#Fight4Naija: Kedụ onye bụ osote Oby Ezekwesili?

Ụfọdụ ụmụ Naịjiria kwuru na etu Oby Ezekwesili si họpụta onye ugwu dịka osote maịrị ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
N'otu aka ahụ, ụfọdụ kwuru na Ezekwesili na-arọ nrọ ma kwuo na Ganiyu Galadima abụghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị ama ama.
Cheta na Ezekwesili depụtara n'akara Twitter ya na Galadima dịka osote ya ga-enyere ya aka ịmata ndị a nachị nọ n'igbe ụlọ, ọfụma.
O kwuru na Galadima ghọtara ebumnobi ya gbasara ịchị Naịjirịa ma kweta na ọ ga-enyere ya aka nke ukwu n'iweta ya na mmezu.
Onye bụ Ganiyu Galadima?
- Amụrụ ya n'ụbọchị iri na otu ọnwa Jun nke afọ 1964
- Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Kwara steeti ebe o mechara bụru otu onye n'ime otu ndị na-achị n'ụlọakwụkwọ ahụ
- Ọ bụbu onye zọrọ oche onyeisala n'okpuru pati ACPN n'afọ 2015
- Ọ bụ onye oji ego achụ ego
Ihe ndị ọzọ ndị mmadụ na-ekwu maka nhọpụata a n'elu soshal midia:
Armstrong Armstrong kwuru na ihe Ezekwesili mere gosiri amamihe.

Keezy Boiwonda, na-ajụ ihe mere Ezekwesiri ji họrọ onye "Hausa" karịa ịhọrọ onye Fulani.

Ebe foto si, Chioma Obianinwa
Mana Onyia Fabian Nnamdi, gwara Ezekwesili ya gaa zuo ike makana ọchịchị Naịjirịa abụghị nke ndị Igbo.

Azi Somtochukwu na-ajụ ma enweghị onye chọrọ ịhọrọ onye Yoroba dịka osote ya n'ọsọ ntuliaka nke ugbua?

Akụkọ ndị ga-amasị gị:









