Nnamdi Kanu: Ihe ọ ga-efu iji tọhapụ ya - Abubakar Malami

Abubakar Malami na Nnamdi Kanu

Ọkaiwu ukwu Gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami ekwuola ọnọdụ gọọmentị ga-eji lee anya ma a ga-atọhapụ onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu.

Na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ NTA nwere n'ụtụtụ Tuzde, Malami kwuru na Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-ebu ụzọ lebanya n'ọdịmma ụmụ Naijiria tupu o kwuwe ma ọ ga-atọhapụ Kanu.

Dịka a jụrụ ya maka arịrịọ ndị okenye Igbo rịọrọ n'ọnwa Novemba afọ 2021, ka onyeisiala Buhari tọhapụ Kanu, Malami sị na okwu ịtọhapụ Nnamdi Kanu ga-adị ka etu onyeisiala siri lee anya n'ọdịmma ọha Naijiria were jụụ ibinye aka n'iwu ọhụrụ maka ntuliaka a kpọrọ 'Election Amendment Bill' na Bekee.

Abubakara Malami

Ebe foto si, Fed Min of Justice

"n'okwu Kanu, mkpebi Onyeisiala banyere arịrịọ ọbụla a rịọrọ ya ga-agbado ụkwụ n'ọdịmma ọha mmadụ, ọ bụghị nke ụfọdụ ndị."

Cheta na a nwụchiri kanu n'ọnwa Juun afọ 2021 na mba Kenya ma kpụpụ ya n'ụlọikpe maka ebubo iyi ndụ egwu.

E jichikwara ya na mkpọrọ ndị DSS kemgbe ahụ.

Mwakpo ọbụla gọọmentị etiti mere Ipob bụ Igbo niile ka e mere ya - Ohanaeze Ndigbo

Onyeisi Ohaneze ndị Igbo na Abubakar Malami

Ohanaeze Ndigbo ekwuola na mwakpo na-ezighi ezi ọbụla gọọmentị etiti mere ndị Ipob bụ ndị Igbo niile ka e mere ya.

Ha kwuru nke a iji dọọ ọkaiwu gọọmentị bụ Abubakar Malami aka na ntị n'ebubo o boro ndị Ipob nke ọ sị na ọ bụ ha wakporo ụlọ Oba nke Legọs n'oge ngagharịiwe EndSars.

Odeakwụkwọ Ohanaeze bụ Alex depụtara nke a ma sị na ha agaghị anọ mmadụ ebo ụmụ ha (Ipob) ebubo ihe ha emeghi.

Ọ sị na ọ bụ eziokwu na ha Ipob nwere obere nghọtaghie mana ọ bụ maka ọdịmma ndị Igbo ka ha na-achọ.

N'ehihie Fraịde a, Malami wepụtara akwụkwọ ebe ọ nọr bo ebubo na aka ndị IPOB dị n'ogbugbu Dr Chike Akunyili, Ahmed Gulak, na ọtụtụ ndị ọzọ nwuru n'ọdị nso a na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Mana ọnụ na-ekwuru Ohaneze NdịIgbo bụ Alex Ogbonnia, kwuru na ụdị okwu ahụ ekwesịghị isi n'ọnụ ọkaiwu gọọmentị apụta.

Ogbonnia kwuru sị: "E mechaala nnyocha gbasara ndị gburu Dr Chike Akunyili, Ahmed Gulak na ndị eze ọdịnala abụọ? A matala ndị kpara arụ ndị a?"

"A chọpụtara na e nwere ihe jikọrọ ndị kpara arụ ahụ na Nnamdi Kanu?"

"Ọ bụrụ na e mechaala nnyocha a, Malami ji ụmụ Naịjirịa ụgwọ ịkọrọ ha ndị mere ya bụ arụ."

"Mana ọ bụrụ na nnyocha ka na-aga n'ihu, mara na ebubo niile Malami na-ebo Nnamdi Kanu na IPOB enweghị isi; o kwesịkwaghị ịpụta n'ọnụ ọkaiwu gọọmentị."

Ogbonnia kwuru na "ihe Malami mere bị iwere ihe ọjọọ niile mere na Naịjirịa, ma ndị mere na Legọs na Cross River, bo n'isi IPOB".

Ọ gara n'ihu kwuo na ibo IPOB ebubo agaghị enye aka ọbụla, kama ihe ka mkpa bụ ka e nwee mkparịtaụka gbasara okwu a.

"Ohaneze arịọla Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o chegharịa etu o si akpaso ndị IPOB agwa."

