Imo state: Osote onyeisi ụlọomeiwu Imo agbaala arụkwaghịm

Ebe foto si, Twitter/Nass
Osote onyeisi ụlọ omeiwu atụbala akwụkwọ arụkwaghị m
Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na osote onyeisi ụlọomeiwu n'Imo steeti bụ Ugonna Ozurigbo agbala arụkwaghị n'ọkwa ya dịka osote onyeisi ụlọomeiwu.
Ịgba arụkwaghịm na-abịa n'otu ụbọchị ndị ụlọomeiwu Imo steeti kwụsịrị onyeisi ha bụ Acho Ihim ọrụ maka mbuli o buliri mmachi ndị isioche okpuruọchịchị obodo.
Nke a mere ndị na-ajụ "Kedụ ihe na-emezi n'ụlọomeiwu Imo Steeti"? n'agbanyeghi na ọ fọrọ naanị otu izuụka ka a banye n'ọchịchị ọhụrụ.

Ebe foto si, Imo Assembly
N'akwụkwọ arụkwaghịm nke o zitere n'ụlọomeiwu Imo, o kwuru na ọ bụ ka o nwe ohere rụọ ọrụ dịka onye nnọchiteanya n'ụlọomeiwu Naịjirịa bụ nke o nwetere na ntuliaka gara aga.
Ozurigbo gara n'ihu kele ndị omeiwu ibe ya nakwa ndị Imo steeti maka inye ya ohere, ị rụrụ ha ọrụ dịka osote onyeisi ụlọomeiwu n'Imo steeti.
Ndị 'Operation Puff Adder'

Ebe foto si, Nigerian Police
Ndị uweojii nke Naịjirịa ekwuola na ndị ọrụ ha nke ngalaba 'Operation Puff Adder' anwụchiela ihe ruru mmadụ iri itoolu na atọ bụ ndị o ji egbe ezu n'ime izuụka abụọ na-akpa ike na Kaduna, Niger na Katsina Steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Frank Mba kwuru nke a n'obodo Katari dị n'ụzọ si Kaduna gawa Abuja.
O kwuru na ndị uweojii ọrụ ha ibuso ndị ohi, ndị ntọrị nakwa ndị omekaome agha natara ha ngwa egbe karịrị narị ise.
Ụlọomeiwu anabata Emefiele

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ụlọomeiwu etinyeaka n'akwụkwọ kwadoro onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ Godwin Emefiele ịnọ n'ọkwa ahụ ruo afọ ise na-abịa abịa.
Na nke yiri ibe ya, ụlọomeiwu gakwara n'ihu gbanwe ụbọchị ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya nke Naịjirịa site n'ụbọchi iri abụọ na itoolu ọnwa Mee gaa n'ụbọchị iri na abụọ ọnwa Juun.
Gọvanọ Ikpeazu enwetela mmeri n'ụlọikpe

Ebe foto si, John Okiyi
Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka n'Abia Steeti akachapụla mkpesa abụọ nke Kelenna Ogbonna bụ ọkaiwu pati ADC na APP mere megide mmeri gọvanọ Okezie Ikpeazu na ntuliaka afọ 2019.
Ụlọikpe a kwuru na ndị mere mgbesa apụtaghị n'ịhụ ụlọikpe bịa zara ọnụ mgbesa ha.
Nke fọrọ bụ mkpesa Alex Otti na Uche Ogah bụ nke a ga-ebe anya n'ụbọchị iri abụọ na asaa ọnwa Mee.
N'ofesi

Ebe foto si, Reuters
Theresa May bụ Praịm Mịnịsta mba Briten a nabatala ọkụ ndị ụlọomeiwu na-akwa ya maka họpụta ụbọchị a ga-eme ntuliaka onye ga-anọchi anya ya.
Akụkọ kwuru na May ga-agba arụkwaghịm n'ọrụ ma ọ bụrụ na ọ daa na ntuliaka 'Brexit' na-abịa n'ọnwa Juun.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Nwafọ Naịjrịa a kpọrọ Fikayo Tomori a mụrụ na mba Canada na-agbara Chelsea bọọlụ kwuru na ọ dị njikere ịgbara Super eagles bọọlụ ma ọ bụrụ na-akpọọ ya oku.
Tomori kwuru na ọ hụla ụkwụ bọọlụ ndị Canada na England mana nke Naịjirịa ga-akara mma.
Nkeji
Ihe nkiri
Umahi omeriela n'ụlọikpe?

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT
Ụlọikpe chere were bụ 'election tribunal' dị n'Abakaliki, Ebonyi steeti, ewezugala akwụkwọ Sunny Ogbuoji nke APC gbara Gọvanọ Dave Umahi nke PDP maka ntuliaka e mere n'ọnwa Maachị, afọ 2019.
Ọkaikpe Sunny Ogbuoji bụ Michael Odo, sị na ha achọkwaghị ịga n'ihu na ya bụ Ikpe mere na ụlọikpe ahụ dara ha nha otu puku narị narịa maka nke ahụ.
'Kwusịkwa Emirate ozugbo!'

Ebe foto si, Uche Akolisa
N'akụkọ ọzọ dịka ibe ya, ụlọikpe ukwu na Kano steeti agwala ndị gọọmenti ebe ahụ ha sepu aka n' ikeri oche eze obodo ahụ ụzọ anọ dịka ha mere.
Jọstis Nasiru Saminu bụ onye kpebiri ya bụ ikpe kwuru na gọọmenti kachiri nti kpunye ndị eze ahụ okpu na abali iri na atọ ebe ụlọikpe a kpebiri ya bụ ikpe n'abali iri nke ọnwa Mee.
Mana gọọmenti sị na nke a abụghị eziokwu.
Trump enyela ikike ka akwụsi iji ndị IT mbịara mbịara rụọ ọrụ n'US

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi, onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump enyela iwu ka ha amachie ụlọọrụ cọmpụta ndị mbịa mbịa ịrụrụ ndị mba Amerika ọrụ.
Onweghi ndị akpọrọ aha na ya bụ iwu mana a na-ele anya na ya bụ iwu n'arụgara ọlụọrụ Hauwei aka maka ebubo a na-ebobo na China nwere ike iji ya yopuo ihe ndị mba ọzọ na-eme.
Sharapova apụọla na French Open

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, oke nwaanyị mba Russia eji tennis mara bụ Maria Sharapova sị na ya agaghị eso n'asọmpị French Open nke afọ a ga-amalite na abali iri abụọ n'isii nke ọnwa Mee a.
Nke a bụ maka ekwo o chikwopuru mgbe gara aga.












