2019 Presidential Debate: Ka o si gaa

Ezekwesili,Muoghalu na Durotoye

Ebe foto si, Ezekwesili/Muoghalu/BBC

Nkọwa foto, Naanị Ezekwesili,Muoghalu na Durotoye sonyere na dọrịtaụka ọkwa onyeisiala emere n'Abuja
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndọrịtaụka ọkwa onyeisiala nke BON hiwere n'Abuja malitere ebe naanị Oby Ezekwesili(ACPN), Kingsley Muoghalu(YPP) na Fela Durotoye(ANN).

Atiku Abubakar(PDP) na Muhammadu Buhari (APC)esonyeghị.

Atiku na Muoghalu na ndóríútúka ókwa onyeisiala

Ebe foto si, @Atiku

Atiku rutere mana meecha jụ ịpụta sonye ibe ya n'ihi na Buhari esonyeghị, dịka o siri kwuo. @Atiku

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ihe ha kwuru maka ndị abịaghị

Atiku na Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Oby Ezekwesili kwuru na ọbịbịa ha(Buhari na Atiku) abịaghị gosiri na oge ọchịchị dị iche bido.

" Ọ gbagwojughị m anya na ha abịaghị. Ha ejrila aka ha maa ọkwa ọpụpụ ha n' ọchịchị."

Durotoye kwuru na ọ bụ npakọ ma ga n'ihu sị na "ngala buru ụzọ, ọdịda eso ya."

Muoghalu kwuru na " ha ejighị ụmụ Naijiria kpọrọ ihe. Uche ha bụ na amakọọjọ ndị mmadụ ga-atụnyere ha."

Nchekwa

Muoghalu na ndọrịtaụka ọkwa onyeisiala

Ebe foto si, @Atiku

Muoghalu kwuru na ya ga-ebu agha megide nrụrụaka n'etiti ndị ndụ ndịagha.

O kwuru na ihe mere n'azụghị ezingwa agha maka ibuso Boko Haram agha bụ nrụrụaka.

Oby Ezekwesili

Ebe foto si, Getty Images

Oby Ezekwesili kwuru na ya ga-eme ka a mata na mmọnwụ ọhụrụ dabatara n'obodo.

O kwuru na ọ gaghị abụkwa ka ọ dị ugbua mgbe mmadụ nwere ike gbuo onye Naijiria na enweghị onye tara ya ahụhụ.

Fela Durotoye kwuru na ya ga-elenye anya na ka Naijiria sị elekwa ndị ọrụ nchekwa nwụrụ n'ihu ọrụ ji were gosi ndị nọ ndụ na gọọmentị ejighị ha egwu egwu.

Fela Durotoye

Agụmakwụkwọ

Mụọghalu kwuru na ya ga-amapụta pasent 20 n'ime Bọjeti maka agụmakwụkwọ.

O kwuru na ya ga-etinye anya n'ọzụzụ na nzụgharị ndị nkuzi, mmegharị kọrịkọlum e ji eme nkuzi ka ọ dabanye n'ihe ụwa ọhụrụ chọrọ.

O kwukwara na ya ga-akwụsị abụbụọrụ ndị ASUU.

Durotoye kwuru na ya ga-etinye anya n' ọzụzụ ndị nkuzi.

Ezekwesili kwuru na ya ga-etinye anya na ịhụ na ya welitere agụmakwụkwọ n'ụlọakwụkwọ gọọmentị(nke ọha) site na ọzụzụ ndị nkuzi, hazikwa ụgwọọnwa ndị nkuzi.

Ahuike

Ụmụnwaanyị dị ime

Ebe foto si, Aproko girl

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị dị ime achọghị ịkwụ ọtụtụ ụgwọ ndị ụlọọgwụ na-ana ha

Muoghalu kwuru na ya ga-etinye anya na nleta ahụike site na "Primary Health care'.

Ezekwesili kwuru na ndị enweghị ọrụ ga-enweta ohere iso n'atụmatụ 'National Health Insurance.'

Durotoye kwuru na ụmụaka erubeghị afọ ise na ndị okenye ruorola afọ 60 ga na-enweta nleta ahụike ha n'efu.

Ebe ka ego ị ga-eji mejupụta ihe ikwere na nkwa?

Mụọghalu kwuru na ya ga-ere NNPC n'etiti ndị nkiti na gọọmentị ( 49-51 %).

"Agaghị m eresị ndị enyi m. Ọ bụ ndị mmadụ zụrụ pasent 49, gọọmentị azụrụ 51."

O kwukwara na ya ga-ewere ego nke a na-amanyebu n' 'fuel subsidy' n'igbo mkpa Naijiria.

Ezekwesili kwuru na ya ma ọrụ n'ụzọ e si amabi ego ọrụ ngoo gọọmenti na-enye iji kwụsị mmefu ego.

Durotoye kwuru na ndị gụrụ akwụkwọ kwesịrị inye aka tinye ego na iwulite ụlọakwụkwọ ha gara mgbe ha na-eto eto.

Nrụrụaka/ ikike dịrị onye

N' okwu Ipob, Muoghalu kwuru na "udo ga-achị ma ọ bụrụ na e me nwa ka e mere ibe ya."

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

O kwuru na ọchịchị ya ga- eji ndị ọkaibe na mpagha ọbụla were rụọ ọrụ.

Durotoye kwuru n'agha a na-ebuso nrụrụaka ugbua bụ nke e ji achụgharị ndị anọghị n'otu gọọmenti nọ n'ọchịchị.

O kwuru na ya banye n'ọchịchị na ya ga-eme ka ngalaba ọ dịrị ibu agha ahụ dịka EFCC,ICPC na ndị uweojii kwụsịe ike.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

O kwukwara na ọ bụ igwe ka a ga-eji na-emekarị ihe gbasara ego na gọọmenti ka ego ghara ịna-esi n'aka fere aka.

Ezekwesili kwuru na iwepụ ụlọọrụ ekwenti n'aka gọọmenti wepụrụ nrụrụaka mere na Nitel agaghị n'iru oge ọ dị.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Ya mere, na ya ga-ewepụ aka gọọmenti n'ọtụtụ ihe ma tinye ihe ndị a ahụ n'aka ụlọrụ kwuru onwe ha.

Akụkọ ga-amasị gị: