Ndị uweojii ekwuola mmadụ ole nwụrụ n'Ogbunigwe gbara n'ahịa dị n'Orsu Imo Steeti

Mgbe ndị uweojii Imo Steeti gara n'ahịa Eke-Ubahaeze dị n'Orsu Imo Steeti ebe ogbunigwe gbara.

Ebe foto si, Imo State Police/Screenshot

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị uweojii Imo Steeti ekwuola na ha amalitela inyocha ogbunigwe ahụ gbara n'ahịa Eke-Ubahaeze dị n'Orsu, Imo Steeti na Tuzde 24 Juun, 2025.

Ọnụ na-ekwuru ha bụ Henry Okoye kwuru na ogbunigwe ahụ gbara mgbe o ji ihe dịka ọkara gafee elekere abụọ nke ehihie.

O kwuru na ọ bụ mgbe otụ nwaanyị zọrọ akụrụngwa ogbunigwe ahụ nke a na-eche na ọ bụ ndị out IPOB/ESN liri ya ụkwụ, ka ọ gbawara.

Okoye gara n'ihu kwuo na ogbunigwe ahụ gburu nwaanyị ahụ ma merụọ mmadụ ise ndị ọzọ ahụ.

O kwuru na ngwa ngwa ndị uweojii nwetere ozi ahụ, na ha zipuru ndị ngalaba na-ahụ maka ogbunigwe, na ha zachara ogige ahụ ma hụụ na e weghachịrị udo n'obodo ahụ.

O kwuru na ahịa amalitekwala ịzụ n'Eke-Ubahaeze ugbua.

Aha onyonyo, Ihe ndị uweojii kwuru n'Ogbunigwe gbara n'Orsu Imo Steeti

Ihe ndị obodo kwuru banyere ogbunigwe ahụ

Ihe onyonyo malitere ifesa na soshal midia na mgbede ụbọchị Tuzde 24 Juun, 2025 gosiri ka ozu ndị mmadụ nọcha n'ala n'ahịa Eke-ubahaeze.

Nke a na-abịa dịka ogbunigwe ahụ gbachara oge ndị mmadụ na-azụ ma na-ere ahịa.

Ihe onyonyo ahụ gosiri ka ụlọahịa dakwasịrị ụfọdụ mmadụ, ebe ozu ndị mmadụ tọgbọ n'ala nakwa ọbara na-asụ n'asọ n'ala.

Ọnọdụ ahịa Eke-ubahaeze dịka ogbunigwe gbawachara ebe ahụ.

Ebe foto si, Screenshot

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Otu n'ime ndị ndu ndị ntoroọbịa n'obodo Orsu na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ogbunigwe gbara n'ezie a.

O kwuru na ihe a mere n'ahịa Eke-ubahaeze mgbe ọtụtụ ndị mmadụ, ọkachasị ụmụnwaanyị na-azụ ahịa, na ihe ọzọ a nụrụ bụ ụda ogbunigwe gbara.

O kwuru na nke a gburu ụmụnwaanyị ruru mmadụ ise ma merụọ ndị ọzọ ahụ ebe ọtụtụ ụlọahịa dara ada.

"Anyị nwetere ozi na ogbunigwe gbara n'ahịa Eke-ubahaeze na mgbede ụbọchị Tuzde, gbuo ụfọdụ mmadụ ma merụọ ndị ọzọ ahụ.

"Mgbe ndị obodo ruru ebe ahụ, a hụrụ na ozu ndị mmadụ tọgbọcha n'ala, ọbara eju ebe niile tinyere ụlọahịa dakwasịrị ụfọdụ mmadụ.

"Ihe ruru ụmụnwaanyị ise nwụrụ site n'ogbunigwe ahụ.

O kwuru na nnyocha mbụ ndị nchekwa ọdịnala mere gosiri na ọ bụ ogbunigwe ndị otu na-achọ nwereonwe Biafra liri n'akụkụ ahịa ahụ bụ ihe gbawara ma gbuo ndị a.

Ọ gara n'ihu kwuo na kamgbe afọ 2021 ka ndị obodo ha gbachara ọsọ n'ihi nsogbu ndị otu na-achọ nwereonwe Biafra na-enye n'obodo Orsu na ọ bụ ugbua ka ha ji nwayọọ na-alọghachị tupu mkpa mkpa a emee.

O kwuru na ndị ọrụ nchekwa ewerela ọnọdụ ugbua, ebe ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụwgọ.

Kọmishịọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Imo Steeti bụ Declan Emelumba kwuru na ọ bụ eziokwu na ogbunigwe gbara n'ahịa ahụ.

Ọ sị na ọ bụ ogbunigwe e liri n'ahịa ahụ kama na ndị uweojii na-eme nnyocha banyere nke a.

Orsu so n'otu n'ime obodo ndị mmadụ gbara ọsọ kamgbe ihe ruru afọ anọ gara aga n'ihi ọnọdụ nchekwa dị njọ ebe ahụ.

Nke a mere dịka ndị ojiegbe weere ọnọdụ n'obodo ahụ ma na-akpaike dị egwu, gụnyere ntọrị mmadụ, ogbugbu ndị mmadụ nakwa mpụ ndị ọzọ dị iche iche.

Na nso nso a ka ndị obodo ji nwayọọ na-alọghachịta azụ dịka ọnọdụ na-adajụtụ.