Oby Ezekwesili, Dora Akunyili na agbara nwaanyị ndị ọzọ si Anambra state Nigeria enweghi ike ichefu

Chioma Akpota, Chimamanda Adichie na Oby Ezekwesili

Ebe foto si, BBC/Chimamanda Adichie/Oby Ezekwesili

    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Akụkọ gbasara Naịjirịa enweghi ike izu oke ma ọ bụrụ na akpọpụtaghị aha ụfọdụ ụmụnwaanyị Anambara steeti.

Ụmụnwaanyị a emeela ọtụtụ ihe n'ụzọ dị iche iche, ndị mmadụ agaghị akọcha ma n'ọnwụ ha.

A bịa n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, nchekwa akụnaụba nakwa ihe ndị ọzọ, ha kwụ chịm.

Ngwa lee ka BBC Igbo si agba ha n'anwụ:

Sharon Ikeazor

Ikeazor

Ebe foto si, Twitter/Sharon Ikeazor

Nkọwa foto, Ikeazor rụrụ dịka onyeisi ndị Pension Transitional Arrangement Directorate (PTAD) tupu e mee ya minista

Ikeazor bụ Minista steeti na-ahụ maka Gburugburu nke Bekee kpọrọ Ministry of Environment.

O so n'ime ụmụnwaanyị asaa Onyeisiala Muhammadu Buhari họpụtara maka ọchịchị n'ụbọchị 21 nke Ọgọstụ 2019.

Oby Ezekwesili

Oby Ezekwesili

Ebe foto si, Oby Ezekwesili

Nkọwa foto, Ezekwesili bụ ezigbote agbara nwaanyị a ga-akpọ "a kwaa a kwụrụ" n'okwu gbasara Naịjirịa.

A ga-akọ ole ghara ole maka nwaanyị a pụtara ịzọ ọkwa onyeisiala, na-ama gọọmentị aka n'ihu ma bụrụkwa onye na-ebu ịzọta ikike dịrị onye n'isi?

Ezekwesili arụọla dịka minista ugboro abụọ na Naịjirịa oge Olusegun Obasanjo chịrị, ma sorokwa n'ime ndị Naịjirịa rụtụrụla na ngalaba ụlọakụ mbaụwa a na-akpọ World Bank.

A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Epreelụ 1963.

Virgy Etiaba

Virgy Etiaba

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Etiaba chịrị site n'ụbọchị abụọ nke Nọvemba 2006 ruo Juun 13 nke 2007.

Ị ma na ọ bụ Etiaba bụ nwaanyị mbụ chịrị steeti ọbụla na Naịjirịa?

Virginia Etiaba bụbu osote gọvanọ Anambara steeti, rigoro ọchịchị ka ndị ụlọomeiwu steeti ahụ chụturu Peter Obi bụ gọvanọ oge ahụ.

A mụrụ ya n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba 1942, dịka wikipedia si kwuo.

Stella Oduah:

Stella Oduah

Ebe foto si, Stella Oduah/Facebook

Nkọwa foto, Oduah arụọla dịka sinetọ na-anọchite anya ndị Anambara Nọt n'ụlọomeiwu ukwu afọ

Agaghị akọwa akụkọ ọdọ ụgbọelu dị n'Enugwu ghara ịkpọta Oduah aha.

Ọ gbara mbọ hụ na e mezigharịrị ya mgbe ọ na-arụ dịka minista na-ahụ maka njem ụgbọelu n'okpuru ọchịchị Goodluck Jonathan.

A mụrụ ya n'ụbọchị ise nke ọnwa Jenụwarị, 1962.

Dora Akunyili

Dora Akunyili

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, O nwetara nturuugo ruru narị itoolu n'ọrụ ọ rụrụ

Otu nwaanyị a na-asị "unu abịala"; nwaanyị a mere ihe e ji echeta ya ma n'ọnwụ.

