Nkewa na-akawanye njo n'ụka Anglịkan dịka ndị ụkọchukwu nnupụisi na-achọ ịhọpụta onyeisi nke ha

Sarah Mullally, na-ekpe ụka Ekeresimesi Eucharist n'ụlọụka St Paul's Cathedral, Lọndọ, na 25 Disemba

Ebe foto si, PA Media

    • Onye dere ya, Lebo Diseko
    • Ndị mere akụkọ a, Global Religion correspondent, Lagos
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ndịisi ụka na-achọghị ịnabata ihe ọhụrụ bekee kpọrọ 'conservatives' n'ụka Anglịkan ga-ezute n'izuụka a n'Abuja bụ isiobodo Naịjirịa iji họpụta onyendu ga-ama nwaanyị mbụ bụ Achịbishọpụ Kantaburị nke ụka Anglịkan aka.

A ga-edu Sarah Mullally nke mba Briten n'iyi ọrụ dịka onyeisi ụlọụka Anglịkan n'ụwa niile na mmemme ga-ada ụda a ga-eme n'ọnwa Maachị 2026 n'agbanyeghị na nhọpụta ya tinyere nkewa ma kpalite ọtụtụ okwu na Naịjirịa nakwa n'ebe ndị ọzọ iche iche.

Ọtụtụ ndị ụka na-achọghị ịnabata ihe ọhụrụ bekee kpọrọ 'conservatives' kwenyere na ọ bụ nannị ụmụnwoke ka e kwesiri ichi echichi bishọpụ.

Ụlọụka Vining Memorial Church Cathedral dị na Legọs, juputara n'ụmụnwaanyị kere ekike na-acha ndụ ndụ na odo odo nakwa ụmụnwoke yi akwa ọcha a kpọrọ agbada oge ha kara ụka.

Ụfọdụ ukwe ha kwere bụ ụdịrị ukwe a na-ekwe n'ụlọụka Anglịkan n'ụwa niile, mana ihe dị iche dịkwa, dịka ụda nakwa etu ndị ụka si agba ya bụ egwu.

Ndị ụka gụnyere Bunmi Odukoya, kwadoro nhọpụta ya.

"Ọrụ Chukwu bụ ihe dịịrị onye. Ọ bụrụ na a kpọọ gị oku, ma ị bụ nwoke maọbụ nwaanyị, ị ga-aza oku Chukwu kpọrọ gị," ka ọ gwara BBC.

Ndị ọzọ dịka Uche Nweke, ekwenyeghị na nke a: 'Echeghị m na ọ bụ ihe ụka. I lee anya n'Akwụkwọ Nsọ na ndị Jisọs kpọrọ oku, enweghị nwaanyị ọbụla so na ya, ya mere na echeghị na ọ dị mma nwaanyị ịbụ onyeisi ụka Anglịkan na Ịngland."

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Tinyere ịbụ onyeisi kachasị n'ụlọụka mba Ịngland, Achịbishọpụ Kantebury bụkwa onye ji ọkwa "primus inter pares" - ihe nke a pụtara bụ na ọ bụ ya bụ onyeisi ụka Anglịkan niile nke nwere ndị ụka ruru nde iri itoolu 95m.

Dịka ọgbakọ a ga-enwe abalị anọ ga-amalite n'Abuja n'ụbọchị Tuzde 3 Maachị, 2026, Gafcon, nke kọwara onwe ha dịka "ndị na-akwado ụka Anglịkan nke ochie ma na-echekwa okwu Chukwu", na-akwado ịhọpụta onyeisi ha kachasị n'izuụka ole na ole tupu e duo Achịbishọpụ Mullay n'iyi n'ogige Canterbury Cathedral.

Nke a ka e kwuru na o wetala nkewa n'ụlọụka ahụ n'ụwa niile.

"Nke a bụ schism, ọ bụrụgodị na ha achọghị ikwu nke ahụ," Diarmaid MacCulloch, Ọkammụta n'ihe gbasara etu e si hiwe ụlọụka ahụ na Mahadum Oxford dị na England, gwara BBC.

"Nke a bụ otu ndịisi, ndị nwoke niile, na-aga ọgbakọ n'Afrịka iji kwupụta njirimara nke otu ndị ụka Anglịkan anabataghị - nke ahụ bụ ụmụnwoke na-ekwu ihe ga-eme."

E hiwere Gafcon n'afọ 2008 iji zaghachi ihe ụfọdụ dị iche iche n'ụka Anglịkan n'ihe gbasara alụmdị nwoke na nwoke nakwa nwaanyị na nwaanyị.

