwụ mana ha nọ n'agbata ọnwụ na ndụ".

N'aka nke ọzọ, Igwe Ukana bụ HRM Tagboo kọwara na osisi akpụ ahụ anwụọlarịị ka mgbe mana ọ ka kwụ ọtọ, ganye na ọ daa ada ahụ.

Ọ kwara arịrị na o teela mgbe ndị obodo na ndị ụka chọrọ igbu osisi ahụ mana ndị ntorobia n'efe osisi ahụ jụrụ ajụ.

Fada Benjamin Ochiagha, Onye Awhum
Nkọwa foto, Fada Benjamin Ochiagha, onye Awhum

Ụkọchukwu katọliki bụ onye Awhum, Fada Benjamin Ochiagha ji anya mmiri kwuo na obi agbawala ya maka ndụ osisi ahụ lara n'iyi.

O kelere gọọmenti Enugwu steeti maka ịgbatara ha mkpu enyemaka.

Ihe anyi hụrụ n'ebe ahụ bụ na ndị Obodo kariri narị abụọ nọ na ya bụ ahia na-enyere ndi ọrụ gọọmenti Enugwu steeti aka na-akpụpụsị osisi ahụ n'ụzọ.

Ka ọ dị ugbua, eburula ozu mmadụ iri na otu nwuru anwụ dọnye n'oba ozu.

Mmadụ iri n'ime ndị nwụrụ bụ ndị ụ ndị Okpatu, ebe otu onye nke ọzọ bụ onye Umurumgbe dị n'okpuruọchịchị Udi dị n'Enugwu steeti.