
Ndị e chere na ha bụ Bọko Haram wakporo ụlọakwụkwọ ụmụnwaanyi dị na Dapchi,Yobe steeti na mpaghara ọwụwaanyawụ ugwu-awụsa, Naịjiria.

Ebe foto si, Reuters
Dịka mba ụwa mere mmemme ncheta ụmụnwaanyị taa, ụfọdụ nne na nna ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ndị Boko Haram tọrọ na Dapchi wuchiri n'Abuja taa ebe ha mere ngaghari iwe gbasara ụmụ ha.
Ngaghari udo ahụ ha mere bụ iji chetere ndị gọọmenti etiti maka ihe ọdachi mere ha na ezinaụlọ ha ụbọchị Fubuwarị 19 oge ndị Boko Haram tọrọ ụmụ ha.
A tọrọ ụmụaka ahụ n'ụlọakwụkwọ ha dị na Dapchi dị na Yobe steeti.
Taa mere ya ụbọchị iri na asaa kemgbe a tọrọ ụmụakwụkwọ ahụ mana enwebeghi olileanya na a ga-achọta ha.
Ndị nne na nna ahụ yi akwa ojii iji gosi na ha na-eri uju. Ha ruru n'ọnụụzọ ụlọ omee iwu n'Abuja.
Ahụrụ ụfọdụ nime ha dịka ha na-ebe akwa ebe ndị ọzọ na-agụ egwu akwa. Ụfọdụ kọwara n'anyammiri etu ihe ọdachi si wezụga odịnihu ụmụ ha nke kpatara ha jiri gawa akwụkwọ na mbụ.
Ọtụtụ nime ha kwuru na olileanya ha na ndị gọọmenti ga-achọta ụmụ ha na-ada kwa ụbọchị.
Nke a bụkwa ka a na-azọtachabeghi ụmụakwụkwọ Chibok ndị Boko Haram tọrọ n'afọ 2013.
Akụkọ ọzọ ga-amasị gị: