Nigeria Election 2019: Ụmụnwaanyi chọrọ ịnapụ Buhari ọrụ ya

Ụmụnwaanyị na-azọ ọkwa onyeisiala

Ebe foto si, Twitter

Na ntuliaka 2019, ka ụmụnwoke juru n'ọsọ ịzọ ọkwa onyeisiala, ụmụnwaanyị achọghị ịgba aka mere ka ihe ruru mmadụ atọ tinyere ụkwụ n'ọsọ ahụ.

Ụmụnwaanyị ndị a meriri na ntuliaka imeụlọ ndị pati ha mere, na-atụanya ịbụ onye ga-achụpụ Onyeisiala Muhammadu Buhari n'oche na 2019.

Nke a abụghị mbụ ụmụnwaanyị na-azọ ọkwa onyeisiala na Naịjirịa.

Sarah Jubrin zọrọ n'afọ 2011, ebe Comfort Oluremi Sonaiya zọrọ n'okpuru otu pati KOWA na 2015.

Cheta na nso nso a, Oby Ezekwesili gwara ọkwọụgbọ "kwụsị , ka ọ pụọ" n'ọnwa Jenụwarị afọ a.

1) Eunice Atuejide

Eunice Atuejide

Ebe foto si, Eunice Atuejide

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Ọgọst 1978.
  • Ọ bụ onye Enugwu steeti.
  • O hibere pati ya bụ "National Interest Party (NIP)" n'afọ 2017.
  • Ọ bụkwa onye ọkaiwu n'ụlọikpe kachasị na Naịjirịa.
  • Ọ bụkwa onye achụmnta ego.
  • Ọ na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati NIP.

2) Olufunmilayo Adesanya-Davies

Olufunmilayo Adesanya-Davies

Ebe foto si, @profFunmi/Twitter

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Ọktoba 1962.
  • Ọ na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati Mass Action Joint Alliance (MAJA) ma bụrụkwa onye na-efe ọkọrọtọ ndị "Coalition of United Political parties (CUPP)" na ntuliaka 2019.
  • Ọ bụ ọkammụta n'ihe gbasara asụsụ nakwa onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara agụmakwụkwọ.
  • Ọ bụkwa ọkammụta n'ihe gbasara ọmụma Chineke ma nwee asambodo dọktọreti n'ihe gbasara ọmụma Chineke.

3) Angela Johnson

Angela Johnson

Ebe foto si, Twitter/@AngelaCampaign

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Nọvemba 1959.
  • Ọ bụ onye Abịa steeti.
  • Ọ bụ ụkọchukwu ma bụrụkwa odeakwụkwọ ndị ụka.
  • Ọ bụ ọkaiwu.
  • Ọ na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati Alliance for a United Nigeria (AUN).

4) Rabia Cengiz

Rabia Cengiz

Ebe foto si, Twitter/@DrHajiya

  • Ọ bụ dọkịta
  • Ọ bụ onyeisi nakwa onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati National Action Council (NAC).
  • Ọ bụ onye hibere nakwa onyeisi otu na-ahụ maka ụmụnwaanyị a kpọrọ Women Political Enlistment Campaign.