Nigeria Elections 2019: Ihe ise bụ ọgbaraigbogharị merela

Ebe foto si, Uche Akolisa
Ntuliaka na Naijiria bụ egwu agwara ọgwa nke bụ na chị bọọ a nụ ọzọ.
Mana o nwere ihe ndị mere nke ọ bụrụ na dịbịa gbara ya n'afa, ọtụtụ ga-asị na ya bụ dibịa amaghị ọrụ n'ihi ka ha siri tụọ ọtụtụ ndị mmadụ n'anya .
Lee ụfọdụ n'ime ha:
1. Oby Ezekwesili chịsara ọwa n'ọsọ onyeisiala

Ebe foto si, @obyezeks
Ọ gbara ọsọ achụmta vootu ya dịka onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha otu ACPN ka dịmkpa.
Ọ gara ọtụtụ obodo, ya na otu dị che iche mere ọgbakọ, ebe o nwe mkparịaụka ya na ndị ntaakụkọ ịgwa ọha ebumnuche ya.
Mana ka ọ fọrọ naanị otu ọnwa ka e mee ntuliaka, Oby Ezekwesili chịsara ọwa.
O kwuru na ọ bụ iji nye ohere ka ya na ndị ọzọ jikọta aka ọnụ were chutuo otu APC na PDP n'ọchịchị.
Ọ rịọrọ ndị kwenyere ya mgbaghara.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Oge o jiri mee ya na ihe o kwuru kpatara ya tụrụ ndị mmadụ n'anya.
O wutere ụfọdụ chere na ya na Kingsley Moghalu bụ ndị nwere ntozu ịzọpụta Naijiria n'ime ndị sonyere na ndọrịtaụka ndị na-azọ ọkwa onyeisiala e mere ụbọchị January 19.
2. Pati ACPN ikwado Buhari na 2019

Ebe foto si, @oby2019
Ka ndị mmadụ ka na-eche ihe eme Ezekwesili ijiri gbanyụọ ọkụ oge e chere na ọ ga ekwo ụra ekwo, pati ya bụ ACPN dọnyere Buhari ukwu maka 2019.
Ekwesili kwuru na agwa pati ya kpara naanị ka ọ gachara otu abalị ya rituru gosiri na ihe ha ga-erita ka ha mkpa karia ọdịmma Naijiria.
3. Red Card ịdonyere Atiku ukwu

Ebe foto si, @RedCardMng
Otu Red Card bụ otu Ezekwesili bụ isi e jiri kwawa okpu ha maka ịnapụ otu APC na PDP ọchịchị tụrụ ụmụ Naijiria n'anya oge ha kwuru na ha na-akwado Atiku na ntuliaka 2019.
Ha kwuru na nke bụ iji 'zọpụta naijiria site na-ibido na-enyere Atiku na Obi nkwado.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ndị mmadụ katọrọ ACPN na Red Card maka ire onwe ha n'ihi ihe nweta.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
4. SDP idonyere Buhari ukwu

Ebe foto si, @DDDreamTeam19
Oge ha pụtara, ihe ha gwara ụmụ Naijiria bụ na ha bụ otu ga-anapụ APC na PDP ọchịchị dịka 'Third Force'.
Mana pati ahụ tụrụ ụmụ Naijiria n'anya oge ha kwụpụtara na ọ bụ Muhammadu Buhari na APC ka ha ga-eso. gbahapụ Donald Duke bụ onye pati ahụ họpịtara ka ọzọ ọkwa onyeisiala n'aha.
Ihe adịghị Duke mma, o kwuru na ya ka n'ọsọ onyeisiala.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Otu SDP nọ n'ụlọikpe kemgbe Jerry Gana gbara ha akwụkwọ sị ka eme ya onye na-anọchite SDP n'ọkwa onyeisiala.
Gana meriri n'ụlọikpe ukwu mana ụlọikpe mkpeharị nyere Duke mmeri.
5. Nwaanyị mụrụ nwa n'ọsọ achumta vootu

Ebe foto si, @GovIfeanyiOkowa
Otu nwaanyị a kpọrọ Odiri Imuere mụrụ nwa na Delta steeti oge gọvanọ na-achị steeti ahụ bụ Ifeanyi Okowa nke PDP gara achụmta vootu n'Okpuru Ọchịchị Ogboru,Delta steeti.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5









