Ipob news today: 'Etu ndị 'Bandit' si wakpoo ụlọakwụkwọ NDA gosiri ihe ndị a - Ipob

Ndị Ipob

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị Ipob na-achọ ka ekwa Naịjirịa

Otu Indigenous People of Biafra etiela mkpu maka etu ndị bandit si wakpoo ụlọakwụkwọ ndị agha dị na Kaduna akpọrọ Nigerian Defence Academy n'asụsụ bekee.

Ọnụ na-ekwuru ndị otu ahụ bụ Emma powerful depụtara n'akwụkwọ ozi o zigara ndị ntaakụkọ na mwakpo a ndị omekome mere gosiri na onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu enweghị ezi nchekwa na mkpọrọ ndị DSS ọ nọ na ya ugbua.

"Ọ bụrụ na ndị bandit nwereike ịwakpo Nigerian Defence Academy ma gbuo ndị agha abụọ na-enweghị mgbochi ọbụla, kedụ ihe ga-eme ka ndị mmadụ chee na ha agaghị awakpoli isi ụlọọrụ Department for State Security ma gbuo Nnamdi Kanu?, dịka Powerful si depụta.

"Mgbe Nnamdi Kanu kwuru maka oke mwakpo ndị bandit na-eme na etu ọ ga-esi metụta ụmụ Naịjirịa, ndị mmadụ ekweteghị ihe o kwuru mana ihe ndị na-eme ugbua egosila na ihe ndị o tiri mkpu maka ya bụ eziokwu."

Powerful kwuru na otu Ipob na-achọ ime ka ụwa mara na onwe ihe mere onye ndu Ipob , na ọ bụ gọọmenti Naịjirịa kpatara ya.

Aha onyonyo, Insecurity: Nwaamadị a sata asịsa otu o si banye ESN

Ipob adọọla ndị gọọmentị ọwụwa anyanwụ aka na ntị maka ndị otu ha e ji

Ọnụ-nekwuchitere ndị otu Ipob bụ Emma Powerful n'ozi ọhụrụ ya dọrọ Gọvanọ Ebonyi Steetị bụ David Umahi na gọọmentị Naijịrịa aka na nti maka agwa o kwuru na ha na-akpasa ndị otu ha na ndị Biafra ndị ọzọ na Steetị ahụ.

N'ozi a, Emma Powerful kwuru na ndị ọrụ nchekwa site n'aka Gọvanọ Umahi na ndị otu Ebube Agu na-awakpoo ma anwụchị ndị ntorobia aka ha dị ọcha n'ala Igbo, ebo ha ebụbọ ị bụ ndị otu Ipob na ESN.

O kwuru na ọ ma na nzube ha bụ ị kụda mmụọ ndị ntorobia ka ha ghara ịchụ nwereonwe Biafra.

Na ozi ọ depụtara na a na-egbu ma na atụ ndị otu Ipob nga n'ụzọ ezighi ezi nke gụnyere mmadụ nari ato ọ si nọ n'ụlọnga ugbua, o kwuru na mmadụ atọ ha ma nwụrụlara n'ime ụlọnga na Ebonyi Steetị gụnyere: Maazị Obinna Iroegbu, na mmadụ abụọ ọzọ e ji aha "Onye Army" na "Sydney" mara.

Ndị Otu Ipob

Ebe foto si, Getty Images

Ọ gwara ọha ka ha dọọ ya bụ Gọvanọ aka na nti tupu ihe mere n'Ịmo Steetị emee n'Ebonyi Steetị. Na nchịkọta okwu ya, o kwukwara na ọ bụ ihe ihere na Gọọmentị etiti na-agbahara ma atọhapụ ndị otu omekome Boko Haram aghara aghara mana na gọvanọ ndị ọwụwa anyanwụ na-etinye aka egbu ndị nke ha, agbanyeghi na ihe ndị a mere bụ ichekwa obodo ha ka ndị omekome na-esi n'ụzọ aghụghọ na ha na-achị ehi hara ibata obodo ha.

Ka ọ dị ugbua gọọmenti Ebonyi steeti anaghị aza ekwenti maka ịgọrọ ọnụ ha na-ebubo a.

Anyị ga-ememila ndị 'unknown gunmen' maọbụrụ na ha akwụsịghị agwa ọjọọ ha - Emma Powerful

Ọnụ na-ekwuru otu Ipob bụ Emma Powerful ekwuola na ha ga-ememila ndị omekome akpọrọ 'Unknown gunmen'.

Ipob

Ebe foto si, Getty Images

Powerful dọrọ ndị ahụ aka na ntị n'ime akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Wenzde.

O ji kwa otu aka ahụ gwa ndị uweojii ha kwụsị ịkpọ ndị ọbụla ha jidere ndị ESN

N'ọnụ ya "O nweghi onye n'ime anyị (ESN) na-efu efu, ịkpọpụta ndị nkịtị kpọọ ha ndị ESN gosiri na ndị uweojii adaala n'ọrụ ha"

O kwukwara ka ha kpụpụ ndị ahụ eji ụlọikpe maọbụ tọghapụ ha ka ha gawara onwe ha.

O bokwara ndị ndị uweojii ebubo igbu ndị Igbo na nzuzo.

Amnesty International bụ ụlọọrụ na-achọ ikike ruru mmadụ kwukwara nd ndị ọrụ nchekwa dị icheiche gburu opekatampe mmadụ 115 n'ọwụwaanyanwụ kemgbe ọnwa Maachị.

Amnesty International: Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa gburu mmadụ 115 n'ọnwa anọ n'ọwụwa anyanwụ

Ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Nchọpụta nke ngalaba na-azọ ikike ruru mmadụ bụ Amnesty International mere gosiri na ndị ọrụ nchekwa gburu 115 site n'ọnwa Maachi rue ọnwa Juun n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Nchọpụta ahụ gosikwara na ha nwụchiri ọtụtụ mmadụ n'ụzọ ezighi ebe ha ji mmegbu na mkpagbu ejitu ndị mmadụ.

Aha onyonyo, Orlu Crisis: "Ndị uweojii enweghi ike ịkọwa mmadụ ole nwụrụ n'Orlu"

Osai Ojigho bụ onyeisi ngalaba ahụ kwuru na ihe akaebe anyị wetara gosiri aka ike ndị nchekwa gosiri na Imo, Abia nakwa Anambra.

Ndị e chere na ha bụ ndị wakporo ụlọọrụ ndị uweojii na Njaba nakwa Omuma

Ebe foto si, Imo State Police

Otu ndị ọzọ na-azọ ikike ruru mmadụ kwukwara na ezi ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ọwụwa anywanwụ site na Jenụwarị rue Juun bụ narị kwuru narị.

Aha onyonyo, Ebe mgbọ dara na Lilu

Ihe ndị ọzọ si na nnyocha ahụ pụta bụkwa na ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị agha, ndị uweojii na ndị DSS -

  • Tiri ndị mmadụ ihe n'enweghi ihe ha mere
  • Nwuchiri ma jichie ndị mmadụ na nzuzo
  • Gbara ụlọ ụtụtụ ndị mmadụ ọkụ
  • Ha zuru ndị mmadụ ohi
  • Ha gburu ndị mmadụ n'enweghi ihe ha mere.
Aha onyonyo, Imo State Security: Udo, azụmaahịa na ịkụ ngwọrị alọghachịla n'Owere - Komishọna Uweojii

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị