Ụmụụwa atụkwasara ọgwụ mgbochi obi?

Nwata na-anata ọgwụ mgbochi

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ọkammụta ahụike na-ekwụ na ntụkwasị obi ndị mmadụ nwere n'Ndị ọrụ ọgwụ mgbochi na-anazị azụ.

Na nchọcha ndị ọrụ Wellcome Trust mere, ha ji ikpo mmadụ dị 140,000 sị mba dị 140 were mee ya.

Nke a mere ka ndị WHO huta ileli ọgwụ mgbọchị dịka ihe iri so na-echere ahụike mbaụwa aka mgba.

Ị ga-eji ezigbo igwe ịntaneti (nke nwere Java) ji lee atụmatụ a

News imageNews imageNews image

Wellcome Global Monitor ji ikpo mmadụ nọchitere anya mba 142 mee nchọcha gbasara: ntụkwasa obi na sayensi; ndị sayensi na okwu ahụike, ịmata ka ndị mmadụ sị ghọtatụ maọbụ nwee mmasị na sayensi na ahụike; ya na ka esi ahụ ọgwụ mgbochi.

Presentational grey line

Nyocha a gosiri na ọtụtụ mmadụ enweghị ntụkwasi obi na ọgwụ mgbochi.

Lee ihe ha zara ka ajụrụ ha ka ọ dị mma ịgba ọgwụ mgbochi:

  • 79% (ikpo asatọ na ụzọ iri) "ha ekwenyeturu ntakịrị" ka ha "ekwenyesiri ike"
  • 7% "ha ekwenyeturu ntakịrị" ka ha "ekwenyesiri ike"
  • 14% enweghị ebe ha kwụakwụ maọbụ na "ya amaghị"

Mgbe ajụrụ ha ka ọgwụ mgbochi adị ire:

  • 84% ekwenyesighi ike maọbị ntakiri
  • 5% kwenyesiri ike maọbụ jụtụ ntakiri.
  • 12% enweghị ebe ha kwụakwụ.

Kedụ ihe o ji dị mkpa?

Enwere ihe nchọcha na-enweghị mgbagha na ogwụ mgbochi bụ ụzọ ka dị ire n'igbochi ọrịa were ike igbunyu mmadụ anya dịka arụrụbara.

Nwata nwere arụrụbara

Ebe foto si, Science Photo Library

Nkọwa foto, Arụrụbara na egbunyụ mmadụ anya

Ọgwụ mgbochi azọọla ijerị mmadụ ndụ n'ụwa. O melala otu ọrịa - kitikpa - ma na-ewetakwa anyị nsọ n'imela ọrịa polio.

Mana ọrịa ndị ọzọ dịka arụrụbara sịrị ọnwụ na-alọhachite nke ndị ọkammụta sị na ọ bụ maka na ndị mmadụ enweghị ntụkwasa obi n'ebe ọgwụ mgbochi nọ, egwu na akụkọ abụghị eziokwu kpara ya.

Dọkịnta Ann Lindstrand bụ ọkammụta n'ọgwụ mgbochi nke WHO sị na ya bụ okwu taraakpụ ka ọ dị ugbua. "Agbaghị ọgwụ mgbochi na-adọhachi ịnweta ahụike zuruoke azụ na mbaụwa" .

"Any resurgence we see in these diseases are an unacceptable step backwards."

"A gaghị anabata ndọchi azụ ọbụla n'ụzọ ọbụla."

vaccine

Ebe foto si, Getty Images

Ọrịa arụrụbara alọghachitela

Mba ndị bịara nso n'ikpochapụ arụrụbara ebidola ịhụ ya bụ ọrịa ọzọ.

Ngụkọ gosiri na ọrịa ahụ ebirila ọkụ n'ihe ruru mpaghara ụwa niile ebe o ji pasentị iri atọ rịa n'afọ 2017 karịa 2016.

Eserese gosiri ebe ọrịa a kachasị efe

Ọjụjụ ịnata ọgwụ mngbochi maka ihe ọbụla na-etinye onye ahụ na ndị ọzọ na nsogbu ịbute ọrịa.

Ọtụtụ mmadụ nata ọgwụ mgbochi a, ọ ga-akwụsị ọrịa ahụ ife ndị ahụ - ihe Bekee kpọrọ "herd immunity".

Imran Khan nke Wellcome Trust kwuru: "Ọ dị anyị mkpa ugbua maka ọrịa arụrụrbara, mkpuchi ọbụla pekarịrị pesentị 95 ga-ebute ọrịa ahụ ife efe."

