Ọ bụ eziokwu na a hụrụ ozu mmadụ 322 n’otu ili n’Anambra Steeti? Lee ihe anyị ma

Ebe foto si, Bianca Ojukwu/Getty Images
Nwunye Odumegwu Ojukwu, onye ndu ndịagha Biafra bụ Bianca Ojukwu ekwuola na akụkọ ahụ na-efegharị nke kwuru na ha a chọpụtara ozu mmadụ 322 e liri n’otu ili n’Anambra Steeti bụ asị.
Bianca bụ onye odeakwụkwọ otu na-ahụ maka udo, ikpe ziri ezi na eziokwu a kpọrọ 'Truth, Justice and Peace Commission (TJPC)" n’Anambra Steeti kwuru na ọ bụ eziokwu na a hụrụ ili ebe a na-eli ozu ndị mmadụ.
Kama na ọnụọgụgụ ozu ndị a hụrụ n’ili ahụ abụghị 322 nke ọtụtụ ụlọ ntaakụkọ na-agbasa n’ozi ha ugbua.
O kwuru na a mabeghi kpọmkwem ozu mmadụ ole nọ n’ili ahụ ha chọpụtara maka na a ga-eme nyocha a kpọrọ ‘forensic’ iji mata nke a.
O kwuru na onweghi mgbe a hụrụ ozu mmadụ 322 n’ili ahụ dịka akụkọ si na-efegharị na soshal midia kama na ọnụọgụgụ ahụ bụ nke ndị a chọpụtara nwụrụ n’ihi tigbuo zọgbuo n’Anambra steeti.
Bianca gara n’ihu kwuo na ọnụọgụgụ ahụ bụ dịka ndị mmadụ ha jụrụ ajụjụ si gbaara ha akaebe.
O kwuru na a ka nwere ọtụtụ mmadụ ndị a na-amabeghi ebe ha nọ ugbua, kama na mmadụ 18 bụ ndị a sị a na-achọ achọ ugbua.
Ọ kpọkuru ọhanaeze nakwa ezinaụlọ dị iche iche n’Anambra na ọ bụrụ na o nwere ndị na-achọ nwanne ha maọbụ onye ezinaụlọ ha ka ha biko kpọtụụrụ ndị otu a.
Otu a gara n’ihu dọọ ndị mmadụ aka na ntị ọkachasị ndị ụlọọrụ mgbasaozi ka ha mee nyocha ma chọpụta nke bụ eziokwu tupu ha na-agbasa akụkọ ka ha ghara iduhie ndị mmadụ.
Ihe i kwesịrị ịma maka otu TJPC

Ebe foto si, Bianca Ojukwu
- Otu a kpọrọ ‘Truth, Justice and Peace Commission (TJP)’ bụ nke Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra Steeti hiwere n’ọnwa Juun 2022.
- Ndị so n'otu a gụnyere ọkammụta Chidi Odinkalu, bụ onyeisi ha, Bianca Odumegwu Ojukwu bụ odeakwụkwọ ha nakwa ndị ọzọ so ha arụ ọrụ.
- Ọrụ ha bụ ime nyocha banyere ọgbaghara na tigbuo zọgbuo dapụtara n’ihi ọchịchị nwereonwe n’Anambra Steeti.
- Otu a mere nyocha site n’ịgba ndị mmadụ, ndị obodo nakwa ụlọọrụ dị iche iche ajụjụ ọnụ ma chọpụta na mmadụ 322 anwụọla site na tigbuo zọgbuo dị iche iche dapụtara na steeti ahụ.
- Ha chọpụtakwara na enwere ili ebe a na-eli ozu ndị mmadụ na steeti ma chọpụta na ọtụtụ ndị mmadụ na-efu efu.
- Nke a mere ha jiri hiwe kọmitii a kpọrọ ‘Bureau of missing persons’ bụ ndị ga-eleba anya maka ịchọta ndị furu efu.
Cheta na kamgbe afọ ole ma ole gara aga ka ọnọdụ nchekwa malitere ịkawanye njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nke Anambra steeti so na ya.
Nke a butere ogbugbu ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa na ndị nkịtị, ntọrị ọtụtụ mmadụ nakwa ịla akụnaụba n'iyi.
Gọvanọ Soludo dịka gọvanọ ndị ọzọ na mpaghara a na-agba mbọ ịhụ na ezi nchekwa lọghachịrị na steeti ya, nke otu n'ime ihe ndị o mere bụ ihiwe otu TJPC.









