A tụọla Akwa Ọkụkọ mkpọrọ ọnwa iri na otu

Akwa Ọkụkọ

Ebe foto si, Akwa Okuko/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọikpe Ukwu dị n'Ọka, isi obodo Anambara steeti atụọla Chidozie Nwangwu a ma ama dịka 'Akwa Ọkụkọ' mkpọrọ ọnwa iri na otu maka ebubo metụtara ịgwọrọ ndị mmadụ ọgwụ ego nke a kpọrọ 'Oke Ite'.

N'ikpe e kpere taa bụ Fraịde 27 Febụwarị 2026, ka Akwa Ọkụkọ bụ dibịa a ma ama kwetara n'ebubo ndị e boro ya tupu ọkaikpe nye mkpebi ahụ.

Cheta na Gọọmenti Anambara Steeti nwụchiri mmadụ atọ gụnyere Akwa Ọkụkọ, Onyeze Jesus na Eke-Hit maka ebubo ịgwọrọ ọgwụ ego, inwe mekọ ha na ndị na-ebu ọgwụ ike, na ịgwọrọ ndị ntọ ọgwụ nke megidere iwu nke Anambara steeti.

Ihe ndị ọzọ ọkaikpe kpebiri n Akwa ọkụkọ nọchaa na mkpọrọ na ọ ga ama ọkwa n'ọha kwuo na ọ jula okeite na ọgwụ ndị yiri ya.

Ọzọ bụ a ga-ebibi ọkwu arụsị ya dị n'Oba.

N'aka nke ọzọ, ọ pụtana mkpọrọ, ọ ga-abụzi onye nnọchiteanya na-agbasa ozi(ambassador) nye ndị ntorobia na okeite abụ aghị ezigbo ihe