"Naanị site na mkparịtaụka ka ihe niile a ga-eji bie, mana onyeisiala achọghị ịnụ," Ogbonnia kwuru.

Lee etu Emma Powerful siri saa ebubo Malami boro ndị IPOB

Ndị otu IPOB

Ebe foto si, Getty Images

"Anyị kwuburu ekwu na ọ bụ gọọmentị etiti na-akwado ndị 'unknown gunmen' iji chọọ ihe ha ga-ebodo IPOB."

Nke a bụ ihe Emma Powerful, ọnụ na-ekwuru ndị IPOB, kwuru gbasara ebubo ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami boro Nnamdi Kanu nakwa ndị otu ya bụ IPOB.

Aha onyonyo, Rochas: Ipob na Biafra abụghị otu ihe

Emma Powerful kwuru sị: "IPOB bụ otu udo, aka anyị adịghị n'ebubo ọjọọ niile Malami na-ebo anyị."

"Kama igbu ndị ọrụ nchekwa, ọ bụ ha na-egbu ndị IPOB, dịka ndị otu anyị karịrị 20,000 anwụọla n'aka ndịọrụ nchekwa Naịjirịa."

"Ogbugbu a ha na-egbu anyị ka na-agakwa n'ihu ma ugbua, mana ha atụgharịala chọzie ịkọgharị ya bụ akụkọ."

"Anyị ekwuola ya ugboro ugboro na ọ bụ ndịọrụ nchekwa Naịjirịa wepụtara ndị "unknown gunmen" iji nye IPOB aha ọjọọ."

"Ọ bụ gọọmentị Naịjirịa na-akwado ogbugbu mmadụ niile a ma bịa ugbua na-ebo ya IPOB na onyeisi anyị bụ Nnamdi Kanu."

"Aka ya dị ọcha. Aka anyị dị ọcha."

"Ọ bụ ndị IPOB gburu Chike Akunyili, Ahmed Gulak na ndị eze abụọ n'Imo steeti" - Malami

Nnamdi Kanu, Abubakar Malami, ESN

Ọkaiwu Gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami akọọrọla ụwa niile ihe mere gọọmentị Naịjirịa ji nwuchie Mazi Nnamdi Kanu bụ onyeisi ndị otu 'Indigenous People of Biafra (IPOB).

Malami kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ n'Abuja n'ụbọchị Fraịde.

O kwuru na ọ bụ Nnamdi Kanu bụ isi sekpụ ntị n'ọgbaaghara dị icheiche e nwere na Naịjirịa, tinyere ogbugbu ụfọdụ ndị a ma ama dịka Dr Chike Akunyili na Ahmed Gulak.

Na nke dịka ya, Malami kwukwara na ha chọpụtara onye na-akwado Sunday Igboho, onye na-azọ nnwereonwe ndị ala Yoruba.

Malami kwuru na onye ahụ na-akwado Igboho bụkwa onye na-akwado ndị Boko Haram, mana ndị Afenifere akatọọla ihe ahụ Malami kwuru.

Lee ọtụtụ ebubo Abubakar Malami boro Mazi Nnamdi Kanu:

Abubakar Malami na Nnamdi Kanu
  • "A nwụchiri Nnamdi Kanu n'ụbọchị 14 nke Ọkụtoba 2015, ụlọikpe atọhapụ ya n'ụbọchị 25 nke ọnwa Eprel 2017, mana ọ gbara ọsọ gbalaa mba ofesi
  • Na mba ofesi, o ji ụlọ mgbasaozi Redio Biafra na-amụnye ọkụ ọgbaaghara ma na-akwanye ndị IPOB ka ha na-awakpo ụlọọrụ ndị nchekwa, ụlọ ndị INEC nakwa ndị nkịtị
  • Nke a kpatara gọọmentị ji machie IPOB n'ụbọchị 20 nke Sepụtemba 2017, mana Nnamdi Kanu kachiri ntị na-akpalite ndị IPOB ka ha na-emebi ihe na Naịjirịa
  • N'oge ngagharịiwe End SARS n'afọ 2020, Nnamdi Kanu ji ohere ahụ malite mgbasaozi ma nye ndị otu ya iwu ka ha wakpo ndị ọrụ nchekwa na ụlọọrụ ha
  • N'ihi okwu Nnamdi Kanu, ndị otu IPOB wakporo ma gbuo ọtụtụ ndị uweojii, gbaa ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ, wakpoo ụlọ mkpọrọ, ọdọ ụgbọala, Obie eze Oba nke Legọs, ụlọakụ, ụlọọgwụ, ụlọahịa na ọtụtụ ụgbọala
  • N'ụbọchị 12 nke Disemba afọ 2020, Nnamdi Kanu hibere ngalaba 'Eastern Security Network' dịka ngalaba IPOB ga na-ebu egbe.
  • ESN gara n'ihu na-awakpo ndị ọrụ nchekwa na ndị nkịtị bụ ndị ha hụtara dịka ndị iro ha

Abubakar Malami gara n'ihu kwuo na mkpamkpa niile ndị IPOB/ESn na-akpa bụ nnukwu ihe ọdachi nyere ọnọdụ nchekwa na ịdịnotu Naịjirịa, nke a mere e ji nwuchie Nnamdi Kanu ọzọ.

