Sit-at-home: Etu ekpere si aga maka mpịachi 'sit-at-home' n'Anambra

Ndị ụlọụka Katọlik nakwa Anglikan malitere ikpe ekpere maka mpịachi atụmatụ onye apụla ezi kwa Mọnde ọbụla n'Anambra Steetị.
Nke a mere n'ụlọụka St. Patrick Katọlik dị n'Awka nke Bishọp Awka Dayọsis bụ Paulinus Ezeokafor haziri.
Ndị ụka a nọ na-agagharị na mbaraezi ime ụlọụka na-ekpe ekpere maka udo, nchekwa nakwa ọganihu Anambra Steetị.

Ha rịọkwara ka Chineke nye gọvanọ ha bụ Chukwuma Soludo amamihe ịchị Anambra ọfụma.
Ndị ụlọụka ọzọ kpekwara ekpere a bụ St. Faith Cathederal nke Anglikan dị n'Akwa mana ha malitere n'elekere iri nke ụtụtu ma mechie tupu ọ na-akụ elekere iri na abụọ.

Etu Anambra dị n'ụbọchị 4 Eprel a sị ka akwụsị atụmatụ a.

Site n'oku gọvanọ Anambra Steetị bụ Chukwuma Soludo kpọrọ ka a kwụsị atụmatụ onye apụla ezi na steeti ahụ malite taa bụ 4 Eprel, 2022.
BBC Igbo kpaghara n'Anambra ịchọpụta ma ndị mmadụ ọ na-erubeisi maọbụ na-enupuisi n'oku ahụ Soludo kpọrọ.


Ebe mbụ a gara ụlọọrụ ndị gọọmentị a kpọrọ Jerome Udorji dị n'Awka n'elekere itoolu nke ụtụtụ.

Ọtụtụ ọnụ ụlọọrụ gbachiri agbachi dịka ndị ọrụ Bekee na-abịa ọrụ obere obere.
Ebe ọzọ anya BBC Igbo ruru bụ n'ahịa a ma ama bụ Eke Awka dị n'isiobodo Anambra Steetị.

Ụfọdụ ụlọahịa ndị dị n'ime ahịa Eke Awka mepere emepe, ebe ọtụtụ ndị na-ere ahịa okporoụzọ na ndị ahịa mbugharị pụtara.

Onye ntaakụkọ anyị gakwa ebe a na-akpọ 'Unizik Temporary Site' dị n'Awka ma chọpụta ndị mmadụ na ndị ọgbatumtum keke na-agagharị.

Ihe ọzọ bụ na ọdọụgbọala ebe ndị mmadụ si eme njem gbara chakoo dịka o nweghi ụgbọala e ji eme njem a hụrụ ebe ahụ.

Onye ntaakụkọ gara n'ihu kwuo na ekpere bụ gọvanọ Soludo sị ka e mee taa ga-amalite n'elekere iri na otu nke ụtụtụ
Etu Soludo chọrọ iji akwụsị iwu onye apụla ezi

Ebe foto si, Facebook/Soludo TV
Gọvanọ na-achị Anambra Steetị bụ Chukwuma Soludo ekwuola na otu Indigenous People of Biafra (Ipob), ndị ndu obodo nakwa ndịisi ụlọụka kwadoro ya ka e kpochapụ atụmatụ 'sit-at-home'.
Soludo kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ na Channels TV n'abalị ụbọchị 3 Eprel 2022 banyere ọnọdụ nchekwa na etu ọ ga-esi rụọ ọrụ.
N'okwu ya "ihe mbụ chere Naịjirịa, Ọwụwa Anyanwụ nakwa Anambra aka mgba bụ nchekwa mana anyị na-eleba ya anya n'ụzọ pụrụiche."
"anyị amalite ịkpọku nakwa ịkparịtaụka n'etiti ndị o metụtara maka na ihe niile abụghị ihe a na-emeta n'ụzọ ikike".
"Anyị akagbuola atụmatụ ịnọ n'ụlọ dịka ndị ndu obodo, ndịisi ụlọụka, ndị Ipob na ndị ọzọ kwadoro anyị n'atụmatụ ahụ."
Soludo sị malite taa bụ Mọnde 4 Eprel, 2022 na a ga-enwe ọgbakọ ekpere n'ụlọụka niile dị n'Anambra nakwa Ọwụwa Anyanwụ iji kagbuo atụmatụ 'sit-at-home'.

