China na Amerika na-ama aka n'ihu

Xi Jinping onyeisiala China na Donald Trump, onyeisiala Amerịka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Xi Jinping, onyeisiala China na Donald Trump, onyeisiala Amerịka

China kwuru na ha na-atule ibido nawa ego n'isi ngwa ahịa mba Amerịka ruru ijeri dọla atọ($3b) iji mekwara ụgwọ ọhụrụ nke onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump manyere na nwaga ahịa si China.

Ngwa ahịa ndị China na-atule itinye ụtụisi na ha gụnyere anụezi, mmanya, mkpụrụosisi, ọpapa, na paịpụ na-anaghị ata nchara na ndị ọzọ.

N'otu aka ahụ, China agwala Amerịka ka ọ gbara ihe ga-eme ka mekọrịta azụmaahịa dị na-etiti Amerịka na China 'gbajọ.'

Beijing kwuru na ha na-ele anya na Amerịka ga-adụ azụ, ma ghara idu banye mba abụọ ahụ n'ọgụ azụmaahịa.

Ezi
Nkọwa foto, Ndị China na-atụbata ezi na ihe ejiri anụ ya mepụta ebe ọ dị ukwuu

Ụbọchị Tọọsde, Amerịka kwuru na ha ga-amanye ụtụ ruru ijerị dola iri isii($60bn) na ahịa e si China tụbata ma belata ihe China na-etinye na Amerịka.

Nke a bụ iji kwụsị ozuzu n'ohi mmepụtachi nke China merela ọtụtụ afọ.

Mana n'ụbọchị Fraide, mịnịstrị nke China na-ahụ maka azụmaahịa kwuru na mmekọrịta azụmaahịa bụ 'ihe ziri ezi ma jaa Amerịka ka ọ họrọ iji mkparịtaụka dozie okwu iji gbanarị ịmebi ihe.

China kwuru na ha achọghị ọgụ azụmahịa mana egwu ọgụ anaghị atụ ha.

Ụkwụ mbụ ha ga-atụpụ bụ ma ọ bụrụ na Amerịka jụụ inwe nkwekọrịta, ebe nke abụọ ga-abụ ma ha tulecha ụtụ Amerịka tụkwasara na ngwa ahịa e si China bubata Amerịka.

Gn mere Amerịka jiri mee nke a

Amerịka na-atụbata ahịa ijeri kwuru ijeri karịa China kwa afọ karịa ka ọ na-ebubata nke mere ka ha nwe imefu ihe dịka ijeri dola narị atọ, iri asaa na ise($375bn) afọ gara aga- nke mere ka Trump kwugide ya.

China kwukwara na ha ga-agba Amerịka akwụkwọ n'otu azụmaahịa mba ụwa a kpọrọ, 'World Trade Association' na bekee, maka na Amerịka kwuru na ọnwa gara aga na ha ga-etinye ego ụtụ n'ahịa igwe stịl na alụminiọnụ.

Egwu na-atụ ndị ahịa na China na Amerịka na-achọ ibido ọgụ ahịa.

Akụkọ ga-amasị gị: