Achụma ọrụ Globacom: Ụmụnwaanyị emeela ngagharị iwe

Ndi otu ụmụnwaanyị akpọrọ Coalition of Women for Justice mere ngagharị iwe n'Enugwu iji gosi na obi adịghị ha mma maka ọchụchụ n'ọrụ ndị Globacom chụrụ ụmụnwaanyị ndị lụrụ di na ndị mụrụ nwa.
Ụmụnwaanyị ahụ niile yi uwe ojii ha ji akwa akwa arịrị wee gụrụ egwu na-agagharị ụzọ niile dị n'Enugwu.
Onye kpokobara ya bụ ngagharị iwe bụ Onyekaokey Udegbunam, kwuru na nnukwu iwe dị ha n'obi ka ndị nwe ụlọọrụ globacom siri chụọ ụmụnwaanyị niile ndị lụrụ di nakwa ndị mụrụ nwa n'ubọchị Maachị 9.
Ha tiri mkpu na ụfọdụ ụmụnwaanyị a achụrụ n'ọrụ anọruola afọ iri na abụọ nakwa iri na ise dgz, bụ ndị achụrụ n'ọrụ, nye ha naanị ụgwọ otu ọnwa wee sị ha lawa.

Ụmụnwaanyị ndị gbakọtara ọnụ ime ngagharị iwe a bụ ndị otu Igboezue, Wacol, Nawoj, na ndị ọzọ kwuru na ha ga na-eme ngagharị iwe ruo oge ndị Globacom ga-enyeghachị ụmụnwaanyị ahụ ọrụ ha maọbụ kwụọ ha nrubere ha niile ozugbo ozugbo.
Mana mgbe BBC Igbo kpokuru ndị Globacom, ha sị na ha ekwuputala ebumnuche ha n'igwe Twitter ha ebe ha sị:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Onyeisi ụmụnwaanyị igboezue bụ Amaka Okonkwo, yọrọ ndị gọọmentị ka ha taa ụlọọrụ Globacom ahụhụ maka inupu isi n'iwu guzobere ọrụ na Naijirịa.
Ụmụnwaanyị ndị ọzọ kwuru okwu gụnyere Egodi Igwe nọchitere anya Wacol, Ifeoma Amuta nke Nawoj, Chibota Edozie nke Nawoj na Chieso Animwagwa nke NUJ gwara ndị NCC na NLC ka ha leba anya n'usoro ọjọọ a ndị Globacom jiri kwusi ndị ọrụ ha.

Ụmụnwaanyị a na-eme ngagharị iwe ji akwụkwọ edepụtachara echiche obi ha wee site n'Ọkpara square dị n'Enugwu gaa obi gọvanọ Enugwu.
Ha gụrụkwara egwu gaa ahịa Ogbete dị n'Enugwu tupu ha agaruo n'ụlọọrụ ndị Globacom wee ziruo ozi ha ụlọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Onye osote gọvanọ Enugwu bụ Cecilia Ezeilo, zutere ụmụnwaanyị ahụ, tie ha aka n'obi ma kwekwaa nkwa na ya ga-agwa Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi ihe ha jiri bịa.
Mmadụ atọ so n'ụmụnwaanyị ndị Globacom chụrụ n'ọrụ sonyere na ngagharị iwe a n'Enugwu.

Ha gwara BBC Igbo na anyammiri juru ha obi ka Globacom si tufuo ha n'agbanyeghị ọtụtụ afọ ha rụrụ ọrụ ha ọfụma.
Ha sịrị na ọ dị mwute na ọ bụ ka otu ụbọchị gachara ka emechara ncheta ụmụnwaanyị ka achụrụ ụmụnwaanyị n'ọrụ.










