Anambra Sit at Home: Onitsha 'Main Market' o mepere taa bụ Mọnde? Lee ihe anyị hụrụ

Onitsha Main Market dịka ebe agbara ọsọ n'ụtụtụ taa bụ Monde, March 28, 2022.
Ndị ahịa apụtaghị maọlị belụsọ ndị mmadụ na-agara onwe na nke nke n'okporoụzọ.
Ọdọ ụgbọala ebe ndị ọkwọ ụgbọala na-eme njem aga-ebe dị iche iche n'ala Igbo mechichara emechi.
Okporoụzọ Upper Iweka na-ekwokarị ekwo dịka ebe ndị mmụọ chụsasiri ndị mmadụ ọsọ makana ị ga-agụtalị mmadụ olemole nọ ebe ahụ n'ụtụtụ taa.
Nke a na-abịa agbanyeghị nzukọ ndị isi ahịa na aka na-achị anambra steeti bụ Charles Soludo nwere n'izu ụka gara aga.
Na nzukọ ahụ, ha kwekọrịtara na ndị ahịa ga-emepe ahịa ụbọchị Mọnde ọbụla agbanyeghị na ndị mmadụ na-anọbụ n'ụlọ ụbọchị ahụ.
Lee ụfọdụ foto anyị setere ebe ahụ.


Ọdọ ụgbọelu dịketere Upper Iweka dị n'Onitsha tọgbọọ chakoo


N'Awka
Na Jerome Udorji ebe Secretariat nke Anambra steeti dị , onye ntakụkọ anyi hụrụ ndị ọrụ ka na-abịa edenye aha ma tụgharịa azụ lawa.

Lee ka ihu na anya dị ụfọdụ ebe n'Awka dị n'Anambra steeti.

Ndị na-akwọ ụgbọala ndị ọrụ ji aga ọrụ na secretariat apụtaghị bia buru ụgbọala kwọga ndị ọrụ n'ụtụtụ a.

Ọtụtụ ọdọ ụgbọala tọgbọkwa chakoo agbanyeghị na ndị ọkwọ ụgbọala biara ya bụ nzụkọ gọvanọ Soludo na ndị ahịa mere.

Anambra steeti Judiciary dị n'Awka tọgbọọ chakoo.

A hụghị kama otu onye ebe ahụ.

A hụtụrụ mmadụ n'Aroma junction.

Ndị mmadụ apụtaghị etu ha si apụtabu n'Eke Awka n'ụbọchị ndị ọzọ.


Unizik Junction Awka

N'Abakaliki dị n'Ebonyi steeti,

Ndị ọgbatum tum na-agagharị mana ahụghị ndị na-eme njem tere aka na-agba n'ụzọ taa.


N'Enugu,
Ọtụtụ okporoụzọ dị n'Enugu tọgbọọ chakoo dịka ndị mmadụ nọ n'ụlọ taa bụ Mọnde March 28, 2022.


N'Umuahia, okporoụzọ Akara - Uturu n'okpuru ọchịchị Ovim Isuikwuato dị n'Abia steeti.


Okporoụzọ Osusu a na-esi aga Faults, ahia Ariaria nakwa ebe a na-esi amapụta okporoụzọ Port Harcourt na Enugu tọgbọọ chakoo.

Ebe foto si, BBC

N'Owerri dị n'Imo steeti,

Ụlọahịa ndị dị n'okporoụzọ Wethral dị n'Owerri mechichara emechi.

Gịnị butere 'sit at home' ndị Ipob hibere?
Ndị otu Ipob malitere ịnọ n'ụlọ ha kpọrọ 'sit at home' mgbe gọọmentị etiti Naịjiria nwụchiri Kanu bụ onyendu ha, n'afọ 2021.
Ha tinyere ya bụ ịnọ n'ụlọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiria iji gosi nkwado ha maka ikpe Kanu.
N'afọ 2021, ha tinyere ya bụ ịnọ n'ụlọ kwa Mọnde ọbụla, mana ha mechara na-eme ya mgbe ọbụla Kanu kwesịrị ịpụta n'ụlọikpe.
Cheta na gọọmetị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu bụ onye ndụ otu Ipob na na mba Kenya n'afọ 2021 ebe ọ gbara ọsọ n'afọ 2017 mgbe ndị agha Naịjirịa wakporo ụlọ ya n'Afaraukwu Abia steeti.
Kamgbe e si mba Kenya kpọlata ya Naịjirịa, a na-ekpe ya ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu nke gọọmentị Naịjirịa na-ebo ya.