Ụmụnwaanyị, ụmụnwoke na ụmụaka nọ n'ụlọụka dị na Legọs.
Nkọwa foto, Ndị ụka n'ụlọụka Vining Memorial Church Cathedral nwere nkwenye dị iche iche banyere nwaanyị ịbụ onyeisi ha

Nkewa a akawanyela njọ na nso nso a, n'afọ 2023 otu jụrụ ịnabata ọchịchị na ntụziaka onye bụbu Achịbishọpụ Canterbury bụ Justin Welby, maka atụmatụ ịgọzi alụmalụ n'etiti nwoke na nwoke na nwaanyị na nwaanyị nke onye naara ya ọkwa bụ Dame Sarah nabatara.

Otu ahụ kwuru na ha na-ekwuru ọha niile mana nke a bụ nke a na-enweghịike ikwu ka ọ bụ eziokwu.

Gafcon na-enweta ọtụtụ nkwado ya n'Afrịka, mana ọ bụghị naanị otu nkwenye ka ha nwere.

Dịka ọmụmaatụ, Ụka Anglican nke Saụt Afrịka na bishọp nwaanyị mbụ na mba Kenya bụ Emily Onyango, so too nhọpụta Sarah Mullally.

Gafcon boro Ụka Ịngland ebubo iji aka ike achịkọta ụlọụka ahụ ma na-amanye iwu n'isi ndị ọzọ niile. Ndị ga-esonye n'ọgbakọ a ga-eme n'Abuja bụ ndị si Amerịka na Ọstrelịa ebe ụlọụka ahụ nwere mgbọrọgwụ.

N'Ọktoba 2025, Gafcon kpebiri ịhazigharị ụka Anglịkan ma ghara isonye n'ọgbakọ nke Achịbishọpụ Canterbury kpọkọrọ ma kpọọ oku ka ọtụtụ ndị mmadụ kwụsị mmekọ ha na Ụka Ịngland.

Otu ahụ kwuru na ha ahapụbeghị. Ma kwuo na ha kwenyere na nke a bụ ihe e ji mara ụka Anglịkan.

Nhọpụta onyeisi nke a, ga-enweta nkewa zuruoke nke nwereike itisa ụlọụka ahụ "nke bụ ihe na-ezighị ezi ime", dịka Ọkammụta MacCulloch, bụ onye ụka Anglịkan si kwuo.

Ụka Anglịkan dị na mba 162 n'ụwa niile, nke nwere usoro ọchịchị ha dị iche iche mana ntọala ha niile na etu ha si ekpe ụka bụ otu.

"Anyị na-ahụta onwe anyị dịka ndị otu ezinaụlọ ma nwerekwa nwereonwe anyị", Bishọpụ Anthony Poggo, bụ odeakwụkwọ Ụka Anglịkan gwara BBC

Justin Welby (R) na Achịbishọpụ Kenya Eliud Wabukala (L) n'Ọktoba 20, 2013 n'ụlọụka All Saints Cathedral dị na Nairobi

Ebe foto si, AFP via Getty Images

Nkọwa foto, Onye bụbu Achibishọpụ Canterbury gbara mbọ ijikọ ụlọụka ahụ ọnụ.

Ụlọụka Anglịkan niile na-akwado onwe ha site n'enyemaka dị iche iche.

"Ọ bụ uru anyị na-erite na mmekọrịta a", Bishọpụ Poggo kwuru.

O kwuru na ụka ọbụla chọrọ ịhapụ Ụka Anglịkan ga-eme nke a site n'usoro iwu ha si bata.

"Anyị ga-eme nke a site n'usoro anyị, nke gụnyere otu kọmiiti maọbụ ọgbakọ sịnọdụ nke anyị nwere na mpaghara dị iche iche, karịa ime ya n'ụzọ megidere iwu".

Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na otu ndị ghara ime ya ma malite ịkpa agwa dịka ndị hapụrụ ụka Anglịkan?

"Enweghị ihe ọbụla i nwere ike ime maka ya", Bishọpụ kwuru nke a ma gbankwụnye "ọ dị ezi mwute nye anyị niile".

Mmekọ dị n'etiti Anglịkan nke mbụ na nke ndị ọzọ niile abụrụla ihe nwere nsogbu. N'agbanyeghị nke a, e nwere ndị ka nwere mmasị na mmekọ ha na Canterbury.

N'agbanyeghị na ha ekwenyeghị na nkwenye ụfọdụ ụka Ịngland, Pastọ ndị ntoroọbịa na Naịjirịa bụ Alexander Olasinde kwuru na mmekọ ụka Ịnglad dị ya mkpa.

"Anyị niile [dịka ndị Ụka] nwere otu ebumnobi, nke a bụ ịga alaeze Chukwu. Anyị kwesiri ichepụta ma nwee nkwekọrịta iji mezuo nke a," ka nwaamadị ahụ gbara afọ 34 gwara BBC.

"Anyị na-eme ihe etua a, anyị ga-etinye iwe n'ime onwe anyị ma weta esemokwu. Kedụ etu anyị ga-esi gaa alaeze?"