Vice Presidential Debate: Ihe mere Peter Obi ji ewu
Akụkọ dị mkpa:
VP Debate: Ihe mere Peter Obi ji ewu

Ebe foto si, Getty Images
Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa osote onyeisiala n'aha ndị PDP gosiri na ihe dị iche dị n'egbe na egbe na ndọrịtaụka mere n'etiti ndị ogbo ya sị na pati ise soro dọrịta ụka n'abalị Fraide.
Nke a mere ka aha ya na-ada ka akị bekee na soshal midia dịka o ji okwu ihe mere, ọnụọgụgụ nakwa ụzọ mgbapụ were gbazie ụzọ Naijiria ga-esi gbalahụ ọtụtụ nsogbu na-anyịgbu ya.
Iji ma atụ, Obi sị, 'N'afọ 2015, ego si n'aka ndi ojiegoachụego mba ọzọ bata Naijiria dị ijeri dọla 41($41bn) mana n'afọ gara aga, anyị nwetara naanị ijeri dọla 12($12bn)"
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Aminu Tambuwal kwuru na etu Peter Obi ji ihe ndị merela, ọnụọgụgụ na -akọwa okwu ya gositrri naotozuru ịrụ ọrụ dịka osote onyeisiala.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@Jennysville kwuru na ihe gbasara mwulite akụnaụba doro Peter Obi anya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
@bolanle_cole kwuru na Obi ji ihe mere nakwa ọnụọgụgụ zaa ajụjụ n'ụzọ gosiri na ọ ma ihe ọ na-ekwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Ọ bụghịzị Donald Duke ga-efe ọkọrọtọ SDP
Otu ụlọikpe dị n'Abuja ekpebiela na ọ bụ Jerry Gana, onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi, meriri ntuliaka imeụlọ ndị Social Democratic Party (SDP).

Ebe foto si, Instagram/Jerry Gana/GettyImages
Nke a pụtara na ọ bụghịzị Donald Duke ndị SDP kpọpụtara aha ya dịka onye meriri, ga-anọchite anya pati a na ntuliaka 2019.
Na ntuliaka imeụlọ ha mere, e kwuru na Duke nwetara vootu 812 ebe Gana nwetara 611.
Mana Gana gbara akwụkwọ n'ụlọikpe kwuo na ọ bụ ya kwesịrị ife ọkọrọtọ pati ha maka ihe iwu pati ha kwuru maka ime ihe Bekee kpọrọ "zoning".
Mkpebi ọkaikpe Hussein Baba-Yusuf, kwuru na onye ọbụla nọ na pati kwesịrị iso usoro iwu pati ma rubere ya isi.
Nzukọ Buhari na ndị gọvanọ
Onyeisiala Muhammadu Buhari agwala ndị gọvanọ ka ha gbaa mbọ hụ na ha lebanyere anya n' ihe owuwu ndị na-adakpọ adakpọ iji kwalite akụnaụba steeti ha.
Abdulaziz Yari bụ onyeisi ndị ọgbakọ ndị gọvanọ gbaara ndị ntaakụkọ ama a ka ha na Buhari nwechara nzukọ.
Yari ekweghi asa ajụjụ banyere ihe ha kpebiri n'okwu ụgwọ opekatampe.
Chary Boy na nwunye ya agbasaala?
Charly Boy bụ otiegwu ama ama agwala BBC na ọ bụghị alụkwaghịm ka ọ na-agba nwunye ya bụ Diane dịka o si dee na soshal midia.
O kwuru na ha na-alaghachị n'ụlọụka inwogharị mkpebi ịhụnanya ha abụọ kpebiri afọ iri anọ gara aga.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: M na nwunye m sị ka anyị 'chenjikwaanụ gear' - Charly Boy
Gịnị ka mpụrụobi na-eme n'ikuku?
Otu ụgbọelu Southwest Airlines bu ndị mmadụ si obodo Seattle na-aga Dallas dị na mba Amerịka, laghachiri azụ ka o bidochara njem ka a hụrụ mkpụrụobi mmadụ e kwesịrị ibuga ụlọọgwụ n'ime ya.

Ebe foto si, Getty Images
E mechara buga ya ụlọọgwụ ebe a na-edowe ihe si n'ime ahụ mmadụ.
N'egwuregwu,
Rafael Benitez enwetala ihe nrite dịka "onye nchịkọta kachasị mee ọfụma na Premier League" nke ọnwa Nọvemba.
Nke a bụ ugboro ise Benitez na-achịkọta otu Newcastle United na-enweta ihe nrite a.
Gee Nkeji BBC Igbo ebe a:
Kedụ usoro ọchịchị ga-amasị Naịjirịa?
Ihe ruru ndị omeiwu iri abụọ na abuọ akpọọla oku ga-agbanwe usoro ọchịchị ala Naịjirịa.

Ebe foto si, House of Representatives
Iwe ha bụ na ụsoro ịnwe onyeisiala na-erị oke ego nakwa anaghị enye ụmụ Naịjirịa ụdịrị ọchịchị ziri ezi.
N'okwu ụgwọ opekatampe

Ebe foto si, AFP
Ọgbakọ ndị gọvanọ ala Naịjirịa ekwuola na ha ga-ezute onyeisiala Muhammadu Buhari taa iji kpebie ego ole a ga na-akwụ dịka ụgwọ opekatampe na Naịjirịa
Ha kwuru nke a ụnyaahụ na-ekwukwa na ha nwere olileanya na okwu a ga-ebi tupu ngwucha afọ a
Gụọ ya n'uju ebe a: Okwu 'Minimum wage' a ga-ebi taa?
Na mba ofesi,
Ndị uweojii na Fransị agbagbuola otu nwoke echere na ọbụ ya wakporo ahịa ekeresimesi n'obodo Strausbourg.
Cherif Chekatt bụ ụzọ gbaa ndị uweojii egbe mgbe ha chọtara ya tupu ha gbagbuo ya.
N'Egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka eguwregwu bọọlụ n'ụwa niile akpọrọ FIFA bụ Ginanni Infantino ekwuola na mba ndị chọrọ ka ewelie ndị ga na-agba asọmpị FIFA site na iri atọ na abụọ ruo iri anọ n'asatọ
O kwukwara na ọ bụ n'ọnwa maachị nke afọ n'abịa ka FIFA ga-enwe mkpebi gbasara ya.










