China na Amerika na-ama aka n'ihu

Ebe foto si, Getty Images
China kwuru na ha na-atule ibido nawa ego n'isi ngwa ahịa mba Amerịka ruru ijeri dọla atọ($3b) iji mekwara ụgwọ ọhụrụ nke onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump manyere na nwaga ahịa si China.
Ngwa ahịa ndị China na-atule itinye ụtụisi na ha gụnyere anụezi, mmanya, mkpụrụosisi, ọpapa, na paịpụ na-anaghị ata nchara na ndị ọzọ.
N'otu aka ahụ, China agwala Amerịka ka ọ gbara ihe ga-eme ka mekọrịta azụmaahịa dị na-etiti Amerịka na China 'gbajọ.'
Beijing kwuru na ha na-ele anya na Amerịka ga-adụ azụ, ma ghara idu banye mba abụọ ahụ n'ọgụ azụmaahịa.

Ụbọchị Tọọsde, Amerịka kwuru na ha ga-amanye ụtụ ruru ijerị dola iri isii($60bn) na ahịa e si China tụbata ma belata ihe China na-etinye na Amerịka.
Nke a bụ iji kwụsị ozuzu n'ohi mmepụtachi nke China merela ọtụtụ afọ.
Mana n'ụbọchị Fraide, mịnịstrị nke China na-ahụ maka azụmaahịa kwuru na mmekọrịta azụmaahịa bụ 'ihe ziri ezi ma jaa Amerịka ka ọ họrọ iji mkparịtaụka dozie okwu iji gbanarị ịmebi ihe.
China kwuru na ha achọghị ọgụ azụmahịa mana egwu ọgụ anaghị atụ ha.
Ụkwụ mbụ ha ga-atụpụ bụ ma ọ bụrụ na Amerịka jụụ inwe nkwekọrịta, ebe nke abụọ ga-abụ ma ha tulecha ụtụ Amerịka tụkwasara na ngwa ahịa e si China bubata Amerịka.
Gịnị mere Amerịka jiri mee nke a
Amerịka na-atụbata ahịa ijeri kwuru ijeri karịa China kwa afọ karịa ka ọ na-ebubata nke mere ka ha nwe imefu ihe dịka ijeri dola narị atọ, iri asaa na ise($375bn) afọ gara aga- nke mere ka Trump kwugide ya.
China kwukwara na ha ga-agba Amerịka akwụkwọ n'otu azụmaahịa mba ụwa a kpọrọ, 'World Trade Association' na bekee, maka na Amerịka kwuru na ọnwa gara aga na ha ga-etinye ego ụtụ n'ahịa igwe stịl na alụminiọnụ.
Egwu na-atụ ndị ahịa na China na Amerịka na-achọ ibido ọgụ ahịa.
Akụkọ ga-amasị gị:









