A na-atụ anya mpụtara ntuliaka okpuru ọchịchị e mere n'Abuja

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọrụ nchekwa dị iche iche gụnyere ndị uweojii na ndị ọrụ Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC), adọọla aka na ntị ka ọhanaeze ghara ịkpa agwa nwereike ibute ọgbaaghara dịka a na-atụ anya mpụtara ntuliaka e mere n’ime obodo Abuja n’ụbọchị Satọde 2 Febụwarị, 2026.
Onyeisi ndị ọrụ NSCDC n’Abuja bụ Olusola Odumosu dọrọ aka na ntị a ma kwuo na ndị ọrụ ya kwụrụ chịm igbochi ma megide ndị maọbụ out ọbụla chọrọ itinye ọgbaghara dịka a na-eche mpụtara ntuliaka ahụ.
Onyeisioche ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) Joash Amupitan kwuru na ha ji igwe IRev etinye mpụtara ntuliaka na webụsaịt e ji ekiri mpụtara ntuliaka.
Okpuru ọchịchị e mere ntuliaka ahụ gụnyere Abaji, Abuja Municipal, Bwari, Gwagwalada, Kuje na Kwali - a tụnyekwaara ndị isioche isii na ndị nnọchiteanya 62 nke Bekee kpọrọ councillor n'obodo 68 dị n'Abuja.
Nke a bụ ntuliaka mbụ a haziri kemgbe Onyeisiala Bola Tinubu binyere aka n'iwu ntuliaka ọhụrụ a kpọrọ Electoral Amendment Act n'ụbọchị 17 Febụwarị 2026.
Akụkọ ndị ọzọ nwereike ịmasị gị:
