Kedụ ndị bụ Ụmụ Ọma otu Amnesty kwuru na-eyi ọha egwu n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa?

Ebe foto si, Amnesty International/X/ Getty Images
Otu na-ahụ maka ikike mmadụ bụ Amnesty International ekwuola na ha achọpụtala otu ndị ojiegbe na-eyi ọha egwu na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Amnesty International kwuru nke a n'ozi ha bipụtara n'akara ọbaozi X ha n'ụbọchị Sọnde 9 Nọvemba, 2025.
Dịka Amnesty siri kwuo, ndị otu ahụ a maara dịka "ndị ojiegbe a maghị ndị ha bụ," na-akpọ onwe ha "Ụmụ Ọma" oge ufọdụ.
Otu Amnesty International kwuru na nchọcha ha gosiri na ọ bụ Ụmụ Ọma a na-akpọ 'unknown gunmen' na Bekee na-etinye aka n'omume iyi ọha egwu dị iche iche na mpaghara south-east.
N'ozi ahụ Amnesty wepụtara, ha sịrị na "Ụmụ Ọma na-awakpokarị ime obodo dị iche iche, ma na-abanye n'ụlọ ndị mmadụ ebe ha na-achọ ngwaọgụ".
Ozi ahụ gara n'ihu kwuo na Ụmụ Ọma na-awakpo ndị nche obodo ma na-ebughara ngwaọgụ ha dị iche iche.
Amnesty International kwukwara na "ọ bụrụ na Ụmụ Ọma tikaa ụlọ mmadụ, ha na-eke nwoke ọbụla ha hụrụ agbụ, jiri mma merụọ ha ahụ, ma napụkwa ha ekwentị, ego na ihe ndị ọzọ ha nwere bara uru."
Ka o sina dị, Amnesty kwara arịrị sị n'agbanyeghị arụ niile a Ụmụ Ọma na-akpa megide ndị bi na mpaghara south-east, e mebeghị ka ndị ọnọdụ ahụ metụtara nweta ikpe nkwụmọtọ.
Gịnị ka nwanne Nnamdi Kanu kwuru gbasara ebubo a?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'ozi nwanne Nnamdi Kanu bụ Kanunta Kanu bipụtara n'akara ọbaozi X ya, o boro ebubo na ọ bụ ndịagha Naịjirịa bụ Ụmụ Ọma n'onwe ha, n'ihi na ọ bụ ha na-eyi ọha egwu na mpaghara south east.
O wepụtara ihe onyonyoo gosiri mgbe ụfọdụ ndị mmadụ yi uwe njirimara ndịagha wakporo otu obodo, mụnye ụlọ ndị mmadụ ọkụ ma na-agbakwa egbe aghara aghara, dịka ha na-ekwu na ha ga-ekpochapụ obodo ahụ niile.
Kanunta dere sị: "Ọ bụ Ụmụ Ọma ka ụnụ na-ahụ n'onyonyoo a. Ndị otu a chọrọ ka ndịagha Amerịka bata na Naịjirịa iji kpochapụ ndị na-eyi ọha egwu, mana ndị okenye mpaghara ugwu na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị niile si mpaghara ahụ jụrụ ajụ".
"Kedụzịe ndị na-akwado iyi ọha egwu na Naịjirịa ma ọ bụrụ na ọ bụghị ndị a?" ka Kanunta jụrụ.
Mmadụ ndị ọzọ na-akwado nnwereonwe Biafra wepụtakwara onyonyoo dị iche iche gosiri ụlọ na ngwongwo ndị mmadụ a gbara ọkụ, bụ nke ha boro ebubo na ọ bụ ndịagha Naịjirịa mere.
Mana ụlọmgbasaozi BBC News Igbo achọpụtabeghị ma ebubo a ọ bụ eziokwu maọbụ asị.
Kedụkwanụ ndị bụ Ụmụ Ọma?
Kemgbe ọnọdụ enweghị nchekwa rịrị elu na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa, o nwebeghị otu gbara ọkpụrụkpụ a chọpụtara na aka ha dị n'iyi ọha egwu na mpaghara ahụ.
Ọnọdụ enweghị nchekwa malitere na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa n'ime afọ ole na ole gara aga, dịka ndị mmadụ kwuru na ọ bụ ndị a na-akpọ 'unknown gunmen' na-egbu mmadụ ma na-ebibikwa ngwongwo ndị mmadụ.
Ọnọdụ a kawanyere njọ oge ndị ntoroọbịa Naịjirịa mechara ngagharịiwe, a kpọrọ "End Sars" n'afọ 2020.
Mgbe ahụ, ndị ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ na-egbu ndị nchekwa ma na-anapụ ha ngwaọgụ ha.
Mana dịka oge na-aga, ha malitere ịtọrọ mmadụ, igbu ụmụ mmadụ nakwa iyi ọha obodo egwu.
Ka o sinadị BBC News Igbo enwebeghị ike chọpụta ma o nwere ihe jikọtara Ụmụ Ọma na ndị 'unknown gunmen'.








