Ihe anyị ma maka mkpochasị ndịagha na-ekpocha ogige ESN dị n'Orsumoghu, Imo Steeti

Onyeagha kwụụ n'ihu ụgbọala ha, ime ọhịa nakwa ụlọụka St. Marys Katọlik dị n'Orsumoghu.

Ebe foto si, King of the game/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ewerela ọnọdụ n'obodo Orsumoghu nakwa obodo ndị ọzọ gbara ya gburu gburu dị n'Imo Steeti.

Ndị ọrụ nchekwa a gụnyere ndịagha 34 artillary Bridgade Obinze, ndị uweojii (ngalaba Tiger Base), ndị DSS, ndị Civil Defence nakwa ndị nchekwa ọdịnala nọ n'obodo a ịrụ ọrụ ha kpọrọ 'nzacha na mkpocha' ogige ndị ojiegbe ESN dị n'obodo Orsumoghu.

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri etu ndị ọrụ nchekwa si akpagharị n'ebe dị iche iche n'Orsumoghu ebe ndị ojiegbe kpachiburu n'oge gara aga.

Dịka ha na-aga ka ha na ndị ojiegbe a na-akwakọrịta mgbọ. N'otu aka ahụ ha na-abọpụta ọfụdọ ogbunigwe ndị e liri n'okporoụzọ.

Nnukwu ụgbọ katapila nọ n'akụkụ ọhịa na ndị ọrụ nchekwa nọ ha n'akụkụ.

Ebe foto si, King of the game/Facebook

Ụfọdụ ebe ndị ha gara gụnyere Orsuihiteukwa, Ụlọụka St.Marys nke Katọlik, ahịa Afọ dị n'Orsumoghu, ụfọdụ mpaghara olulu a kpọrọ 'mother valley', Umunoha nakwa Orlu dgz.

Ndị ọrụ nchekwa ekwubeghi ihe ọbụla banyere ọrụ a ha na-arụ n'obodo Orsu mana ihe onyonyo otu onye a kpọrọ Ijele so ha n'ọrụ ahụ na-ekesa na soshal midia gosiri ka etu ha si eme n'ọrụ ahụ.

BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti ịmata banyere ọrụ nchekwa ndị otu ha na ndị ọzọ na-arụ mana ọ zabeghi tupu akụkọ a apụta.

Ụlọụka St. Marys Katọlik dị n'obodo Orsumoghu dịka ahịhịa tojuru n'ihu ya.

Ebe foto si, King of the game/Facebook

Onye ntaakụkọ nọ n'Imo Steeti na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ndịagha na ndị ọrụ nchekwa ọzọ nọ n'Orsumoghu ugbua na-arụ ọrụ.

O kwuru na onyeisi ndị uweojii ngalaba 'Tiger Base' n'Imo Steeti bụ Oladimeji Odeyeyiwa gwara ya na ụfọdụ ndị ọrụ ha nọ n'ọrụ n'obodo Orsumoghu.

Ola ekwughi kpọmkwem mgbe ha malitere ọrụ nchekwa a n'obodo Orsumoghu mana site n'ihe a hụrụ nakwa ihe akụkọ na-ekwu, ndịagha malitere ọrụ a n'ime izuụka abụọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2026.

BBC Igbo kpọtụụrụ ndị obodo Orsumoghu ịnụta n'ọnụ banyere mbata na ọrụ nchekwa a na-aga n'ihu n'obodo ha.

Onyeagha Naịjirịa bu egbe ma kwụrụ n'ihu ụgbọala ha.

Ebe foto si, King of the game/Facebook

"Anyị ma maka ọrụ ndị nchekwa na-arụ n'Orsumoghu"

Otu onye obodo ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ bụ eziokwu na ndị ọrụ nchekwa jikọtara aka na-arụ ọrụ n'obodo ha.

Ọ sị na "ụjọ adịghị ndị obodo anyị n'ọrụ ndị a na-arụ, nchekwa adịla n'ọtụtụ ebe n'obodo kama e nwere ụfọdụ ebe ndị fọtụrụ, ọ bụ n'ihi nke a mere ha jiri bịa ịhụ na ha kpochapụrụ ebe ndị a.

Ebe ndị a lekwasịrị anya bụ okeala dị n'Orsumoghu na Anambra Steeti."

O kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ amaghị banyere ọrụ a maka na ọ bụ ọrụ nchekwa pụrụiche ma zoo ezo.

Nke a abụghị mbụ ndị ọrụ nchekwa na-awakpo ogige dị iche iche ebe ndị ojiegbe dị n'Orsumoghu nakwa gburu gburu ya.

Kamgbe ihe ruru afọ ise gara aga rute ugbua, ha na-abanye n'ogige ndị ojiegbe e cheere bụ ndị otu IPOB/ESN dị n'ọtụtụ obodo dị n'Imo steeti kwa mgbe kwa mgbe.