Nnamdi Kanu trial: Etu o si aga n'Ọwụwa Anyanwụ taa

Awka

Ebe niile tọgbọrọ chakoo ọzọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwu taa maka atụmatụ 'sit at home' nke ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) hibere.

Atụmatụ nọrọ n'ụlọ ahụ bụ maka ikpe onye ndu ha Nnamdi Kanu nke gọọmentị etiti nwụchiri ma na-ekpe ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu.

Ọtụtụ ndị mmadụ gwara BBC na ha apụtaghị ezi chacha maka egwu ihe nwereike ime ha ma ha pụta ezi.

Nke a bụ maka na ndị na-amanye ịnọrọ n'ụlọ egbuola ọtụtụ ndị mmadụ na mbụ ma gbakwa ngwaahịa ndị mmadụ ọkụ iji manye iwu ịnọrọ n'ụlọ.

Agbanyeghi na ndị isi otu Ipob bụ ndị na-achọ nnwereonwe Biafra ekwuola na ha anaghị amanyezi ịnọ n'ụlọ ha kpọburu ma gọọkwa na ha agaghị akpọkwa ọzọ, ndị mmadụ ka na-erube isi ịnọ n'ụlọ.

Nke izu a bụ nke ha sị aga-eji ụbọchị atọ wee manye site Monde 17 Jenụwarị ruo Wenezde 19 Jenụwarị, 2022.

Ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) hibere ịnọrọ n'ụlọ maka ụbọchị ọbụla aga-ekpe ikpe Nnamdi Kanu n'Abuja.

Ndị ntaakụkọ BBC gagharịrị mpaghara dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ, wee hụ na ọtụtụ ụlọahịa, ọdọmmanụ ụgbọala, ụlọakwụkwọ, ụlọakụ na ebe ndị ọzọ emepeghi.

Ụfọdụ ndị a gbara ajụjụ ọnụ n'Abịa steeti kwuru sị na e mechiri ụlọakwụkwọ n'ihi ya bụ 'sit at home', ndị ọzọ kwuru na ha agaghịdị ekwe ụmụ ha pụọ n'ụlọ taa.

Etu o si aga n'Ọwụwa Anyanwụ n'ụbọchị 18 nke ọnwa Jenụwarị 2022

N'Anambra steeti

Awka
Nkọwa foto, Ndị njem ji ụkwụ na-aga n'ihi na ọtụtụ ụgbọala anọghị n'ụzọ, n'Aroma Junction
AWKA
Nkọwa foto, Ụlọahịa emepeghị n'Awka
Awka
Nkọwa foto, Ọdọmmanụ ụgbọala emepeghị n'Awka
Unizik Temporary Site Junction
Nkọwa foto, Ụzọ Unizik Temporary Site Junction tọgbọ chakoo

N'Abịa steeti,

Umuahia
Nkọwa foto, A gbachiri ọdọụgbọala Umumass dị n'ụzọ Umuwaya, n'Umuahia
City Center Umuahia
Nkọwa foto, Ụzọ City Center tọgbọ chakoo
Ụzọ
Nkọwa foto, Market Road dị n'Umuahia tọgbọ chakoo dịka ọdọmmanụ ụgbọala kpọchiri akpọchi

N'Imo steeti,

Tetlow Road
Owerri
Nkọwa foto, Ụlọahịa mechichara emechi n'Owerri
Owerri
Nkọwa foto, Ọdọmmanụ ụgbọala mechiri emechi n'Owerri
Wetheral Road dị n'Owerri
Nkọwa foto, Wetheral Road dị n'Owerri tọgbọkwa chakoo

N'Ebonyi,

Ebonyi state University
Nkọwa foto, Ụmụakwụkwọ mahadum Ebonyi steeti abịaghị akwụkwọ
Abakaliki
Nkọwa foto, Ụzọ tọgbọ chakoo n'Ebonyi
Ọdọmmanụ ụgbọala

N'Enugwu steeti

Otigba Junction
Nkọwa foto, Ụzọ Otigba Junction tọgbọ chakoo
Ụzọ Enugwu
Enugwu

Gịnị butere 'sit at home' ndị Ipob hibere?

Ndị otu Ipob malitere ịnọ n'ụlọ ha kpọrọ 'sit at home' mgbe gọọmentị etiti Naịjiria nwụchiri Kanu bụ onyendu ha, n'afọ 2021.

Ha tinyere ya bụ ịnọ n'ụlọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiria iji gosi nkwado ha maka ikpe Kanu.

