Lasa fiva na Naijiria: NCDC ewepụtala ọtu gbanụ gbanụ

Lassa fever Sensitization

Ebe foto si, NCDC

Nkọwa foto, Mgbasa ozi maka lasa fiva nke ndị NCDC mere n'Ebonyi Steeti

N'aha Mịnịstrị ahụ ike, ngalaba gọọmentị na-ahụ maka mgbochi, Nigeria Centre for Disease Control(NCDC) na aha bekee ọrịa ewepụtala otu ndị ọrụ gbanụ gbanụ ma ziga ha na steeti ndị e nwere lasa fiva.

NCDC zigara ndị ọrụ gbanụ gbanụ na Ebonyi, Ondo and Edo Steeti maka ịchịkọta mbọ maka ịchụpụ ọria ahụ, ịchọ ndị hana-ndị bu ọrịa mekọrịtara, ịgwọ na ịgbochi oria ahụ.

Ha mere ka nke a pụta ihe n' akwụkwọ ozi ha zitere BBC kwuru na ha ezipula ngwa ọgwụ na-ihe ndị ọzọ eji enyere ahụ ike aka na steeti ndị ahụ.

NCDC na ndị WHO, Mịnịstrị na-ahụ maka ọrụ ugbo,na Irrua Specialist Teaching Hospitalna-ejịkọ aka ikwado ịgba ọgụ ọria lasa fiva a.

Ndị ọzọ bụkwa African Field Epidemiology Network, US Centers for Disease Control, University of Maryland Baltimore (UMB), Alliance for International Medical Action (ALIMA) na ndị ọrụ ndị ọzọ.

Akara ntụ-ntụ

Ọnụnụ ọgụgụ metụtara lasa fiva

  • Nsogbu ọrịa lasa fiva: 107
  • Ndị doro anya na ha nwere ya: 61
  • Ndị nwụrụ anwụ: 16
  • Steeti ndị nwere lasa fiva: 10
Akara ntụ-ntụ

NCDC kọwapụtakwara na kemgbe mbido afọ 2018, enwela nsogbu ọria lasa fiva otu narị na asaa n'ime steeti iri; Edo, Ondo, Bauchi, Nasarawa, Ebonyi, Anambra, Benue, Kogi, Imo na Lagos Steeti.

Tutu rue ụbọchị iri abụọ na otu ọnwa Jenụwarị, 2018, enwela ọria lasa fiva doro anya iri isii na otu nke mmadụ iri na isii bụ ndị nwụrụ anwụ.

Ndị ọrụ ahụ ike iri bụ ndị ọria nweterela na steeti anọ(Ebonyi - 7, Nasarawa - 1, Kogi - 1 and Benue - 1), ebe Ebonyi Steeti nwere mmadụ anọ bụ ndị nwụrụ anwụ.

Akwụkwọ mgbasa ozi maka lasa fiva

Ebe foto si, NCDC

Nkọwa foto, Akwụkwọ mgbasa ozi maka lasa fiva

NCDC dọra ndị ọrụ ahụ ike aka na ntị ka ha ke nkwucha na-inyocha ọrịa ahụ ọkụ ọbụla dịka ọ kwesiri.

N'ụtụtụ ụbọchị afọ, onwa Jenụwarị, gọọmentị Anambara Steeti machiri ndị mmadụ ịṅụ garị.