Malami kwuru na dịka ha nwuchiri Nnamdi Kanu ọzọ, Onyeisiala Muhammadu Buhari hibere kọmiti ga-eleba okwu gbasara ya anya.

Nnyocha kọmiti ahụ mere gosiri ihe ndị a:

  • Iwu Nnamdi Kanu nyere nakwa okwu ọnụ ya mere ka ndị IPOB/ESN wakpoo ọtụtụ ụlọọrụ e ji mara ọchịchị onye kwuo uche ya, ọ kachasị ụlọọrụ ndị INEC n'etiti ọnwa Ọkụtoba 2020 na Jun 2021
  • Iji mezuo iwu Nnamdi Kanu nyere na mgbasaozi ya, ndị ngagharịiwe End SARS nakwa ndị otu IPOB wakporo ma gbuo ọtụtụ ndị ọrụ ncheka ma mebikwaa ọtụtụ ụlọ gọọmentị nakwa ụlọ ndị nkịtị
  • N'ụbọchị 21 nke Ọkụtoba 2020, Nnamdi Kanu mekwara mgbasaozi n'ịntaneetị ebe ọ nọrọ nye ndị IPOB iwu ka ha gbaa ụlọọrụ ndị uweojii niile ọkụ ma gbukpọọ ndị ọrụ nchekwa gọọmentị. Ha mekwara dịka o si nye ha n'iwu ma gbuo ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa (ọ kwachasị ndị uweojii)

"Ndị IPOB egbuola ndị ọrụ nchekwa ọnụọgụgụ ha dị 175 na Naịjirịa" - Gọọmentị etiti

Ndị otu IPOB

Ebe foto si, Getty Images

Malami kwuru na ndị IPOB egbuola ndị ọrụ nchekwa ọnụọgụgụ ha dị otu narị na iri asaa na ise (175), kamgbe Nnamdi Kanu nyechara iwu ahụ.

Ha gụnyere ndị uweojii 128, ndị agha 37, na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ọnụọgụgụ ha dị iri.

O kwukwara na n'ime mwakpo ndị a, ndị IPOB merụrụ ndị uweojii 144 ahụ, ma mebikwaa ụgbọala 628.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị IPOB na ESn zuru egbe ndị ọrụ nchekwa dị 396 n'ọnụọgụgụ, nakwa ọtụtụ mgbọ egbe ọnụọgụgụ ya ruru 17,738 na mwakpo niile ndị a ha merela.

Malami bokwara ebubo na aka ndị IPOB dị n'ogbugbu ụfọdụ ndị nkịtị a ma ama na Naịjirịa dịka:

  • Eze E. Anayochukwu Durueburuo - Eze ọdịnala obobo Okwudor, Imo Steeti
  • Eze Sampson Osunwa - Eze ọdịnala obodo Ihebinowere
  • Dr Chike Akunyili
  • Alhaji Ahmed Gulak, na ọtụtụ ndị ọzọ
Aha onyonyo, Ihe mere ọnwụ Chike Akunyili ji ewute anyị karịa - Ndị Agulu

Malami kwukwara na ndị IPOB awakpoola ụlọọrụ ndị uweojii dị otu narị na iri isii na anọ (164) n'ọnụọgụgụ na steeti dị icheiche, tinyere isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Owere, Imo steeti.

N'otu aka ahụ kwa, ha wakporo ụlọọrụ ndị INEC iri na itoolu (19) ma gbaa ụgbọala INEC iri na asatọ (18) ọkụ.

Steeti ebe a wakporola ụlọọrụ ndị INEC gụnyere: Abia, Akwa-Ibom, Anambra, Cross River, Enugu, Ebonyi, na Imo Steeti.

Odochabeghị anya etu ndị uweojii si mata kpọmkwem na ọ bụ ndị IPOB na-eme mwakpo ndị a.

