Nnamdi Kanu akpọọla oku ka e buo ọnụ abalị atọ iji cheta ndị nwụrụ agha Biafra

Kanu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Onye ndu otu na-achọ mmereonwe Biafra, Ipob bụ Nnamdi Kanu ekwuola ka ndị nso ya buo ọnụ abalị atọ iji cheta ndị nwụrụ n'agha Biafra.

Obubu ọnụ a ga-ebido n'ụbọchị iri abụọ na asaa n'ọnwa Mee ga-ebi n'ụbọchị iri abụọ na itoolu n'ọnwa mee kwa.

Dịka o si kwuo n'akara Twitter ya, ọ kọwara na "aja ndị agha ahụ chụrụ agaghị ana n'iyi".

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

"Tọghapụnụ Rotimi Jolayemi"

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Otu ndị na-agba mbọ maka ikike diri onye akatọọla njichi e jichiiri otu onye ntaakụkọ Rotimi Jolayemi kemgbe abalị iri na asaa nke ọnwa Mee maka ikwu okwu ọjọọ megide Mịnịsta mbasaozi bụ Lai Mohammed.

Rashford na Pogba adịla njikere - Ole Gunnar Solskjaer

Ole Gunnar Solskjaer

Ebe foto si, Getty Images

Ole Gunnar Solskjaer bụ onye nchịkọta otu Manchester United ekwuola na Marcus Rashford na Paul Pogba dị njikere ịgba bọọlụ mgbe ọ ga-ebido.

Cheta na Rashford na Pogba gara ezumike maka ahụ ha merụrụ tupu akwụsị asọmpị kpam kpam n'ihi coronavirus.

Ọkụ erepịala ngwaahịa nde kwuru nde n'ahịa Asaba

Ọkụ ọgbụgba

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọkụ na-agba na foto a abụghị nke gbara n'ahịa Asaba

Ndị uweojii na Delta ekwuola na ọkụ gbara n'ahịa Ogbogonogo nke dị n'Asaba Delta steeti.

Ọnụ na-ekwuchitere ha na steeti ahụ bụ Onome Onovwakpoyeya kọwara na a kpọrọ ha ebe elekere asaa nke isi ụtụtụ na ọkụ na-agba n'ahịa ahụ.

"O nweghi onye nwụrụ n'ọdachi ahụ, mana anyị ka na-enyocha iji chọpụta ihe mere ọkụ a jiri gbawa", ka ọ gwara BBC.

Ụmụnne egbuola nwanne ha maka ego a tụkọtara iji lie nne ha

Nma

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nke a bụghị nke mbu a na-enwe ogbugbu site n'esemokwu di n'etiti di na nwunye.

Ụwa di egwu oo.

Ụmụnne egbuola nwanne ha ebe ha na-adọ ndọrọndọrọ gbasara ego a tụkọtara maka ili nne ha nwụrụlanụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ikeokwu Orlando kwuru na ihe a mere n'Obowo dị n'Imo steeti.

O kwuru na ọ bụ ebe ụmụnne anọ ahụ na-adọ ndọrọndọrọ ka otu onye n'ime ha were mma magbuo otu n'ime ha aha ya bụ Patrick Obieshieke.

O kwuru na mmadụ atọ ahụ lụsara Patrick ọgụ gbapụrụ mgbe ha hụrụ na ọ nwụọla. Ndị uweojii ka na-achọ ha kamgbe ụbọchị Fraide gara aga mgbe ihe a mere ruo ugbua ma ka na-enyocha etu o si mee.

Etu esi zọpụta ụmụnwaanyị 50 a tụrụ mgbere na Lebanon

Ụmụnwaanyị a tụrụ mgbere na Lebanon

Ebe foto si, Getty Images

A zọpụtala ụmụnwaanyị Naịjirịa dị iri ise, bụ ndị a tụrụ mgbere na mba Lebanon ma kpọlata ha Naịjirịa.

Dịka ọ dị ugbua e dosala ha n'ọnọdụ mwezuga onwe iji kee nkwụcha maka coronavirus ma a ga-agba ha ajụjụọnụ ịmata ka ha iji si wee gaa.

Minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama kwupụtara nke n'akara twitter ya sị na gọọmentị mba Lebanon nyere aka n'ịkpọlata ndị a.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ụmụnwaanyị ndị so n'ime ndị Naịjirịa dị iri isii na itoolu si Lebanon bata site n'enyemaka gọọmentị ha.

Uru dị n'ime anụ ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ gburu

Ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ

Ebe foto si, Louis Amoke/Facebook

Ndị gọvanọ na-achị mpaghara ọwụwanyanwụ ehiwela atụmatụ ndị ha kwuru ga-enye aka ka ala Igbo tolite nke ọma.

Atụmatụ ndị a bụ nke ha hiwere n'ọgbakọ ha n'Enugwu Steeti n'ụbọchị Sọnde metụtara nchekwa, ọrụ, azụmaahịa, nwulite obodo dgz.

Nke a si n'akwụkwọ ozi onyeisi ha bụ gọvanọ Dave Umahi wepụtara na ngwụcha ọgbakọ ha ahụ.

Ụfọdụ mkpebi ha rụtụrụaka gụnyere;

1.Ha chọrọ ka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ NCDC n'ịchafụ ka ha welitekwuo aka n'ime nyocha maka ọrịa coronavirus na mpaghara ọwụwanyanwụ.

2.Ha sị onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu ka ọ laghachị na nkwekọrịta ha gbasara nchekwa ime obodo nke bụ sị 'ndị omeiwu n'ọwụwanyanwụ mee iwu gbasara nchekwa ime obodo nke gbadoro ụkwụ na South East Joint Security programme.

Ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ

Ebe foto si, Louis Amoke/Facebook

3.Gbasara iwulite akụnaụba, ha kwekọrịtara na ha na ọtụ dịka 'World Bank', 'Central bank Of Nigeria', 'Nigeria Sovereign Investment Authority (NSIA)', nakwa 'Federal Govrenment of Nigeria (FGN)' ga-arụkọ ọrụ n'ihe gbasara ọrụ ugbo, SME na ọnatarachi.

4.Ha gakwara n'ihu kwuo na ha na ndịisi ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Corporation (NNPC) ga-ezukọ n'elu intaneti ma kpaa ka ha ga-esi jikọta okporo mmanụ gọọmentị etiti na nke isi obodo niile dị n'ọwụwaanyanwụ nke sirila Imo steeti ruo Legọs.

5.N'ihe banyere ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu Steeti, ha kelere onyeisiala Buhari nakwa minista na-ahụ maka njem ụgbọelu maka ọganihu ọrụ n'ebe ahụ ma kwee nkwa na ha nwere olileanya na a ga-emepe ya na nso nso a.

6.Ha kelekwara onyeisiala Buhari nakwa gọvanọ Willie Obiano nke Anambara Steeti maka ọrụ na-aga n'ihu n'akwa mmiri Niger nke abụọ.

7.N'ikpeazu ha kwuru ka ndịisi Ohaneze Ndigbo weta akwụkwọ ga-enyeaka n'ihiwe ihe a kpọrọ "South East Stabilization Fund" maka enyere ndị mmadụ aka.

Akụko ndị ga-amasị gị: