IPOB agọnarịla Simon Ekpa dịka a mara ya ikpe ịga mkpọrọ afọ isii na Fịnland

Ebe foto si, Getty Images/Simon Ekpa/X
Otu na-azọ nnwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous people of Biafra (IPOB) ekwuola na Simon Ekpa bụ onye a tụrụ nga afọ isii na mba Fịnland abụghị onye otu ha kama na ọ bụ onye kparala ọtụtụ arụ n'ala Igbo.
Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru IPOB kwuru na ọ bụ ihe mwute na Gọọmenti Naịjirịa na ndị ntaakụkọ na-ejikọta aha Simon Ekpa na IPOB ọnụ mana sị na nwamadị a abụghị onye otu ha chaa chaa.
Ọ gara n'ihu kwuo "Anyị bụ ndị IPOB ekwuola kwa mgbe kwa mgbe ma ṅụọkwa iyi n'ụlọikpe Fịnland sị na Simon Ekpa abụghị onye otu anyị.
"Odabenyeghi aha ya n'akwụkwọ IPOB ma ọ bụ jiri ọkwa ọchịchị ọbụla na mbụ"
Emma Powerful gara n'ihu kwuo "Simon Ekpa jiri ọnụ ya kwuo n'ụlọikpe na ọ bụ onye na-eme ihe onyonyo soshal midia a kpọrọ "content creator" ma ṅụọkwa iyi imebi aha IPOB."
O kwuru na Simon Ekpa hiwere ọtụtụ otu bụ ndị o ji eme mpụ dị iche iche na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Ụfọdụ otu ndị a sị na Simon Ekpa hiwere
Ozi ahụ Emma Powerful wepụtara kwuru na Simon Ekpa hiwere otu ọjọọ ndị na-eyi egwu bụ ndị merela mpụ dị iche iche n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Ha gụpụtara otu Simon Ekpa dika;
- Biafra Government in Exile
- Biafra Liberation Army (BLA)
- Biafra Defence Force (BDF)
IPOB kwọchara aka na ụkwụ ha ma sị na o nweghi ihe jikọtara ha na otu atọ ndị a Ekpa hiwere.
N'akwụkwọ ozi ahụ, IPOB gwara gọọmenti Naịjirịa ka ọ ghara iji nga a tụrụ Simon Ekpa megharia ụlọikpe anya maka ikpe Nnamdi Kanu bụ onyendu ha na-abịa n'ọnwa Ọktoba 10, 2025.
Cheta na ụlọikpe Fịnland tụrụ Simon Ekpa nga afọ isii maka iyi ndụ egwu, ịda iwu ụtụisi nakwa nrụrụaka ọkaiwu adịgboroja.
Simon Ekpa manyere iwu ịnọ n'ụlọ (sit-at-home) kwa Mọnde ọbụla kamgbe afọ anọ ma butekwa ogbugbu narị kwuru narị mmadụ nke gụnyere ndị ọrụ nchekwa na ndị nkịtị .
Ihe Ifeanyi Ejiofor kwuru maka ikpe a mara Ekpa

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọkaiwu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Ifeanyi Ejiofor ekwuola na ikpe a mara Simon Ekpa n'ụlọikpe dị na mba Fịnland atụghị ya n'anya n'ihi na o teela o jiri ghọta njehie na atụmatụ ọjọọ ya niile gụnyere tigbuo zọgbuo na iji aghụghọ anapụ ndị mmadụ ihe.
Ejiofor kwuru nke a n'ozi o wepụtara n'ụbọchị Mọnde 1 Septemba, 2025 n'akara ọbaozi Facebook ya.
Ọ sịrị na Simon Ekpa ezoghị ebomnobi ọjọọ ya malite n'ubọchị mbụ o ji aghụghọ were ọkwa Onyeisi Obodo nke otu Indigenous People of Biafra (IPOB).
"Ma n'ihe ma na nzuzo, ọ kwadoro ụmụ mmadụ na otu ndị ebumnobi ha bụ ịkụsasị ọgụ a na-alụ maka nnwereonwe, tinye ọgbaaghara ma mee ka ala Igbo bụrụ ogige tigbuo zọgbuo, nkwafu ọbara na ebubo ụgha," ka Ejiofor boro Ekpa.
O kwuru na ụfọdụ mmadụ na-enweghị ezi nghọta jiri obi ha niile nabata oku ọjọọ Simon Ekpa kpọrọ site n'ụlọmgbasaozi dị iche iche.
Dịka Ejiofor siri kwuo, "oge ọbụla a nwụchiri ndị na-eso ụzọ Simon Ekpa, ha agaghị akpọ ya aha maọbụ otu ya bụ Biafra Liberation Army (BLA), kama ihe ha ga-ekwu bụ na ha bụ ndị otu IPOB."
Nke a ka ọ sị nyere ndị ọchịchị Naịjirịa ohere imekpa ndị na-achọ nnwereonwe aka ha dị ọcha ahụ, ma gosipụta otu ahụ ji ụzọ udo eme ihe na mbaụwa niile dịka ndị omekome.
Ọ kọwara ikpe ahụ a mara Simon Ekpa na mba na-erubeisi nye iwu obodo na ikike mmadụ dịka nke nwere nnukwu ihe ọ na-akụzi, nke bụ na o nweghị ụdị okwu asị maọbụ ụzọ aghụghọ e ji achọ "nnwereonwe" pụrụ ikpuchite otu ndị omekome a tọrọ ntọala ya n'aghụghọ, nkwafu ọbara na nduhie.
Ejiofor sịrị na ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Ekpa nọ n'ụlọnga ugbua na-ahuju anya, dịka e gburu ọtụtụ ndị ọzọ n'ụzọ iwu megidere.
Ọ sịrị na ugbua bụ oge onye niile ga-ajụ mpụ na omekome, aghụghọ na okwu asị dịka ngwaọrụ e ji achọ nnwereonwe, ma guzosie ike maka eziokwu, ikpe nkwụmọọtọ na iji ụzọ udo alụ ọgụ nnwereonwe.
Ikpe a mara Simon Ekpa bụ mmeri megide iyi ndụ egwu – Gọọmenti Naịjirịa

Ebe foto si, Mohammed Idris, Simon Ekpa/X
Gọọmenti Naịjirịa akọwaala ikpe a mara Simon Ekpa na mba Fịnland maka iyi ndụ egwu dịka "mmeri gbara ọkpụrụkpụ" megide iyi ndụ egwu.
Minista na-ahụ maka mgbasaozi na nduziuche ọhanaeze na Naịjirịa bụ Mohammed Idris kwupụtara nke a n'akara ọbaozi X ya n'ụbọchị Mọnde 1 Septemba 2025.
Idris kwuru nke a dịka ọ na-egosipụta ka obi dị ya gbasara mkpọrọ afọ isii Ụlọikpe Päijät-Häme tụrụ Ekpa n'ụbọchị Mọnde.
"Anyị nabatara ozi na-ekwu na ụlọikpe mba Fịnland amaala Ekpa ikpe ma tụọ ya mkpọrọ afọ isii n'ihi ebubo ndị metụtara iyi ndụ egwu".
"Nke a bụ mmeri gbara ọkpụrụkpụ nye ndị Naịjirịa n'agha ha jikọtara aka na-ebuso iyi ndụ egwu," ka Idris kwuru n'ozi ahụ o bipụtara.
A chọpụtara na aka Simon Ekpa dị n'omume iyi ndụ egwu, ịkpalite ọhanaeze ịkpa arụ dị iche iche maka iyi ndụ egwu, itinye aka na mpụ ụtụisi na imegide iwu na-achịkọta ndị Ọkaiwu.










