Simon Ekpa: Gọọmentị mba Finland asaala 'Chief of Defence Staff' okwu

Ọkọlọtọ mba Finland na Simon Ekpa

Ebe foto si, Getty/Simon Ekpa

Gọọmentị mba Finland asaala Chief of Defence staff bụ Christopher Musa okwu o kwuru si jụọ mba ahụ ihe mere ha ji ekpuchi Simon Ekpa.

N'ozi ha ziteere BBC Igbo, ha kwuru na anya ha dị n'ihe niile na-eme na mpaghara ọwụwa anyanwụ ma na-akatọ ya.

Ozi ahụ kwuru "Finland na-akatọ mwakpo na ọgbaghara, mmaja mmadụ nakwa ịkwanye ndị mmadụ n'ọgbaghara n'ụzọ ọbụla o si bịa".

Ihe ọzọ dị n'ozi ahụ nke si na Ministrị mmekọ mba ha na mba ndị ọzọ bụ na ha bụ Finland nakwa ala Naịjirịa amalitela mkparịtaụka maka okwu Simon Ekpa ma kwuo na ha abụọ na-akpakọ maka okwu ahụ.

"Ikwu hoo haa gbasara 'Sit-at-home', anyị kwadoro ikike ime ngagharị iwe n'ihi na ọ dị mkpa n'ọchịchị onyekwuouche ya mana ihe anyị akwadoghi bụ nsogbu, mmaja, ọgbaghara n'ụzọ ọbụla chaa chaa. Ndị mmadụ kwesiri ịnwe ikike ịme ihe sọrọ ha mgbe ọbụla.

Cheta na Christopher Musa rụrụ mba Finland aka sị na ha na-abanyere Simon Ekpa aja n'ukwu.

Musa gara n'ihu kwuo na Ekpa na-emebisi ọrụ ha na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

O kwuru nke a mgbe ọ na-aza oku ndị ụlọomeiwu ukwu kpọrọ ya na ndị isi ọrụ nchekwa ibe ya gbasara ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.

Simon Ekpa: Ihe 'Chief of Defence Staff' kwuru maka Ekpa na Gọọmentị Finland

Onyeisi ndị ọrụ nchekwa Naijiria, (Chief of Defence Staff) bu Christopher Musa arụọla mba Finland aka sị na ha na-abanyere onye ndu alaka otu Ipob kpọrọ onwe ha 'Autopilot' bụ Simon Ekpa aja n'ukwu.

Musa, onye kwuru na ọ bụ Simon Ekpa ka a na-arịa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiria sịrị na mkpamkpa ọ na-akpa na mpaghara ahụ na-aga n'ihi n'ihi na mba Finland na-aja ya ike.

CDS Christopher Musa, Simon Ekpa

Ebe foto si, Nigeria Govt/Simon Ekpa

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Simon Ekpa akpọọla oku nọrọnụlọ ọtụtụ mgbe nke metụtara ngagaghị nakwa azụmahịa dịka ụfọdụ jiri egwu nọrọ n'ụlọ , ebe ụfọdụ ndị mmadụ zuterela ọnwụ n'aka ndị e chere na-eso ya na-amanyere ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ.

N'okwu ya dịka ọ na-agwa ndị Ụlọnnochiteanya okwu banyere ọnọdụ enweghị nchekwa na Naijiria ụbọchị Tuzde, Musa sịrị, "N'Ọwụwa Anyanwụ, Simon Ekpa bụ ihe a na-arịa n'obodo."

"Naijiria ga-ama ihe a ga-eme ya, Ọ na-eme ka o si sọ ya n'ihi na ha(Finland) na-aja ya ike."

"Okwu ya na omume Ekpa ebutela ọkwụ ọtụtụ ndị mmadụ na mpaghara ahụ."

"Okwu na Omume ya na-ebute ihe na-akpọtụ na Naijiria."

Musa, onye sịrị na ọ dị mkpa ka a kpọọ onye nnọchiteanya mba Finland na Naijiria oku maka ya, gara n'ihu kwuo, "Ọ na-emebiri anyị ihe,okwu ya ebutela ogbugbu ọtụtụ ndị mmadụ."

N'okwu Boko Haram, Musa boro ebubo na site ụfọdụ ndị ọrụ mkpọrọ, enyere ndị Boko Haram e ji eji aka ha si n'ụlọmkpọrọ ahazi mwakpo na ụfọdụ mpaghara Ugwu Naijiria.