Etu Minista si kpụpụ di na nwunye ụlọikpe n'Enugwu dịka nwaanyị gbara nkịtị di ya na-emetọ nwa ha nwaanyị

Ebe foto si, Uju Ohanenye/BBC
Minista na-ahụ maka ụmụ nwaanyi bụ Uju Ohanenye akpụpụla dị na nwunye ụlọikpe n’Enugwu maka imetọ nwa ha gbara afọ itoolu
N'akwụkwọ e jiri gbaa di na nwunye ahụ akwukwo n'ụlọikpe 'Enugu State High Court' n'abalị 17 nke ọnwa Novemba ka ha wepụrụ ikpe ahụ ụlọ ikpe. nke akara ya bụ 'Suit No E/987/2023' nke agbara, ebubo a na-ebo ha bụ na, n'agbata otu afọ na ọnwa isii site Janụwari 2022 rue June 2023, ka di nne nwata ahụ( step father) - anyi akpọghị aha di na nwunye ahụ maka nchekwa ha- malitere wakpowa nwatakiri ahụ n’ụlọ ha dị n' Onoh Crescent GRA, Enugwu.
E so kpupụ nne mụrụ nwata ahụ ụlọikpe n’ihi na naoge ọ matara na di ya na-emetọ nwaanyi ya, echekwaghị nwa ya nwaanyị na-agbanyeghị na ọ gbara naanị afọ itoolu.
Dọkinta nyochara nwata ahụ bụ Dkta Samuel Ndukwe nke ụlọọgwụ ndị Uweojii 'Police Clinic Enugwu kwuru nchọpụta gosiri na a akwasola nwatakịrị ahụ ikọ n’ike ugboro ugboro dịka o gosiri n’ahụ ya.
Onye ọkaiwu na-ekwuchitere Mịnịsta Uju Ohanenye bụ Chuma Oguejiofor kwuru na ebumnobi ikpe ahụ bụ iji chekwaa ikike dirị nwatakiri ahụ dịka mmadụ, nakwa igosi na akparamagwa ahụ bụ nke kwesiri ka a taa ndị niile aka ha dị na ya nnukwu ahụhụ.
Minista Ohanenye kwuru na ihe na-ewute ya bụ na kemgbe e jidechara di na nwunye ahụ ma hapụ ha, ha kpọkwara nwatakiri ahụ laghachi ọzọ n’ụlọ ha ga biri.
“E kwesiri ka ha na nwatakịrị ahụ ghara ibikwa ọzọ ma ọ bụ nwee mmekọ ọbụla ganye na o ruo afọ ogụ na otu.
Minista ahụ rịọkwara ụlọikpe ka ọ kpọnye ha nwa hụ ka ha zụba ma mee ka nne na nna ya kwụọ ya ego iti aka n’obi ga-adị nde naira iri (10million naira) nke bekee kpọrọ, “Damages”.