Mana ndị uweojii anwụchiela ụfọdụ ndị ntorobịa n'oge gara aga, bụ ndị ha kwuru na ha sara asịsa na ha bụ ndị otu IPOB.

Ihe ndị IPOB kwuru

Aha onyonyo, Mkpamkpa na-akpa n'Ọwụwa Anyanwụ na-ewute Nnamdi Kanu - Ifeanyi Ejiofor

Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru ndị IPOB ekwubeghị ihe ọbụla gbasara ebubo nke a Abubakar Malami boro ha na onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu.

Mana ugboro ugboro ka INEC gọọrọ ọnụ ha na aka ha adịghị na mwakpo ndị a na-eme na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Malami kwukwara na gọọmentị achọpụtala onye na-ebunye Sunday Igboho ego

Abubakar Malami na Sunday Igboho

Ọkaiwu Gọọmentị Etiti bụ Abubakar Malami ekwuola na nnyocha ha agbaala n'anwụ onye na-ebunye Sunday Igboho ego o ji akwado atụmatụ nkewa Naịjirịa.

Malami kwuru nke a oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja taa bụ Fraịde.

Ọ sị na aha onye ahụ bụ Abdullahi Umar Usman, onye nwe ụlọọrụ Abbal Bako & Sons.

Malami kwukwara na onye ahụ na-ebunye Sunday Igboho ego o jị akpa ike bụ onye omeiwu n'ụlọ omeiwu Naịjirịa.

"Sunday Igboho bụ onyeisi ụlọọrụ "Adesun International Concept Limited", nke e debanyere aha ya n'ụbọchị 23 nke ọnwa Eprel afọ 2010," Malami kwuru.

"Ndị ọzọ bụ ndị isi ụlọọrụ ahụ bụ Pladele Oyetunji na Aderopo Adeyemo, mana ọ bụ Sunday Igboho bụ onye ga-ebinyerịrị aka n'akara ọbaego ụlọọrụ ahụ."

"Malite na ụbọchị 23 nke ọnwa ọkụtoba 2013, ruo ụbọchị 28 nke Sepụtemba 2020, ndị nkwado Igboho kwụrụ ya ego dị N127, 145,000.00 site n'akara ọbaego "Adesun International Concept Limited"

"Sitekwa n'ụbọchị 15 nke ọnwa Maachị afọ 2013 ruo ụbọchị 11 nke ọnwa Maachị afọ 2021, Igboho kwụnyere ego dị N273,198,200.00, n'akara ọbaego ndị nkwado ya."

Malami kọwara na ụlọọrụ Abbal Bako & Sons nakwa onyeisi ha bụ Abdullahi Umar Usman bụ ndị a na-enyo enyo na ha na-akwado ndị oyi egwu.

"Abdullahi Umar Usman na otu onye aha ya bụ Surajo Abubakar Muhammad nwere mmekọrịta."

"Surajo Abubakar Muhammad bụkwa onye a tụrụ mkpọrọ ndụ ya niile na mba UAE dịka a mara ya ikpe na ọ na-ebunye ndị Boko Haram ego."

"Nnyocha anyị egosila na e nwere mmekọrịta dị n'etiti ndị chọrọ ka e kewaa Naịjirịa, ndị na-eyi ndụ egwu (terrorists), na ọnọdụ enweghị udo na Naịjirịa," Malami kwuru.

Ihe Afenifere sara Malami

Otu jikọrọ ndị Yoruba a na-akpọ Afenifere asaala Abubakar Malami gbasara ebubo o boro Sunday Igboho.

N'akwụkaọ ozi si n'aka odeakwụkwọ ha bụ Sola Ebiseni, Afenifere kwuru na ebubo ahụ na-atọ ọchị, maka na gọọmentị Naịjirịa ma ụma aghọgbu onwe ha.

"Naanị onye kpọrọ Igboho asị nakwa onye na-akparị ndị Yoruba akparị nwere ike ikwu na Sunday Igboho na ndị oyi egwu na-emekọ ihe."

"Ọ na-atọ ọchị na gọọmentị etiti enwenwughị ike ịgọrọ ọnụ ya gbasara mwakpo ha wakporo ụlọ Igboho, nke mere ka ụlọikpe daa ha nha ijeri naịra 20."

"Mana kama ha ga-akwụ Igboho ụgwọ ụlọikp sị ka a kwụọ ya, ha tụgharịrị na-asị na Igboho natara mmadụ ego na-erughị nde naịra 200 iji kwado ndị oyi egwu."

"Ọ masị gọọmentị Naịjirịa ha mewe ihe masịrị ha, mana mba ụwa niile amarala ndị na-akwado ndị oyi egwu."