N'afọ 2021, ha tinyere ya bụ ịnọ n'ụlọ kwa Mọnde ọbụla, mana ha mechara na-eme ya mgbe ọbụla Kanu kwesịrị ịpụta n'ụlọikpe.

Cheta na gọọmetị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu bụ onye ndụ otu Ipob na na mba Kenya n'afọ 2021 ebe ọ gbara ọsọ n'afọ 2017 mgbe ndị agha Naịjirịa wakporo ụlọ ya n'Afaraukwu Abia steeti.

Kamgbe e si mba Kenya kpọlata ya Naịjirịa, a na-ekpe ya ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu nke gọọmentị Naịjirịa na-ebo ya.

Ihe ndị Igbo welitere isi na-ekwu maka atụmatụ 'sit at home'

'Ipob bikonu ka anyị were ụkwụ chọwa ihe anyị dabara na mmiri' - MbazulikeAmaechi

ws_programme_1024.jpg

Mbazuluike Amaechi bụ otu onye na ndị so Zik zọta nwereonwe Naijiria ma bụrụkwa mịnịsta njem ụgbọelu mbụ na Naịjirịa kwuru na atụmatụ 'sit at home' na-emebi akụnaụba ala Igbo.

Ka ọ na-akatọ ya bụ atụmatụ, o kwuru na o nwere ike imebi mkparịtaụka na-aga n'ihu maka ntọghapụ onye ndu Indigenous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu.

Ọ gwara BBC Igbo na ọ kpokuola ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor ma kọwara ya mwute ya gbasara etu ụfọdụ ndị kpọrọ onwe ha ndị Ipob si akpa mkpamkpa n'ala Igbo.

Ọ gara n'ihu rịọ ndị otu Ipob arịrịọ ka ha kwụsị okwu maọbụ agwa ọbụla ga-eme ka ntọghapụ Nnamdi kanu raa ahụ.

N'okwu ya, "ọ bụrụ na ha ewelataghị aka, a ga m akwụsị mbọ m na-agba."

"Makana ọ baghị uru na m na-etinye ndụ m na nsogbu, ọ ka mma na m nọ na-akara onwe m nka."

Onye bụ Mbazulike Amaechi?

Ọ bụ mịnịsta njem Ugbọelu mbụ Naijiria n'afọ 1962 ruo 1966.

Ọ bụ onye 'Zikist'- ndị soro Nnamdi Azikiwe were lụọ ọgụ nnwereonwe Naijiria.

Ọ na-akatọkarị etu e si emegbu ndị Igbo ma na-enye ndụmọdụ ihe ndị a ga-eme iji nweta ogbugbo mmegbu a.

Aha onyonyo, Mbazulike Amaechi: Jim Nwobodo rere ndị Igbo ọtụtụ ugboro
Akara ntụ-ntụ

Etu 'sit at home siri gaa n'abalị 17 ọnwa Jenụwarị?

Ndị bi a mpaghara ọwawa Anyanwụ nọkwara n'ụlọ ụbọchị Mọnde abalị 17 ọnwa Jenụwara maka ikpe Nnamdi Kanu ga-ewe abalị abụọ n'izu a.

Ọtụtụ ndị mmadụ nọbụ na mgbagwoju anya ma a g-anọ n'ụlọ ka a gaghị anọ n'ụlọ.

N'abalị 17 ọnwa Jenuwarị, ndị mmadụ apụtaghị n'ụzọ chacha.

Ụzọ Ụmụahịa

Nke a bụ na-agbanyeghi na ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) kwuru na ha etinyeghi 'sit at home' n'izu niile.

N'agbanyeghi na ha kwuru na ha etinyeghi mmachi ọbụla, ndị mmadụ ka na-ehi asaa n'anya.

N'Enugwu,

Ụzọ dị iche iche tọgbọ chakoo n'isiobodo steeti a, dịka ọtụtụ ndị mmadụ apụtabeghi ịgara mkpa ha.

N'agbanyeghi na ọ bụ ụtụtụ Mọnde, ụfọdụ ebe ndị na-ekwokarị ekwo tọgbọ chakoo.

