Sexual harassment bill: Bukola Saraki akpọọla oku ka gọọmenti bulite ya ọzọ

Bukola Saraki

Ebe foto si, TWITTER/@BUKOLASARAK

N'otu aka ahụ onye bụbu onyeisi na ụlọomeiwu Naịjirịa ukwu bụ Bukola Saraki arịọla Onyeisiala Muhammadu Buharị na ndị omeiwu ka ha lebeanya n' iwu gbasara ndị nkuzi na-emerụ ụmụakwọkwọ nke ha malitere n'ọchịchị ya.

Saraki kpọro ọkụ a ka o kirichara ihe nkiri nke BBC Africa Eye mere gbasara ndị nkụzi na-emebi ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyi site na ịna ha ahụ ha ka ha were lafere n'uleakwụkwọ.

Iwu ahụ emechabeghị nyere mkpọrọ afọ ise maka onye nkụzi ọbụla mere nke a.

Foursquare Church eyipula Boniface uwe

Boniface gbeneghu

Dịka ụzụ na-atụ maka onye nkuzi Unilag bụ Boniface Igbeneghu emume BBC agbara na-anwụ maka imebi ụmụagbọghọ, ozi na-eru anyi nti bụ na ụka ya bụ Foursquare Gospel Church eyipụla ya uwe nsọ ya.

N'otuaka ahụ Ụlọakwụkwọ Unilag sị na ha anapụla ya bụ nwaadị ọrụ ya nwamgbenta.

Ransford Gyampo na-aba mba

Ransford Gyampo

Ebe foto si, Ransford Gyampo/facebook

Ka ọ na-akpọtụ na Naịjirịa bụ ka ọ na-akpọtụ na mba Ghana ebe onye nkụzị ya bụ ihe nkiri BBC gbara na-anwụ na-agọ ụkwụ na aka.

Ransford Edward Gyampo ekwuola na ya ga-akpọpụ BBC Afrịka Eye ụlọikpe maka ịhe nkiri ahụ gbara ya n'anwụ.

David de Gea ekwuola hoo haa

David De Gea

Ebe foto si, ALLSPORT/Getty Images

Nkọwa foto, David De Gea bụ golii ndị Manchester United

N'egwuregwu, onye na-echere Manchester United goolu bụ David de Gea ekwuola nke bụ eziokwu maka ọnyụpa ndị otu ya na agba n'ọgbọ a.

Gea sị na ọgbọ a kacha njọ kemgbe afọ iri atọ nke otu egwubọọlụ ahụ bụ nke ọ sị na ya ahụbeghị

Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị