A tụọla Simon Ekpa mkpọrọ na mba Finland maka iyi ndụ egwu na Naịjirịa

Simon Ekpa bụ onye ndọrọ ọchịchị bi na Finland ma na e boro ya ebubo ịkwado iyi ndụ egwu na Naịjirịa

Ebe foto si, Simon Ekpa/X

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọikpe Päijät-Häme dị na mba Finland atụọla nwafọ Naịjirịa bụ Simon Ekpa nga afọ isii maka ime mpụ iyi ndụ egwu na ihe ndị ọzọ.

Ekpa bụ onye dị afọ iri anọ (40yrs) nọchiri anya otu National Coalition Party n'obodo Lahti Finland dịka onye ndọrọ ọchịchị.

Mana e boro ya ebubo isonye n'omume na-eyi ndụ egwu nakwa ịkpalite iyi ndụ egwu na Naịjirịa.

Ebubo ndị ahụ metụtara otu Biafra dị n'Ọwụwa Anyanwụ nke Naịjirịa, ebe a mụrụ ya. Ihe butere Ekpa na mba Finland bụ asọmpi egwuregwu Atiletik e mere n'afọ 2007 ebe o mechara bụrụ nwafọ mba Finland ma birizie ebe ahụ.

Pịa aka ebe a ka i soro Whatsapp Chanelụ anyị
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro Whatsapp Chanelụ anyị

Ebe ụlọikpe gbakwasịrị ụkwụ maa Ekpa ikpe

Ụlọikpe a kwuru na Ekpa kwadoro ka mpaghara Biafra nwereonwe ya site n'ụzọ megidere iwu malite n'afọ 2021 ruo 2024.

Ụlọikpe kwuru na Ekpa bunyere otu a hụtara dịka ndị na-eyi ndụ egwu egba na ngwaagha, ogbunigwe site na mmekọrịta ya na ha.

Ha kwuru na Ekpa nọ na mba Finland na-edu otu IPOB na-achọ mnwereonwe n'ọkwa praịm mịnịsta nke 'exiled government of the Republic of Biafra'.

Ha gara n'ihu kwuo na Ekpa n'onwe ya nakwa site n'enyemaka ndị ọzọ hiwere otu na-eyi ndụ egwu, bunye, nye ha iwu ma zụtara ha ngwaagha.

Iji maa atụ, ndị na-ama ya ikpe kwuru na Ekpa bipụtara ozi n'akara soshal midia X ebe ọ kpọrọ ndị ọchịchị na ndịagha Naịjirịa ndị na-eyi ndụ egwu ma kwuo na Biafra ga-ebu agha megide ha site n'igbusi ha ma gbochie ha ịbanye na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

E kpere ikpe ahụ ugboro iri abụọ na abụọ malite n'ọnwa Mee 30 ruo na Juun 25, 2025. Ndị Ọkaikpe atọ lebara anya n'ikpe ahụ ma kwekọrịtaa na mkpebi ha nwere ịtụ Simon Ekpa nga afọ isii.

Etu e si jide Ekpa

N'ọnwa Nọvemba afọ 2024 ka ndị ọchịchị na mba Finland nwuchiri Simon Ekpa na mmadụ ise ndị ọzọ maka ebubo iyi ndụ egwu.

Ụlọikpe Päijät-Häme nyere iwu ka a kpọchie Ekpa na nga ruo mgbe a ga-ekpecha ikpe ya n'ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpali mmụọ ndị mmadụ iyi egwu.

Ụlọikpe kwuru Ekpa na-eji soshal midia na-agbasa akụkọ ụgha maka mwereonwe.

A sị na mgbe o mere mpụ ndị ahụ malitere n'ọnwa Ọgọst afọ 2021 na ebe ọ nọ mee mpụ ndị a bụ n'obodo Lahti nke Fịnland.

Ihe i kwesịrị ịma maka Ekpa?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Simon Ekpa bụ nwafọ Ebonyi Steeti dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa onye na-eme egwuregwu ịgba ọsọ nke ogogo 100m sprint.

Ọ nọchiri anya Naịjirịa n'asọmpi ịgba ọsọ nke African Championship nke ndị n'okpuru afọ iri abụọ, ebe ọ mabutere ọlaọcha n'asọmpi ịwụli elu a kpọrọ 'Triple and long jump.

Ọ gara mba Fịnland n'afọ 2009 maka ịnọchiteanya Naịjirịa n'egwuregwu mbaụwa

O merụrụ ahụ n'ikpere bụ nke mere ka ọ kwụsị ime egwuregwu ịwụli elu.

Na Fịnland, Ekpa lụrụ otu nwaanyị onye mba ahụ bụ Marianne Säkäjärvi, ha mụtara otu nwa nwoke tupu ha agbaa alụkwaghịm.

Simon Ekpa banyere otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'obodo Lahti ma bụrụ onyendu 'Municipal Council' n'otu National Coalition Party (NCP) bụ pati nọ n'ọchịchị na mba ahụ.

Simon Ekpa bụ onye na-eso ụzọ Nnamdi Kanu bụ onyendu otu IPOB na-achọ mnwereonwe Biafra.

Ọ bụ Nnamdi Kanu mere ka Ekpe bụrụ onye a ma ama n'ọchịchị mnwereonwe Biafra, Kanu kwuru ka Ekpa nọchie anya ya n'ịgbasaozi banyere Biafra mgbe a jidere n'afọ 2021.