Unknown gunmen attack : Ọnọdụ ụlọọrụ ndị uweojii ebe atụrụ ogbunigwe n'Ideato, Imo steeti

Ụlọọrụ uweojii Ideatọ Imo Steeti

Ndị uweojii nke ogige n'Ideatọ-South dị n'Imo Steeti ekwuola na ha gbochiri ndị ojiegbe chọrọ ịwakpo ụlọọrụ ha n'ụbọchị isii nke ọnwa Jenuwarị, afọ 2022.

Ha kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Michael Abattam depụtara.

Ha kwuru na ọ bụ n'elekere abụọ nke ụtụtụ ka ndị omekome bịara n'igwe wakpoo ha kama ndị uweojii ekweghị ha mezuo uche obi ha.

Abattam sị, " Ha tụrụ ogbunigwe n'ụlọọrụ anyị kama e nweghị ihe nwere isi o mebiri."

Ụlọọrụ uweojii Ideatọ Imo Steeti

Ọ kọwara na ụfọdụ ndị omekome a bu mgbọ egbe ndị uweojii gbara ha gbafuo.

N'otu aka ahụ ka kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Rabiu Hussaini kelere ndị uweojii a ma rịọ ndị obodo ka ha gbaa ama ma ha hụ onye ọbụla na-anata ọgwụgwọ maka mgbọ egbe, maọbụ onye ọbụla na-ezoharị n'obodo ha.

Ihe BBC Igbo hụrụ mgbe anyị gara ebe ahụ

Ụlọọrụ uweojii Ideatọ Imo Steeti

Ndị uweojii ekweghị anyị sete maọbụ mee ihe onyonyo n'ebe ahụ.

Kama anyị chọpụtara na otu elu ụlọ ụlọọrụ ndị uweojii gbara ọkụ.

Ụlọọrụ uweojii Ideatọ Imo Steeti

Anyị na-aghọta na ọ bụ ogbunigwe ndị omekome a tụrụ mebiri ma gbaa elu ụlọ ahụ ọkụ.

Dịka anyị siri hụta, ụfọdụ ụlọahịa mepere, na-agbanyeghị mkpamkpa kpara n'ụlọọrụ ndị uweojii a nke pụtara na ndị obodo na-ebi ndụ ha.

Ihe ndị Obodo gwara anyị

Ụlọọrụ uweojii Ideatọ Imo Steeti

Otu onye na-achọghị ka akpọ aha ya gwara BBC Igbo na ndị omekome a biara n'abalị.

O kwuru na ha buru ibu ma bụrụ ọgbatumtum bịa.

Onye ahụ kwukwara na ndị uweojii atọ nọ ọrụ n'abalị ahụ gbara ọsọ mgbe ndị ojiegbe ahụ biara.

Ọ kọwara na ọ bụ ebe ndị uweojii na-edowe ndị nọ na nga ka ndị omekome ahụ tụrụ ogbunigwe a.

Dịka onye a siri kọwara na ndị nọ na nga a gbara ọsọ.

Kama na ndị nche obodo mechara jide mmadụ abụọ atụrụ ịga n'aka na ụkwụ.