Kedụ ebe ntụkwasị obi kachasị pee mpe?

Ngụkọ ndị kwenyere n'ọgwụ mgbochi

Akụkọ ọma

Ọtụtụ ndị bi n'ebe ndị dị nta n'obodo kwenyere na enweghị egwu di na ọgwụmgbochi. Ọnụọgụgụ ndị dị otua karịrị na ndịda Esia ebe mmadụ dị pasentị 95 kwenyere, nakwa n'Ọwụwaanyanwụ Afrika, ebe ọnụọgụgụ ha dị pasenti 92.

Mba Bangladesh na Ruwanda fọdụrụ obere ka mmadụ nile kwere na ọgwụmgbochi enweghi egwu ọbula di na ya ma na-arụkwa ọrụ, ọnụọgụgụ ndị gbarala ọgwụmgbochi n'obodo ndị ahụ buru ibu na-agbanyeghi nhịahụ a na-enwe ime ka ha ruo ndi mmadụ aka.

Ruwanda bụ mba nke izizi na-etolite etolite mere ka ọgwụmgbochi HPV nke e ji egbochi ọria cervical cancer ruo umunwanyi obodo ahụ nile aka.

Mazi Khan kwuru: "Nke a na-egosi ihe anyi nwere ike imenwu ma anyi gbalisie ike ikwalite ọgbụgba ọgwụ mgbochi".

Gịnị mere ndị mmadụ ji atụ ụjọ?

Nwata na-anata ọgwụ mgbochi

Ebe foto si, Getty Images

Na nchọpụta ahụ, ndị nwere ntụkwasa obi n'ebe ndi dibia bekee, ndị nọọsu nakwa ndị sayentists nọ, na-aka ekwenye na onweghị egwu ọbụla dị na ọgwụmgbochi.

N'aka nke ọzọ, ndị na-ekwenyechaghị na ọgwụ bekee nakwa sayensị, anaghị ekwenye n'ọgwụmgbochị.

Akwụkwọ nchọpụta ahụ a kpọrọ 'Wellcome' agazighi nyochaba ihe kpatara ụfọdụ ekwenyeghi, ma ndị nyocha kwuru na ọtụtụ ihe nwere ike ịkpata nkea.

Ụfọdụ ịhe ndịa gụnyere obi iju oyi - ọbụrụ na orịa adịkwaghị ebe niile otu ọ dịbụ na mbụ, ọgaghịkwa echu ndị mmadụ ụra ịgba ọgwụmgbochi ọrịa ahụ.

Ọgwụ niile, tinyere ọgwụmgbochi, nwekwara nsogbu ndị ọzọ ha na-enye. Mana a na-akpachapụrụ ọgwụmgbochi anya iji hụ na ha rụrụ ọrụ nke ọma ghara imebi ahụike ndị mmadụ.

Igwe ịntanet emeela ka ikesa ozi gbasara ọgwụmgbochi dịwanye mfe, mana ọtụtụ akụkọ ndị ahụ anaghị abụcha eziokwu.

Na mba Japan, ndị ọkachamara kwuru na akụkọ e kesara nke na-ekwu na ọgwụmgbochi HPV na-ebute ọria ụbụrụisi, mere ka ọtụtụ ndị mmadụ jụ ịgba ọgwụ ahụ.

Otu ahụ kwa, na mba Frans, a kọkwara asịrị banyere ọgwụmgbochi ọria influwenza - ndị mmadụ sịrị na arụsighi ọgwụmgbochi ndị ahụ ike tupu gọọmentị agaa zụrụ ha n'ọkụ ọkụ nke mere na ha anakwaghị arụ ọrụ.

Na mba UK, akụkọ fesakwara na ọgwụmgbochi MMR na- ebute ọrịa ọtizim.

Dr Lindstrand kwuru: "Otu ihe dị mkpa iji mee ka obi sie ndị mmadụ ike n'ihe gbasara ọgwụmgbochi bụ i nwe ndị ọrụ ahụike a zụrụ nke ọma, ndị dị nkwadebe ịdụ ndị mmadụ ọdụ nke bụ eziokwu, ma nwekwaa ike ịza ajụjụ niile ndị nne na nna nakwa na obodo na-ajụ."

Onye rụpụtara ya Becky Dale na Christine Jeavans; Onye nhazi - Debie Loizou; Onye wulitere ya - Scott Jarvis na Katia Artsenkova

Akụkọ akachasị gụọ