Akunyili zọrọ ọtụtụ ndị mmadụ ndụ site n'ibuso ndị na-arụpụta ọgwụ adịgboroja agha, oge ọ rụrụ dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ a kpọrọ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC).

Ọ rụrụ dịka minista na-ahụ maka mgbasa ozi site n'afọ 2008 ruo 2010, tupu ọ zọọ ọkwa onye omeiwu ukwu ga-anọchite anya ndị Anambra Sentralụ; mana Chris Ngige ekweghi ya zọta oche ahụ.

A mụrụ ya n'ụbọchị 14 nke ọnwa Julaị 1954, ọ nwụọ n'ụbọchị asaa nke ọnwa Juun 2014.

Uche Ekwunife

Uche Ekwunife

Ebe foto si, Uche Ekwunife/Facebook

Nkọwa foto, Ekwunife rụkwara dịka onye nnọchiteanya n'ụlọomeiwu nta.

Ekwunife arụọla dịka sinetọ na-anọchite mpaghara Anambara-Sentralụ site n'afọ 2015 mgbe ya na Victor Umeh zọrọ oche ahụ.

Ọ kwara ya dịka o si otu pati wụkpuo na pati ọzọ mana o mechara, zọtakwa oche ahụ ọzọ na ntuliaka 2019.

Ọ gụrụ akwụkwọ ma rụọ ọrụ dịka onye ọrụ ụlọakụ tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị.

A mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Jenụwarị, 1970.

Stella Okoli

Stella Okoli

Ebe foto si, Facebook/Stella Okoli

Nkọwa foto, O nwetala nturuugo Officer of the Order of the Niger, OON nakwa Member of Order of Nigeria, MON

Okoli so na ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'ihe gbasara ahụike na Naịjirịa.

Ụlọọrụ ya na-emepụta ọgwụ ndị mmadụ na-eji achụ ọrịa dị iche iche malitere dịka ọnụahịa ebe ọ na-ere ọgwụ.

A mụrụ ya n'ụbọchị 30 nke ọnwa Julaị nke afọ 1944.

Chimamanda Adichie

Chimamanda Adichie

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Adichie bụ onye odeeakwụkwọ a ma ama na mba ụwa niile

Adichie so n'otu ada ndị Anambara ji aba mba ma na Naịjirịa ma na mba ụwa gbaa gburugburu.

Ọ bụ site n'ihe o detere n'akwụkwọ dịka ode akwụkwọ pụrụiche? Ka ọ bụ site n'okwu o kwutere site na nkwenye o nwere na nwoke na nwaanyị ha nhatanha nke a kpọrọ "feminism" na Bekee?

A ga-ekwu ole ghara ole ebe ọ gbasara nwaada a? Ọ bụ otu onye ọ na-abụ o kwuo okwu ebe niile enwuru ọkụ.

O nwetala ọtụtụ nturuugo nakwa ihe nrite karịrị iri.

A mụrụ ya n'ụbọchị 15 nke ọnwa Septemba 1977.

Lynda Chuba Ikpeazu

Lynda Chuba Ikpeazu

Ebe foto si, Facebook/Lynda Chuba Ikpeazu

Nkọwa foto, Chuba-Ikpeazu bụ "nwaanyị kacha maa mma na Naịjiria" nke afọ 1986 ma bụrụkwa "Miss Africa" nke afọ 1987.

Ọ bụrụ na ị chetaghị ya maka nke ahụ, ị cheta ya dịka nwaanyị na-amuke ka anyanwụ ụtụtụ n'ụlọomeiwu nta ebe ọ rụrụla dịka onye nnọchiteanya ndị Ọnịcha Nọt-Saụt site n'afọ 1999 ruo ugbua.

Ọ gụrụ akwụkwọ ịbụ ọkaiwu, onye mgbasaozi nakwa azụmahịa.

A mụrụ ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Juun, 1966.