Ebe foto si, Soludo TV
Ọ sị na o doro ya anya na ụfọdụ ndị ekperima ga-esepụta igbochi atụmatụ a mana ọ gaghị ekpochi ha agala n'ihu.
Cheta na gọvanọ Soludo haziri ọgbakọ ndị ndu nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Anambra Steetị n'ụbọchị Satọde 2 Eprel maka nchekwa.

Ebe foto si, Soludo TV
N'ọgbakọ ahụ, o wepụtara ụfọdụ atụmatụ ọchịchị ya ga-esi kwụsị iwu onye apụla ezi nke metụtara nchekwa n'ebe ọ dị ukwuu.'
Atụmatụ ndị a gụnyere; Ndị ụka inwe ọgbakọ ekpere n'elekere iri na otu nke ụtụtụ ụbọchị Mọnde, iji gosipụta na 'sit-at-home' abịala n'isi njedebe.
Etu mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ndị ọzọ dị
BBC Igbo kpagharịrị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ndị ọzọ dịka Imo, Ebonyi, Enugwu nakwa Abia ị chọpụta ka ihe si kwụrụ ebe ndị ahụ.
Imo Steeti

Ndị mmadụ apụtaghị ezi na mpaghara Owerri dị iche iche dịka okporoụzọ si Owerri gawa Okigwe.

Ebe ọzọ bụ okporoụzọ Wetheral, MCC ebe ụlọahịa, ụlọakụ nakwa ụlọakwụkwọ na-emepeghi emepe.
N'Abia

Ụfọdụ ndị rubereisi n'iwu ahụ ebe ụfọdụ ndị gawara mkpa dịịrị ha.

Ụfọdụ ọdọahia mechiri kpamkpam ebe ụfọdụ n'ime ha mepere n'Umuahia bụ isiobodo Abia Steeti.
Ebonyi Steetị

Azụmaahịa, ụlọakwụkwọ, ụlọakụ mepechara emepe na mpaghara Abakaliki bụ isiobodo Ebonyi Steetị.

Ndị ọkwọ ụgbọala, ndị ọgbatumtum na ndị ji ụkwụ na-aga mkpa dịịrị ha.
N'Enugwu
Onye ntaakụkọ BBC Igbo kpagharịrị na mpaghara dị iche iche n'Enugwu ma chọpụta ọtụtụ ebe niile gbara chakoo.
Gịnị butere atụmatụ onye apụla ezi?

Atụmatụ onye apụla ezi a na-akpọ 'sit-at-home' bụ iwu otu na-achọ nwereonwe Biafra bụ hiwere iji gosi ndị Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kwadoro ihe ha na-eme.
A na-emekaarị otu ụbọchị kwa afọ n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee ji kwanyere ndị nwụrụ n'oge agha Biafra ugwu.
Mana kamgbe gọọmentị Naịjiria nwuchigharịrị Nnamdi Kanu bụ onye ndu ha, Ipob meziri ka iwu ahụ bụrụ ụbọchị Mọnde ọbụla nakwa ụbọchị Kanu ga-aga n'ụlọikpe.
Mana Kanu nyere iwu site n'ọnụ ọkaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor sị ka Ipob kagbuo nke ụbọchị Mọnde, bụ nke ha mere.
Mana ndị mmadụ ka na-aga n'ihu ịnọ n'ụlọ kwa Mọnde bụ ọtụtụ n'ime ha sị na egwu ịpụta ezi na-atụ ha maka na ndị oji egbe egbuola ọtụtụ ndị pụtara ezi n'ụbọchị ndị ahụ.









