Kedụ ihe ndị nwereike ime ka mmadụ daa ma nwụọ n'otu ntabi anya na mberede?

Onye dọkịta yi uwe na-acha ọbara ọbara na nyara igwe e ji enyocha obi mmadụ n'olu.

Ebe foto si, PA Media

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Otu nwaanyị a kpọrọ 'Pharmacist Bilikisu' nke na-arụ ọrụ ngalaba 'Port Health Services dị n'okpuru Ministrị Ahụike nke Etiti na-eto onyeisi ya n'ọgbakọ ndị ụlọọrụ ha nwere n'Abuja n'ụbọchị ise nke ọnwa Jenụwarị afọ 2026, maka nkwado ya nke mere "nke na ihe ndị m chere na m agaghị emeli, ana m emezi ha", tupu ọ tọgbọọ na mberede ma nwụọ.

N'otu aka ahụ, Fada Stephen Chukwuma dara dịka ọ na-ekwu okwuchukwu n'ụlọụka n'abalị foro ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2026, ọ bụrụ ọnwụ.

Fada Chukwuma nke ụlọụka Katọlik St. John De Baptist dị n'Agbo, Delta steeti dị afọ iri isi na atọ (63) tupu ọ nwụọ.

Ọ dị ka na nrọ mana ọnwụ mberede nke Bekee kpọrọ 'sudden death' amaghị nwata, ọ maghị okenye nke ọ ji ama nwoke maọbụ nwaanyị.

Ọnwụ mberede bụ ọnwụ osinachi dakwasara onye ahụike ya dị mma n'ime otu awa maọbụ n'otu ụbọchị o gosiri na o nwere nsogbu ahụike.

Ọnwụ mberede bụ nsogbu ahụike na-arị elu na nso nso a, dịka o zuurula ndụ ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere otu nwaanyị nakwa otu ụkọchukwu.

Parmacist Bilkisu na Fada Stephen Chukwuma lara mmụọ site n'ọnwụ mberede.

Ebe foto si, Screenshot/Catholic Diocese of Issele-Uku

Gịnị na-ebute ọnwụ mberede?

Mgbe ndị ụkọchukwu yi uwe ọcha ha ma buru igbe ozu Fada stephen Chukwuma na-acha ọcha ma na-adọnye ya n'ala.

Ebe foto si, Catholic Dioces of Issele-Uku

Dịka Dọkịta ọkachamara n'ahụike obi bụ Ọkammụta David Oke si kwuo; ọrịa ọkụkụ obi (heart attack), ọrịa obi nkoropu (heart failure), ọrịa mkpọnwụahụ (stroke), ọbara mgbalielu (HBP), ọrịa ume ịchụ ọsọ (arythmia), nakwa nsogbu oke ọgbụgbọ (severe vomiting) maọbu oke ọnyụnyụ (severe diarrhea) nwere ike ọnwụ mberede nye mmadụ.

Dr Oke kọwara sị, "Ọ bụrụ na ọbara kwụsị irugharị n'obi, akụkụ obi o metụtara anwụọ. Nke a ga-emetụta etu obi mmadụ si eti ma mee ka obi kwụsị ikesa ọbara n'akụkụ ahụ ndị ọzọ ozugbo.

Nke a bụ otu n'ime ihe ndị nwereike ibute ọnwụ mberede site ọkụkụ obi nke Bekee kpọrọ 'heart attack' maọbụ 'myocardial infraction'.

Ọrịa maọbụ ọnọdụ ndị ọzọ nwere ike ibute ọnwụ ntụmadị gụnyere ọrịa ọgbara ịkpụkọ n'ngụ (pulmonary embolism), ọrịa ụbụrụ ịgba ọbara (brain aneurysm/brain haemorrhage) ọrịa oyi ịba ahụ(acute pnenumonia), dịka ụlọọgwụ Cleveland Clinic dị n'Amerịka si rụtụ aka n'ọbaozi websaiti ha.

Ndị nwere ike idanye n'ọnwụ mberede gụnyere ndị nwere ọrịa ọbara mgbalielu, ọrịa shuga, ndị na-ṅụ oke mmanya,ndị buru oke ibu, ndị na-ese ihe osise, ndi nweburuola nsogbu ọkụkụ obi(heart attack).

Ọzọ, nsogbu ọnwụ ntụmadị na-adakwakarịsị ndị dị agbata afọ 45 na afọ 74.

Mmadụ ole nwụọọla site n' ọnwụ mberede?

E nweghị ndekọ ndị nwụọrọla site n'ọnwụ mberede na Naijiria mana i lee anya akụkọ ndị mgbasaozi, ọnụọgụgụ ndị na-anwụ site na ya na-arị elu.

Otu nnyocha nke ụlọọgwụ 'Ladoke Akintola University of Technology' (LAUTECH) Teaching Hospital', Ogbomosho, Oyo steeti, mere gosiri na ọnwụ mberede(na-erughị awa 24 e ji nabata ha n'ụlọọgwụ ahụ) bụ ihe tara isi pasent 4 n'ime mmadụ 718 nwụrụ n'ụlóọgwụ ahụ n'afọ itoolu(2003-2011).

Nnyọcha ahụ chọpụtata na ọ bụ ọrịa ọkụkụ obi nakwa ọbara mgbalielu bụ ihe butere ọnwụ ntụmadị ndị ahụ dịka enyochara ihe gburu ha.

Kedụ ihe i kwesịrị ime ma mmadụ daa n'otu ntabi anya?

Ọnwụ bụ onye ohi, o zuru ọ gbalaga mana i nwere ike ị napụta onye ọnwụ mberede na-ede izu ma ọ bụrụ na ime ngwangwa n'ihe ndị a dọkịta ọkachamara n'okwu ahụike obi na-ekwu - inye enyemaka ga-akwalite onye ahụ iku ume.

Dkt. Oke kọwara sị, "Ọ bụrụ na ọ bụghị nke ọjọọ ya, na onye ahụ anwụghị ozugbo ọ dara, e nwere ike ịzọta ndụ ya site n'ikunye ya ume , mee ya ihe Bekee kpọrọ 'Cardio Pulmonary Resuscitation (CPR) dịka a na-eche ụgbọ gbatagbata e ji ebu ndị ọrịa ka o rute bụga ya ụlọọgwụ."

Etu i nwereike iji egbochi ọnwụ mberede

Na-eme nnyocha ahụ mgbe ọbụla iji mata ka shuga ọ dị gị n'ọbara, mmanụ (cholesterol) dị gị n'ahụ nakwa ịmata ma i nwere ọbara mgbalielu.

Dkt. Oke sirị, "I kwesịrị ịmata ọnụọgụgụ gị; I kwesịrị ịma ma ọbara gị ọ gbaliri elu (BP); etu shuga dị n'ọbara gị ha; i kwesịrị ịma ma 'cholesterol' gị ọ gbaliri."

"Ọ bụrụ na BP gị rịrị elu, ị gaa hụ dọkịta gị maka nleta. Ọ bụrụ na 'cholesterol dị elu, e nwere ọgwụ e ji eme ya ka ọ gbatuo.

"Ha atọ' ọbaramgbalielu, ọrịa shuga na 'cholesterol' gbaliri elu bụ isi ihe na-ebute ọkụkụ obi."