Anambra State: Ihe akụ ọnatarachi juru na steeti a

Ụmị mmanụ agbidi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmị mmanụ agbidi
    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Ahịa otu nkwọ Ọnịcha n'Anambra Steeti bụ ahịa kacha ukwu na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka niile.

Nke a mere na e kwuo okwu ịzụ ahịa na Naịjirịa, a ga-akpọrịrị Anambra.

Nke a pụtara na-achụcha ya bụ aja ma ahụghị udele, mara na ihe mere be ndị mmụọ.

Mana ọbụghị sọ ahịa ka steeti a ji dị ebube.

Ha nwekwara ihe akụ ọnatarachi dị icheiche juputara n'ala ha.

Lee ụfọdụ n'ime ha ebe a dịka ụlọọrụ 'Raw Materials Research & Development Council' si depụta:

1) Mmanụ agbidi

Ụmị mmanụ agbidi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmị mmanụ agbidi

Agbanyeghi na Anambra esoghi na steeti ndị a ma ama na Naịjiria na-emepụta mmanụ ala, nke ahụ apụtaghị na ha enweghị mmanụ n'uju.

Okpuru ọchịchị Anambra, Mbamili nakwa Ogbaru nwere mmanụ ala nke ọma.

Gaasị dịkwa na mpaghara ndị ahụ n'uju.

2) Kaolin

'Kaolin'

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, 'Kaolin'

'Kaolin' bụ ụdị nkume pụrụiche e nwere ike iji mee 'Ceramics', maọbụ werekwa ya rụọ ọgwụ.

E jikwa 'Kaolin' arụpụta ude na-edozi anụ ahụ nakwa ihe e ji eme ka eze na-egbuke ọcha.

Dịka webụsaịtị 'statista.cọm' si depụta, a na-ere 'Kaolin' $140 maka otu tọn.

Mpaghara Aguata, Ayamelum, Ihiala, Njikoka na Nnewi, nwere Kaolin n'ala ha.

3) Pyrite

Pyrite

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Pyrite

'Pyrite' bụ ụdị igwe (metal) pụrụiche na-egbuke egbuke e si n'ala egwupụta.

A na-eche na ebe ọbụla a hụrụ 'Pyrite', ọlaedo nwere ike ịdị n'okirikiri ahụ.

'Pyrite' na-enwekwa ajịrịja ọlaedo n'ime ya nke bụ na a gbarie ya, e nwere ike ịnweta kịrịkịrị ọlaedo.

A na-ejikarị ya emepụta mgbaolu, mgbaaka, nakwa ọla ndị ọzọ e ji eji ejiji.

Mana ọ galaghị oke ọnụ dị ka ọlaedo.

Ị ga-ahụ 'Pyrite na mpaghara Ọnịcha Nọt na Ọnịcha Saụt nakwa Oyi.

4) Lignite

'Lignite' bụ ihe dịka unyi (coal)

Ọ na-esi n'osisi kpọnwụrụ akpọnwụ nke relara n'ala puku kwuru puku afọ gara aga apụta.

A na-akpọkwa 'Lignite' 'Brown Coal' maọbụ 'Brown Diamond'.

E nwere ike iji 'Lignite' emepụta ọkụ latrik.

Kama ndị ọkacha mara kwuru na 'Lignite' adịghị mma maka na ọ na-ebute mgbanwe ihu eligwe nke a kpọrọ 'climate change'.

Ọkụ latrik e ji ya mepụta na-aka adị ọnụ ala karịa nke e ji 'coal' maọbụ gaasị mepụta.

Lignite dị na mpaghara Idemili West, Nnewi North nakwa Ọnịcha Not na Saụt.

5) Sand stone

Sand stone

Ebe foto si, mineralseducationcoalition.org

Nkọwa foto, Sand stone

'Sand stone' bụ ụdị okwute si n'aja ọcha apụta.

Okwute a na-egbuke egbuke ma makwaa mma ile anya.

Mana o sichaghị ike dị ka nkume ndị ọzọ.

Ya mere a na-eji ya edozi ahụ ụlọ maọbụ achọ ya mma.

I gaa na akụkụ Aguata ụfọdụ, Aniocha, Idemili, ị ga-ahụ 'Sand stone' nke ọma.

Ọ dịkwa na akụkụ ụfọdụ n'Ọnịcha nakwa Oyi.

6) Lateritic Clay

Laterite e ji rụọ ụlọ.

Ebe foto si, Getty Images

Nke a bụ aja ụpa pụrụ iche

E ji ya arụ ihe dị icheiche dịka ụzọ nakwa akụrụngwa ndịọzọ e ji arụ ụlọ.

A na-ahụ aja ụpa a n'ọkụ iji mee ka ọ kpọọ nkụ ma sie ezigbo ike tupu ewere ya rụpụtawa ihe dị icheiche.

'Laterite' bara ụba n'okpuru ọchchị Orumba Nọt na Saụt.

7) Iron Stone

Iron Stone

Ebe foto si, Getty Images

'Iron Stone bụ ụdị nkume pụrụiche.

Ọ na-enwetụ kịrịrị igwe n'ime ya.

Ụfọdụ na-enwekwa kịrịkịrị ọlaedo n'ime ha.

Ihe ejikarị ya eme bụ ịgbari ya iji nweta igwe maọbụ ọlaedo dị n'ime ya.

E jikwa ya arụ ụlọ.

Mana ọbụchaghị okwute dara oke ọnụ ahịa.

Ebe ụdị nkume a dị bụ n'akụkụ ụfọdụ n'okpuruọchịchị Anambra East nakwa Orumba Nọt na Saụt.

Ihe akụ ndị a nwere ike ime ka nnweta ego bawanye na Anambra ma ọ bụrụ na gọọmentị steeti ahụ na gọọmentị etiti jikọọ aka ọnụ.

Anambra nwekwara ala na-amịpụta nrị nke ọma, na-agbanyeghị na mbuze na-enye nsogbu ebe ahụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Youths Talk: Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na inwe ohere ichi Naịjirịa?