Ndị omekome egbuola mmadụ abụo n'Etekwuru, Imo steeti

Ebe foto si, Screenshot
Akụkọ pụtara n'ụtụtụ a na-ekwu na ndị omekome bu egbe egbuola opekatampe mmadụ abụọ mgbe ha wakporo obodo Etekwuru dị n'okpuru ọchịchị Ohaji-Egbema n'Imo steeti.
E kwukwara na ndị ahụ mebiri ọtụtụ ngwa obibi ndị mmadụ ma merụọ ndị ọzọ ahụ na mwakpo ahụ mere n'ụzọ ụtụtụ ụbọchị Wenezde.
Mwakpo a na-abịa n'ime abalị abụọ nke ndị omekome ọzọ na ndị agha kwatara ya n'obodo ahụ butere ọnwụ ndị agha abụọ na ndị ntorọbịa.
Eze ọdịnala obodo ahụ bụ Eze Kenneth Okereke, onye kọwaara onye ntaakụkọ anyị nke a, kpọkwara ndị ọrụ nchekwa oku enyemaka n'obodo ya.
Cheta na ndị omekome awakpobuola obodo ahụ ma gbaa obi Igwe obodo ahụ ọkụ nke mere na o nweghizi ụlọ ugbua.
Eze ahụ kwuru na ya onwe ya nọzị n'ọsọ kamgbe ahụ a gbachara ụlọ ya ọkụ ruo ugbua.
O degakwara Gọvanọ Imo steeti akwụkwọ na-akọwara ya ihe mere n'obodo ya ma rịọ ya ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka.
Ndị uweojii Imo Steeti ekwubeghị ihe ọbụla gbasara mwakpo a.
Akụkọ ka na-abịa.










