High blood pressure: Ị ma na onye ọ na-eme n'afọ 30 na 40 nwere ike imecha nwee nsogbu n'ụbụrụ?

Nwaanyị ya na nwa na-arụ ọrụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ruru afọ 30 na-arụkarị ọrụ ma na-elekọtakwa ezinaụlọ

Ndị rurula afọ 30 kwesịrị ịgba mbọ hụ na ha enweghi ọbara mgbali elu iji gbochie ọrịa ụbụrụ mgbe ha kawara nka, dịka nchọpụta si kwuo.

Nchọpụta ahụ kọwara na "oge kacha mkpa" iji echekwa ahụike ụbụrụ mmadụ bụ site n'oge ahụ ruo mgbe mmadụ karuru mbido afọ 50.

Nchọpụta ahụ so mmadụ 500 a mụrụ n'afọ 1946, gosiputara na ọbara mgbali elu mere mmadụ na mbido "etiti ndụ ya" nwereike ibute ọrịa ụbụrụ.

Nke a abụghị mbụ a na-eche na ọbara mgbalie elu bidoro n'oge nwereike ibute ọrịa ụbụrụ nke na-eme ka mmadụ na-echefukarị ihe, nke Bekee kpọrọ "Dementia", mana ndị ọkammụta sayensị chọrọ ịghọtakwu mgbe nakwa etu o nwereike ime.

N'ime oge e mere nchọpụta a nke e biputara n'ọbaozi Lancet Neurology, e nyochara ndị sonyere na ya iji mata ogogo ọbara ha ma nyochakwa ụbụrụ isi ha.

A chọpụtara na ọbara mgbali elu mere onye dị ebe afọ 36 ruo afọ 43 butere mpewanye mpe ụbụrụ.

'Iweta mmebi ọsịsọ'

Ụbụrụ onye ọbụla na-atalatu obere ka onye na-aka nka, mana ọ na-egosikarị ọfụma na nke ndị na-arịa ọrịa ndị dịka ọkpọnụbụrụ nke Bekee kpọrọ "Dementia" bụ ọnọdụ ichefu ihe na-abịakarị n'agadị.

Ebe ndị e nyochara egosighi na uche ha ezuchaghị ezu, ndị nnyocha kwuru na ọtịta ụbụrụ na-amalite tupu nke ahụ - nke bụ na ha ga-aga n'ihu na-etinye anya ebe ndị ha nyochara nọ n'afọ ndị na-abịa, iji mara ma ọ ga-emecha mee ha.

Eserese gosiri etu ụbụrụ mmadụ si agba nchefu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ihe mmadụ sere gosiri etu ụbụrụ mmadụ si agba nchefu

A chọpụtara na ọbara mgbali elu na-eme ndị dị afọ 43 ruo afọ 53, butere mmebi okporo ọbara na-agba n'ahụ maọbụ "obere mkpọnwụ ahụ" oge ndị mmadụ ruwere ebe afọ 70.

Ọkammụta Jonathan Schott, onye ọrụ ya bụ inyocha ụbụrụ isi mmadụ na UCL Queen Square Institute of Neurology, du ndị mere nnyocha a.

O kwuru sị "Ọbara mgbali elu, ọbụladị oge anyị dị afọ 30, nwereike inye ụbụrụ mmadụ nsogbu mgbe afọ iri anọ gachara. Nnyocha na mgbochi e ji elekọta ahụike ụbụrụ mgbe onye kawara nka, kwesịrị ịmalite ebe etiti ndụ mmadụ."

Paul Leeson, onye bụ ọkammụta n'ihe gbasara nlekọta ọrịa obi na mahadum Oxford, kwuru: "O teela anyị matara na ụfọdụ ndị nwere ọbara mgbali elu na-emecha nwee mgbanwe n'etu ụbụrụ ha dị.

"Ihe ndị dọkịta na-arụrịtaụka maka ya kemgbe bụ ma ilekọta ọbara mgbali elu n'ahụ ndị ntoroobịa ọ na-egbochi mgbanwe ụbụrụ ndị a.

"Ihe ọzọ a ga-emenwu bụ nke anyị na-emekarị ugbua, bụ ichere ruo mgbe onye kataturu obere, ibido na-enyocha ọbara mgbalie elu makana anyị ma na mgbe ahụ, mgbanwe ụbụrụ isi amalitela n'ike n'ike."

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Mental Health: Ụzọ asatọ ị ga-eji mara onye chọrọ ịkwụ ụdọ ma nyere ha aka