Ndidi Nwuneli

Ndidi Nwuneli

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwuneli na-acha ka anyanwụ ụtụtụ bụ onye ịrụ ọrụ n'efu na-amasị, ihe gbasara Igbo na asụsụ ya na-amasịkwa ya nke ukwuu.

Ihe gbasakwara ngwa e ji esi nri doro ya anya, mere o ji jiri ya merekwa ọrụaka.

O nwetala nturuugo Member of the Order of the Federal Republic (MFR).

A mụrụ ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Maachị, 1975.

Chioma Chukwuka-Akpotha

Aha onyonyo, Chioma Akpotha: Ugwu ka e jiri mara nwaanyị Afrịka

Akpotha malitere ime ejije na Nollywood n'afọ 2000, egosila na ọ bụ "dike n'agha" na ngalaba ahụ.

O nwetala ihe nrite na nturuugo, ma soro na ndị aha ha na-ewu ewu maka akaọrụ ha na Naịjirịa.

A mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Maachị 1980.

Clarion Chukwurah

Clarion Chukwurah

Ebe foto si, Instagram/Clarachukwurah

Nkọwa foto, E chiri ya echichi "Ada e ji eje mba 1" nke ndị Ọnịcha.

Chukwurah so na ndị a ga-akpọ anụ a na-agba egbe ọ na-ata nri ma a bịa n'ihe gbasara ime ejije na Nollywood.

O meela ọtụtụ ejije a ga-eji cheta ya kemgbe 1980 ọ malitere.

A mụrụ ya n'ụbọchị 24 nke ọnwa Julaị, 1964.

Kate Anolue

Kate Anolue

Ebe foto si, Enfield Council

Ọ bụ onye ọkaiwu ma bụrụ onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị na ụmụaka.

A mụrụ ya n'ọnwa Mee n'afọ 1949.

Sally Mbanefo

Sally Mbanefo

Ebe foto si, Facebook/Sally Mbanefo

Mbanefo gụrụ akwụkwọ dịka onye ọrụ ụlọakụ, arụọla dịka onye na-elekọta ihe gbasara nlegharị anya nke Bekee kpọrọ "Tourism" oge Goodluck Jonathan chịrị.

Gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obiano nyekwara ngalaba ahụ ma tụkwasịrị ya ihe gbasara ndị Naịjiria bi na mba ofesi ka ọ na-elekọta dịka kọmishọna na steeti ya.

A mụrụ ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Febụwarị, 1965.

Chi Onwurah

Chinyelu Onwurah

Ebe foto si, Labour Party

Nkọwa foto, A mụrụ ya na mba Briten mana ezinaụlọ ya lọtara Ọka n'otu afọ ahụ, mana ha nne ya kpọrọla ha laghachị Briten mgbe agha Biafra nke nna ya so n'ime ya, dapụtara.

Onwurah bara ọchịchị dịka onye omeiwu na-anọchite anya ndị obodo Newcastle Sentralụ na mba Briten, n'ọnwa Mee, 2010, ebe ọ nọ ruo ugbua.

Nke a mere ka ọ bụrụ nwaanyị mbụ bụ onye isi ojii ga-abụ onye omeiwu n'ụlọomeiwu ndị Briten.

A mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Epreelụ 1965.

Chinwe Chukwuogo-Roy

Chinwe Chukwuogo-Roy

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E mere ya "Member of the Most Excellent Order of the British Empire" n'afọ 2009

Chukwuogo-Roy bụ nwaanyị isi ojii mbụ sere eserese Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ nke mba Briten.

A mụrụ ya n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Mee afọ 1952, mana ọ nwụrụ n'ọnwa Disemba 2012.

Ụmụnwaanyị ndị ọzọ gụnyere Josephine Anenih, Flora Azikiwe, Joy Emordi, Nelly Uchendu nakwa Ngozi Ezeonu.

Kedụ ndị ọzọ kwesịrị ịnọ n'akụkọ a?

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Gịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?