Premature Ovarian Failure: Ahụghị m nso m, chee na m dị ime

Ebe foto si, Nicole Evans
E nyopụtara na Evans nwere nsogbu ihe nsọ ya ịkwụsị n'ike ka ọ gbara afọ 30.
O dere BBC 100 Women maka amụtaghị nwa na etu o siri nabata nchọpụta kwuru na ihe nso ya alaala.

"Obara na-apụta n'oge m nọ na nsọ bịara na-agbada, mana oge m gwara ndị ọrụ ahụike n'ala m bụ New Zealand, a sị m na ọ bụ ọgwụ m na-aṅụ butere ya.
"Mgbe otu ọnwa gara, ahụghị ya ma ọlị. M were ọṅụ gaa hụ dọkịta, chee na ọ bụ ime ka m dị.
"Alụọla m di otu afọ dịka anyị bidorola kwuwe okwu ịmụta nwa.
"Mana nyocha m mere gosiri na m adighị ime ọbụla.
"Dọkịta mere m nyocha ọbara wee sị na mmiri ahụ adịghị etu o kwesịrị. O zigara m n'aka dọkịta bụ ọkachamara n'ihe gbasara mmiri ahụ, onye kwuru na m nwere nsogbu ihe nsọ ịkwụsị n'ike.
"Amaghị m na akpa akwa mmadụ nwere ike ịkwụsị oge mmadụ abụbeghị okenye. Ọ bụ ihe tụrụ m oke anya. "
Oge ugbua, ndị na-akwado na nwaanyị nwere ikike ịdị ka nwoke na-ekwu na nwaanyị nwereike ime ihe masịrị ya mgbe ọ masịrị ya.
Mana nke a bụ nnukwu asị na-eri ụmụnwaanyị ihe dachiri atụmatụ anyị inwere onwe anyị.

Ebe foto si, Nicole Evans
Ekwenyere m na ndị na-ewu ewu na-ebute etu ndị mmadụ si eche maka amụghị nwa; ebe a na-egosi na nwaanyị nwere ike ịmụli nwa rue ka ọ gbachara afọ 50.
Nke a na-eme ndị mmadụ eleghara njirimara nsogbu amụtaghị nwa anya na-amaghị ama.
"Amaghị m na ime isi ike nwere ike ibido na nwaanyị oge o ruru afọ iri atọ na ise.
"Anyị kpebiri ime IVF site n'enyemaka otu ezi enyi. Enwere m olileanya na nke a ga-aza ekpere anyị mana ọ bụrụ sọọsọ otu akwa dị mma.
"Emechara, adịghị m ime. Owutere anyị niile.
"Ka otu afọ gachara, otu onye kwetere ka o nyere anyị aka, obi akaghị anyị. Nke a bụ nleta ikpeazu gọọmentị na-enyere anyị aka ịkwụ ụgwọ ya. Anyị mere ya n'ihi na eruola m afọ iri atọ na abụọ. Oge na-aga."

Gịnị bụ menopọsụ?
- Menopọsụ bụ oge nwaanyị kwụsịrị ịhụ nsọ ya
- Ihe nsọ na-akwụsịlata ọnwa ole na ole maọbụ afọ ole na ole tupu ọ kwụsị kpamkpam
- Njirimara ndị ọzọ bụ ahụ ekpomọkụ, isiọwụwa, arahụghị ụra ọfụma, oke echiche, nchekasị, enweghị agụụ ndịna
- "Menopause" na-eme na ndị dị agbata afọ 45 na afọ 55
- Otu n'ime ụmụnwaanyị 100 erubeghị afọ 40 nwereike nsọ ha akwụsị n'ike, nke a na-akpọ "premature ovarian insufficiency" na Bekee.
Ebe e siri nweta nke a: NHS UK

Ọ dị mwute na akwa abụọ etinyere n'afọ oge mere IVF emeghị ọfụma nke anyị na-enwe ego maọbụ mụọ ime IVF nke atọ ya.
Enweghị mụọ ikute nwa. Dịka a rụkachara m ahụ, ị mara na m ga-ebido njem ndu ọhụụ, ọrụ ọhụ, okwu ego na ihe ndị ọzọ a na-enyocha tupu ekunye mmadụ nwa.
N'ezie, ama m ihe o jiri dị mkpa, n'ezie, aghọtara mkpa ọdị, mana enwelighị m ike ya n'ihi ihe m gabigacharala.
Mụọ mụ kpụrụ n'ala. Obi mgbawa na ụmụ mmadụ kara ịmụ efuola ji m nke na onyeghị etu m ga-esi kọwaa ya.
Obi mwute di gidere were rue otu mgbede. Enyi m nwaanyị na nwa ọhụrụ ya bịara, o rue ka ha lara, m chọpụta na agụ ịmụta nwa nke m alala. Ọ lara fịam!
Enweghị m ike ịkọwa ya karia na Chineke wepụrụ ya n'ime obi m. M leghachi anya azụ ugbua, amara m na onwere m ebunobi ka mma - ezi mmekọrịta mụ na ya.
Ọtụtụ ndị dọkịta amaghị maka nso nwaanyị ịkwụsị n'ike. M na ọtụtụ ụmụnwaanyị nọ n'otu nkwado m bidoro akparịtala ụka, ha were kwuo na ha gwa dọkịta ha na ihe nso ha anaghị apụtazi dịka o kwesiri ,na ha na egbu oge tupu ha zigara ha dọkịta ọkachara mara n'ihe gbasara nsogbu ahụ.
Kemgbe e nyochapụtara nsogbu a, ana m aṅụ ọgwụ maka mmiri ahụ nke Bekee kpọrọ "Hormonal Replacement Therapy".
Ekelere m chukwu maka nleta a, n'ihi na dịka m kụrụla afọ 40 ugbua, ọ na-ara m ahụ ịkpa nkata maka ihe gbasara isi ịghasa mmadụ, ahụ ekpomọkụ, na ihe ndị ọzọ so ihe nsọ nwaanyị ịkwụsị n'ike.
Ọ na-eme m ihere nke ukwuu ịkọwa onwe m nye onye ọbụla.
Ọ bụ ihe ọma ịgbalahụ mmefu ego dị n'ịzụ akwụkwọ nwaanyị ji ahụ nso ya kwa ọnwa. Mana o were m oge tupu m huwa uru dị n'ọghọm ahụ.


Gini bụ'BBC 100 Women'?
BBC 100 Women na-akpọpụta ụmụnwaanyị 100 kajara akaja nakwa ndị na akpalite mụọ mmadụ n'ụwa niile kwa akpọ ma kekọrịta akụkọ ha.
Nke a bụ afọ pụụ iche maka okwu gbasara ikke dịrị ụmụnwaanyị n'ụwa niile. Ya mere,n'afọ 2018 BBC 100 Women ga-elebanye anya n'ụmụnwaanyị ndị ji obi ọkụ ha, iwe ha were na-eweta ezi mgbanwe n'ụwa ebe ha nọ.










