Diet and Dementia: Etu ị ga-esi jiri chocolate na-akwụkwọ nri chụọ nsogbu ụbụrụisi

Ebe foto si, Getty Images
Ị ma nri asaa nwere ike ịnyere gị aka ịchu nsogbu ụbụrụisi ọsọ ụkwụ eru ala?
Mmadụ ijeri iri na ise n'ụwa nile gburugburu na aria ọria nsogbu ubụruisi nke na-ebute oke nchefu na nsogbu ọmụmụ ihe, tinyekwara ihe ruru mmadu ijeri iri na enweta oria a kwa afọ (WHO).
N'agbanyehi na a chọpụtala na erimeri sonyere n'ihe na-edozi ubụrụisi, mana enweghi ọmụmụ ihe ama na akwado ya.
Mmanya "Red Wine", Kọfịị, na Chọkọlet nakwa mmanya "Champagne" ewuola ewu dịka nri ebube maka ihe gbasara nsogbu ụbụrụisi.
Mana, enwere eziokwu dị n'okwu ndị a?
Ngwa gụọ ihe Sheila Dillon bụ onye ọrụ BBC chọpụtara mgbe ọ gbara ndị ọkammụta ajụjụ ọnụ maka n'ihe gbasatara okwu a .
Dịka ị ga-achọputa, nri ndị a na-enyere aka maka ọdịmma ụbụrụisi gị:
1. Nri sitere n'mmiri

Ebe foto si, AFP
Iri nri azụ juputara na ya otu mgbe maọbụ karia n'izuka na-enyere ụbụrụisi aka nke ukwu.
2. Mkpụrụ osisi "vine" na mkpụrụ ndị ọzọ yiri ya.

Ebe foto si, Getty Images
Mkpụrụ osisi dị ka "Strawberries" na "blueberries" nwere ihe na-egbochi mbido nsogbo ọmụmụ nke ụbụrụisi.
3. Ọpupa na akị dị iche iche

Ebe foto si, Getty Images
Onye n'eri nani 30mg nke akị dị iche iche, ọka,"rye", osikapa nke n'acha ncharanchara, ọka milet, ọka "oats" ma na-eri kwa "protein", "minerlas" na kwa "fibre" ka ahụta na nsobgu ụbụrụisi ga agbara ya ọsọ.
4. Ụgụ

Ọnye kwuru na ụgụ na akwụkwọ nri ndị ozo na-edozi ụbụrụisi, onye ahụ mara ihe ọ na-ekwu.
5. Vịtamịn B

Ebe foto si, Getty Images
Mkpụrụ mmadụ ole nwere ọbele nsogbu ụbụrụ isi enyere Vịtamịn B kosiri ezigbote mgbake nke ụbụrụisi.
6. I na aṅu kwa ihe ọṅuṅụ mmiri koko?

Ebe foto si, Getty Images
Koko na-adị mma maka akwara-ozi ma na-edozi kwa mkpụrụ-ndụ.
Mana cheta kwa ka i na-aṅu mmiri koko nke nwere ọbere shuga.
7. Ubebekee

Ebe foto si, Getty Images
Ihe sonyere mee ka ube Bekee na-ewu ewu n'ụwa niile bụ maka na ọ na-enyere aka maka ọ dị mma ụbụrụisi.

Ugbua odoola gị anya?
Nri ndị a niile araghị ahụ ị nweta ma enwe kwara ndị ọzọ enwereike iji gbanwe nke ị na-achọtaghi n'ogbe gị.
Ma cheta kwa, nri ndị a abụghị nani maka ụbụrụisi gị, ha na-edozi ahụ gị were mee ka ị kwụrụ chịm!

Edemede a bụ mgbanwe edemede "Diet and Dementia", nke pụrụiche nke ndị "BBC's The Food Programme" .









