Hope Uzodinma akagbuola atụmatụ ịkwụ ndi chiburu Imo steetị ụgwọ ezumike nka

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook
Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma akagbuola atụmatụ ịkwụ ndị chịbụrụ steeti ahu dịka gọvanọ ụgwọ ezumike nka.
Ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Uzodinma bụ Oguwike Nwachukwu gwara BBC Igbo na o mere nke a makana ịkwụ ndị chịbụru steeti ụgwọ ezumike pụtara ịkwu ha ụgwọ ugboro abụọ.
Ọ sị: "Chetakwa na iwu Naịjirịa kwuru na tupu mmadụ etozuo ịnata ụgwọ ezumike nka, ọ ga-aru ọrụ ruo afọ iri. Nke a pụtara na ya bụru na ị na-akwụ gọvanọ ndị bịara nọ sọsọ afọ asatọ ụgwọ a, ị mara na ị na-ada iwu Naịjirịa nke 1999."
"Ọzọ were bụrụ na a na-enye ndị chịbụru steeti ego iti aka n'obi tupu ha arituo."
Maazi Nwachukwu sịkwa na ọtụtụ n'ime ndị a rụru ọrụ Bekee ma naa ezumike nka na-anatakwa ụgwọ ọnwa so ya.
Ọ sị na ihe mere atụmatụ a jiri magbuo onwe ya bụ na Hope Uzudinma ma na ihe ga-emetụtakwa ya tupu ọ gaa n'ihu ga mee ya.
Ọ bụ n'ụbọchị Fraịdee ka Uzodinma binyere aka n'iwu ndị omeiwu Imo steeti nyere ya banyere ịkwụ ụgwọ ezumike ndị chịbụrụ steeti.
Iwu ọhụrụ metụtakwara ọkwa niile gụnyere: osote gọvanọ, ọnụ na-ekwuru ụlọomeiwu nakwa osote ọnụ na-ekwuru ụlọomeiwu.
Ọ pụtara na ọ ga-emetụta Achike Udenwa, Ikedi Ohakim, Rochas Okorocha nakwa ndi osote ha.
Cheta na ọ bụ n'afọ 2007 ka amalitere atụmatụ ịkwọ ndị chịbụru steeti ụgwọ ezumike nka.
Ọtụtụ steeti na Naịjirịa sokwa eme ụdịrị ihe a.









