Cancer, diabetes na ọrịa ndị ọzọ e jibu mara ndị okenye ndị ntorobịa na-arịazị ugbua

Dọkịta na onye na-arịa ọrịa

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos

Ihe dịka afọ iri gara aga, e nwere ụfọdụ ọrịa a na-eche na ọ bụ sọsọ ndị okenye ka ụfọdụ ọrịa ndị a na-arịa.

Mana ugbua, ọrịa ndị a gụnyere ọrịa shuga na ọbara mgbali elu, so n'ọrịa na-egbu ndị ntoroọbịa ugbua.

Ngalaba World Health Organization (WHO) bụ ngalaba na-ahụ maka ahụike na mbaụwa, kwuru na ọrịa ndị a na-arịazị ndị ntoroọbịa ugbua, na-ebute ọnwụ mmadụ abụọ n'ime mmadụ atọ n'ụwa niile.

Ọrịa ndị ahụ gụnyere:

  • Ọrịa shuga
Ka ọrịa shuga sị bawanye ụba na mpaghara Sahara Afrịka
  • Ọbara mgbali elu: Nkea bụ ọrịa ndị dibịa Bekee na-akpọ 'high blood pressure'. Ọ bụ mgbe ọbara na-agbasị ike n'akwara karịa 140/90, ọ na-aka njọ ma ọ karịa 180/120.
  • Ọrịa mkpụrụ obi: Ọ bụ ọrịa mkpụrụobi mmadụ nke ọtụtụ ọrịa dịgasi icheiche nwereike ịkpata.
  • Ọrịa mkpọnwụ ahụ: Nke a bụ ọrịa na-eme mgbe oke ọbara anaghị eruzi ụbụrụ.
  • Ọrịa nsekpọ ụbụrụ (Alzheimers) - Ọ bụ ọrịa sị na mgbe mmadụ enweghi ike icheta ihe maọbụ ọrụ ndị ọzọ ụbụrụ na-arụ.
  • Mgbujiri/Ọrịa ikpere (Arthritis/Rheumatism) - Ndị ọkachamara n'ihe gbasara ahụike kwuru na ọrịa a nwereike ibido n'ahụ onye dị site n'afọ 17 gbagowe. Ọ na-eme mgbe njịkọ ọkpụkpụ mmadụ ga-aza nke agahị ekwe ka o megharịa ya.
  • Ọrịa akpụ/Kansa - Teknụzụ emeela ya na ugbua, a na-achọpụtanwịzị ya ma n'ụmụaka, ntoroọbịa na ndị okenye. Ọ bụ ọrịa nke na-eme ka ọwọ njọ ga na-eto n'ahụ mmadụ nke ga-arịagbu ọkpụ ọwọ n'ahụ onye ahụ.
Aha onyonyo, 'Eji m ụkwụ bịa ụlọọgwụ mana ozigbo m nụrụ ihe na-eme, aganwụzịghị m ije'

BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị dọkịta ajụjụ ọnụ maka ihe ngalaba ahụike WHO kwuru.

Ihe ha kwuru bụ ihe mmadụ niile kwesịrị ige ntị nụrụ.

Ihe ndị dkta kwuru:

Onye na-ele shuga dị n'ọbara ya
Nkọwa foto, Onye na-ele shuga dị n'ọbara ya

Otu n'ime ha bụ Dkt. Zubair Abdullahi bụ onye kwuru na ụfọdụ ọrịa ndị a na-adị n'agbụrụ, nke pụtara na ọ ga-emetụta ndị ahụ ma ha abụ okenye maọbụ ntoroọbịa.

Onye nke ọzọ bụ Dkt. Henry Eze, kwuru na o nwereike ịbụ na ọgwụgwọ

Bekee akawanyela mma, nke pụtara na a na-achọpụta ọrịa ndị a n'oge mgbe mmadụ ka bụ ntoroọbịa.

Mana dọkịta abụọ a kwekọrịtara na oke ibu, iri nri ọjọọ nakwa emegharịghị ahụ, socha n'ihe na-eme ka ndị mmadụ bute ọrịa ndị a.

Ụmụnwaanyị buru ibu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị na-arịa ọrịa n'ihi etu ha ha n'ibu

Ha kwuru na ọ bụrụ na ị chọpụta otu n'ime ọrịa ndị a dị n'agbụrụ gị, ị gaghị agbanwenwu ya.

"Ọ bụghị ihe niile ka ị ga-agbanwenwu, mana ibi ndụ ọfụma ga-enyere gị aka dọtịa oge ọrịa ahụ ga-eji chukwute gị".

Ihe nkiri a maka nwaanyị meriri ọrịa kansa ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Onye meriri ọrịa kansa

Akụkọ ndị a ga-amasị gị: