Ipob news today: Owerri, Nnewi na Aba, Enugwu so n'obodo ọtụtụ mmadu mere 'sit at home' na Mọnde

Okporoụzọ Isi Court

Onye ntaakụkọ anyị nọ n'Enugu hụrụ na ụfọdụ okporoụzọ tọgbọọ chakoo nke bụ na-aga agụtalị ọnụọgụ ụgbọalal ndị na-aga ebe ahụ.

O gosiri ụwa ka ahịa old Artisan dịketere ọgụiyi road si tọgbọọ chakoo dịka ahụghị ndị na-azụ ahịa mepere ụlọahịa ha nke e ji ahụ ndị pụtara ịbịa goro ahịa.

O kwukwara na ndị mmadụ ji maka ụjọ ihe ndị otu Indigenous People of Biafra ga-eme ha ghara ịpụta taa bụ Mọnde bụ ụbọchị otu ahụ kanyeburu ị na-eme sit-at-home tupu ha akagbuo ya.

Onye ntaakụkọ anyị gwara anyị na sit-at-home Ipob kanyeburu nwerike imetụta ọgbakọ ndị Bishop karịrị iri asatọ malitere ụnyahụ n'egwu.

Lee ihe ndị mmadụ na-eme n'Umuahia ugbua dịka Ipob kagburu sit-at-ahome

Ndị mmadụ bị n'Umuahịa pụtara na-aga mkpa ha agbanyeghị na ụfọdụ ebe ndị ọzọ dị na mpaghara ọwụwaanyanwụ tọgbọọ chakoo.

Ụlọahịa mepere n'ebe dịka okporouzọ Isi Court dị n'Umuahia ebe ahụrụ ndị mmadụ na-aga mkpa ha.

Isi Court Umuahia

Isi Court Umuahia

Abakaliki dị n'Ebonyi steeti

Okporoụzọ dị nEbonyi steeti

Ụfọdụ Ụlọahịa mepere n'Ebonyi steeti

Ụfọdụ Ụlọahịa mepere n'Ebonyi steeti
Nkọwa foto, Ụfọdụ Ụlọahịa mepere n'Ebonyi steeti

Ebe ụfọdụ emepeghị

Ọtụtụ ụlọahịa emepeghị n'Ebonyi
Nkọwa foto, Ọtụtụ ụlọahịa emepeghị n'Ebonyi

Lee ka Owerri, Nnewi na Aba dị n'ụtụtụ a

Okigwe road Owerri

Agbanyeghị na otu Indigineous People of Biafra (Ipob) ekwuola ka akwụsị atụmaatụ sit-at-home ụbọchị Mọnde ọbụla ha kanyeburu, lee etu ihu na anya dị ụfọdụ ebe na mpaghara ọwụwaanyanwụ.

Okoroụzọ Okigwe n'Owerri dịka ebe ndị mmadụ gbara ọsọ.

Ọtụtụ ebe na Nnewi ama dịka ebe na-ekwoekwo ụbọchị Mọnde ọbụla tọgbọọ chakoo.

Otu onye bi n'Anambra kwuru na ọ gwara ndị bee ya ha apụla apụ makana ọ "maghị ihe ndị otu Ipob pụrụ ime ha ma ha na-aga n'okporoụzọ."

Ụlọakụ dị na Nnewi emepeghị.

Nnewi bank Road
Nkọwa foto, Nnewi bank Road

Okporoụzọ Whethral dị n'Owerri tọgbọọ chakoo dịka onweghị ụgbọala onye ntaakụkọ hụrụ ebe ahụ.

Okporoụzọ Wetheral dịn n'Owerri n'ụbọchị Aug 23,2021
Nkọwa foto, Okporoụzọ Wetheral dịn n'Owerri n'ụbọchị Aug 23,2021

Okporoụzọ dị n'Aba

Okporoụzọ dị n'Aba
Nkọwa foto, Okporoụzọ dị n'Aba

Lee ihe ndị ụweojii chọrọ ịme ndị mmadụ echi n'aha Sit-at-Home - Ipob

Ipob/ Sit-at-Home

Ebe foto si, Getty Images

Ọnụ na-ekwuchitere ndị otu Ipob bụ Emma Powerful edepụtala akwụkwọ ozi were sị na ha ekpuheela nkata ndị uweojii na-akpa iji wakpoo ndị mmadụ n'ụbọchị Mọnde ma boo ya ndị ESN.

Powerful gara n'ihu kwuo na ngalaba nyocha otu Ipob achọpụtala na ndị ọrụ nchekwa Naijirịa ọkachasị ndị DSS na ndị uweojii akpaala nkata etu ha ga-esi wakpoo ndị ahịa ga-apụta ịzụ ahịa ha echi ma boo ya ndị ESN na Ipob.

O kwuru sị, " A ga-ejide ndị ọrụ nchekwa Naijirịa ma e nwee mwakpo ọbụla echi. Ha chọrọ iyi Jins tụrawụza na kọmbat Nika Jins were mee ka ha abụ ndị Ipob na ESN.

"Ndị nke anyị ga-egbochi mwakpo ọbụla achọrọ ịwakpo ha echi".

Ọ gara n'ihu sị, "Anyị chọrọ ịgwa ndị uwa niile ọkachasị ndị bi n'ala Biafra na Ipob akagbuola atụmatụ Sit-at-home ha hiwere ụbọchị mọnde ọbụla. Nke a mere na onweghị isi na anyị ga-apụtakwa ọzọ were hiwe ihe anyị kagburu".

O kwuru na Sit-at-home ga-abụ naanị ụbọchị nnamdi Kanu ga-apụta n'ụloikpe ka ha ga-eme ya.

Aha onyonyo, Onions traders: 'Anyị ahụbeghị ego Nnamdi Kanu kwuru ọ ga-akwụ anyị maka ịyabasi ha n'Imo'

O kwurukwara sị, "Mmadụ niile muru anya maka nkata ọjọọ a. IPOB agaghị anabata mwakpo onye BIafra ọbụla maọbụ onye ọbụla bi na Biafra. Si nye ndị mmadụ ohere ka ha gaara mkpa dịịrị ha na-enweghị nsogbu ọbụla".

Powerful kwuru sị, "Aghọtara m na ndị DPO niile, DCO na ndị isi ndị uweojii ndị ọzọ enweela nzụkọ ma hazie etu ha ga-esi awakpo ndị Biafra aka ha dị ọcha ma sị na ọ bụ ndị ESN".

Na mmechi, ọ kwuru sị , "ha ewepụtala ọtụtụ ụgboala Hilux maka imezu ihe ha kwdoro ime echi. Ka ndị be anyị muru anya".

BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Imo steeti bụ Mike Abattam n'ekwe ntị ya ma zịgara ya ozi, kama ọzabeghị.

Ebe Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambra steeti kwuru na ihe kachasị ha mkpa bụ ịrụ ọrụ dịka iwu Naijirịa siri dị.