Biafra sit at home: Ihe mere agaghị eji 'nọrọ n'ụlo' mee ncheta maka Biafra nke afo a

Ndị na-achọ nnwereonwe Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Dịka ndị otu Ipob na-agbalị ịchịkọta ndị bị n'ọwụwa anyanwụ ka ha nọrọ n'ụlọ dịka etu ha si eme ncheta ndị nwụrụ n'agha Biafra, nke afọ a agaghị eme.

Onye okaikpe Mazi Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimako gwara BBcIgbo na mkparịta ụka na emume ị nọ n'ụlọ nke afọ a agaghị eme maka ọrịa coronavirus.

Ejimako kwuru sị " Onye m na-anọchite bụ Nnamdi Kanu mara nke ọma na ọ bụrụ na ha chọrọ ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlo na ha ga-anọ kama ọ bụ maka etu coronavirus si awakpo akụnụba ndị bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ mere ka a hapụ ihiwe ya".

O kwukwara na nnamdi Kanu si ka ejiri oge a buo ọnụ ma tụgharịa uche maka ya bụ ụbọchị.

Microsoft sị ọ bụ rọbọt ga na-edeziri ha akụkọ

Microsoft

Ebe foto si, PA Media

Ndị ọrụ Microsoft e kwuola na ha ga-achu ndị ọrụ ngo ntaakụkọ ha n'ọrụ were nke Bekee kpọrọ rọbọt dochie ha.

Nke a pụtara na ihe dịka mmadụ iri ise ndị ọrụ ngọ na-arụ na MSN ha ga-agba aka ọrụ na Juun mgbe ha bụ amụma ga-amalite.

Mana ha sịkwa na ọbụghị coronavirus mere ha jiri kwuo ya, kama ọ bụ ihe nchọpụta ha na-eme kwamgbe gosiri.

Idemmiri na Kenya

Ide mmiri

Ebe foto si, Getty Images

N'Afrịka, idemmiri egbuola mmadị narị atọ ma chụpụkwa ezinaụlọ karịrị puku narị asatọ na be ha na Kenya .

Ọnọdụ a mere ka agha ha na-ebusa igurube na nje coronavirus bụrụ ihe nara azụ n'obodo Kihoto dị nso na Nairobi.

Bayern Munich egbuola Fortuna Busssedorf

Bayern Munich

Ebe foto si, Reuters

Na Bundusliga taa, Bayern Munich enwerela ọkpụ ise asataghị ihe nyụọ ndị Fortuna Busssedorf Ịkpakwụ.

Robert Lewandoski nyere goolu abụọ n'ime ise ahụ.

Ndị omekome atọhapụla onyeisi ndị CAN na Nasarawa steeti

Ndị uweoji Naịjiria

Ebe foto si, Getty/AFP

Ihe ọṅụ emeela na Nasarawa steeti dịka ndị ntọ tọhapụrụ onyeisi ndị Christian Association of Nigeria na ebe ahụ.

Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Bola Longe kwuru na Joseph Masin e ji kemgbe izuụka abụọ enwere onwe ya kemgbe abalị satọde.