New Haven

Ebe foto si, Emeka Nwamba

Nkọwa foto, Ọtụtụ ụgbọala anaghị aga n'okporoụzọ New Haven dị n'Enugwu n'ụtụtụ Mọnde, Jenụwarị 17, 2022
Chime Avenue New Haven

Ebe foto si, Emeka Nwamba

Nkọwa foto, Ụzọ Chime Avenue dịkwa na New Haven tọgbọ chakoo ebe elekere asatọ nke ụtụtụ Mọnde, Jenụwarị 17, 2022
Agric Bank junction

Ebe foto si, Emeka Nwamba

Nkọwa foto, Ụzọ Agric Bank tọgbọ chakoo
Agric Bank junction

Ebe foto si, Emeka Nwamba

N'Abịa,

N'agbanyeghi na ndị ụfọdụ ụgbọala na-agba n'ụzọ n'ụtụtụ a n'Ụmụahịa, isiobodo Abịa steeti, ụfọdụ ndị ekwebeghi apụta ezi.

Ụfodụ ndị ekweghi agbape ọnụụlọahịa ha, ebe ndị nke mepere emepe ji otu ụkwụ kwụrụ.

N'aka nke ọzọ, ụlọakụ, ọdọmmanụ ụgbọala nakwa ụlọakwụkwọ mepere emepe.

Club Road Umuahia
Nkọwa foto, Ụkwụ na-aga na Club Road dị n'Ụmụahịa
Ọdọụgbọala dị n'isi Gate dị n'Ụmụahịa
Nkọwa foto, Ụfọdụ ọdọụgbọala dị n'ebe Isi Gate dị n'Ụmụahịa emepebeghi n'ụtụtụ Mọnde a
Ụlọahịa dị n'Ụmụahịa
Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị agbapebeghi ụlọahịa ha n'Ụmụahịa ebe elekere itoolu nke ụtụtụ Mọnde a
Uzuakoli road Umuahia
Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị na-agara mkpa ha n'ụzọ Ụzụakọlị dị n'Ụmụahịa, ebe ụfọdụ ndị emepebeghi ụlọahịa ha

N'Imo,

Ahịa Ekeonunwa dị n'Owerri
Nkọwa foto, Ahịa Ekeonunwa dị n'Owere, Imo steeti na-azụ dịka etu o si emebu

Ndị mmadụ na-agagharị mkpa ha n'isiobodo steeti ahụ n'ụtụtụ Mọnde a.

Ahịa na-azụ, ndị ọrụ na-aga ọrụ ha, ụlọakụ mepere emepe, mana ụfọdụ ndị ahịa emepeghi ọnụụlọahịa ha.

Wetheral Road dị n'Owerri
Nkọwa foto, Ụzọ Wetheral dị n'Owere adịghị ekwo ekwo mgbe e sere foto a ebe o ji nkeji 30 gafee elekere itoolu nke ụtụtụ Mọnde, Jenụwarị 17
Tetlow Road
Nkọwa foto, Ụkwụ na ụgbọala na-aga n'ụzọ Tetlow dị n'Owerri

N'Anambra

Ụkwụ na-aga etu o kwesịrị n'ụfọdụ mpaghara Ọka, isiobodo Anambra steeti, n'ụtụtụ Mọnde a.

Mana n'agbanyeghi nke a, ụfọdụ ọdọụgbọala na ọdọmmanụ ụgbọala mechiri emechi, ahịa ndị dị ka Eke Ọka anaghịkwa azụ etu o kwesịrị n'ụtụtụ a.

Eke Awka
Nkọwa foto, Ụfọdụ ọnụụlọahịa ka gbachiri agbachi ebe elekere iri nke ụtụtụ Mọnde, Jenụwarị 17
Awka
Nkọwa foto, Mpaghara Aroma Junction dị n'Ọka, n'ụtụtụ Mọnde, Jenụwarị 17
Ọdọụgbọala dị n'Ọka
Nkọwa foto, Ọdọụgbọala a dị n'Aroma Junction n'Ọka tọgbọ chakoo
Awka
Nkọwa foto, Ọdọụgbọala dị na Unizik Temporary site Junction gbachiri agbachi, ụgbọala ndị na-anọbu ebe ahụ apụtaghị ọrụ

N'Ebonyi,

Ndị mmadụ na-agara mkpa ha n'isiobodo Abakaliki n'ụtụtụ a.

Ụlọakwụkwọ, ụlọakụ, ahịa na ụlọọrụ mepechara emepe.

Abakaliki
Nkọwa foto, Ndị na-ere ihe mepere
Abakaliki
Nkọwa foto, Ndị na-ere ihe dị ka ihe nracha ụtọ, pụtara na-agara mkpa ha
Abakaliki
Nkọwa foto, Ndị keke na-aga mkpa ha ma na-eburukwa ndị na-aga mkpa ha