Nigeria 2019 elections: Njirimara ndị na-azọ oche Onyeisiala – Obiageli Ezekwesili

Oby Ezekwesili

Ebe foto si, Getty Images

Obiageli Ezekwesili bụbu osote onyeisi ụlọaku mbaụwa bụ nke Bekee kpọrọ, "World Bank".

Ọ rụkwara ọrụ dịkwa mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ nakwa nke ngalaba ngwupụta ọla.

Ezekwesili bụ onye ofufe Kraịst, bụ ihe dị iche n'etiti ya na mmadụ abụọ na-azọ ọchịchị n'okpuru pati abụọ isi ha pụtara ọfụma.

Pati ya - Allied Congress Party of Nigeria (ACPN) - abụghị nke ama ọfụma.

Ezekwesili nọ n'isi otu 'Bring Back Our Girls,' otu mere ka ụwa tinye anya na Naịjirịa mgbe Boko Haram tọọrọ ụmụakwụkwọ n' obodo Chibok dị n'ugwu ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Oby Ezekwesili

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ọnụ na-eru n'okwu sị na mmụta ya dịka onye nyocha akụnaụba obodo nke Bekee kpọrọ "economist" bu ezigbote uru dịrị Naịjirịa.

Mana, ha kwukwara na ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe banyere ndọrọndọrọ ọchịchị adịghị akwado ya.

Ezekwesili kwere nkwa na enye ya ohere ịchị, ọ ga-ahazịarị akunaụba Naịjirịa, mee ka ọ kwụsị ịbụ mmanụ agbịdị bụ ihe Najiria ga na-atụkwasị obi.

O kwekwara nkwa na ya ga-ahụ na ndị ntorobịa nwetara ọrụ.

Nwaanyị a dị afọ 55 chọrọ ịbụ nwaanyi izizi ga-achi Naịjirịa dịka onyeisiala, agbanyeghị na ọtụtụ mmadụ na-ahụta atumatụ ahụ dịka ihe ga-arịa ahụ ime ugbua.